Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Kwesịrị Ime ma M Mechaa Baptizim?​—Nke 1: Nọgide Na-eme Ihe Ndị Ị Na-emebu

Gịnị Ka M Kwesịrị Ime ma M Mechaa Baptizim?​—Nke 1: Nọgide Na-eme Ihe Ndị Ị Na-emebu

 Anyị na-elekọta ihe ndị anyị nwere nke ọma, dị ka ụlọ anyị ma ọ bụ ụgbọala anyị. Otú ahụ ka anyị kwesịkwara ịna-eme ka adịm ná mma anyị na Chineke na-esikwu ike. Olee otú ị ga-esi eme ka gị na Chineke na-adịkwu ná mma ma i mechaa baptizim?

Ihe ndị a ga-eleba anya n’isiokwu a

 Na-amụ Okwu Chineke

 Amaokwu Baịbụl ị ga-eburu n’uche: “Na-eme ihe ọ bụla dị mma ma na-amụtakwu eziokwu gbasara Chineke.”​—Ndị Kọlọsi 1:10.

 Ihe ọ pụtara: I mechaa baptizim, ị ka kwesịrị ịnọgide na-agụ Baịbụl ma na-atụgharị uche n’ihe ndị ị mụtara na ya.​—Abụ Ọma 25:4; 119:97.

 Ihe ị ga-atụ anya ya: Mgbe ụfọdụ, ọ gaghị na-agụ gị agụụ ịgụ Baịbụl. O nweziri ike mee ka i chewe na “ịmụ ihe abụghị maka gị.”

 Ihe i nwere ike ime: Mụkwuo gbasara isiokwu ndị na-amasị gị na Baịbụl. Jiri aka gị hazie otú ị ga-esi na-amụ ihe na mgbe ị ga na-amụ ya. Hazie ya otú ọ na-agaghị na-ebu gị aka. Ihe bụ́ mkpa gị bụ ka ị hụkwuo Jehova n’anya ma jiri Okwu ya kpọrọkwuo ihe. Isi otú a amụ ihe na-aba uru, na-atọkwa ụtọ.​—Abụ Ọma 16:11.

 Ihe ga-enyere gị aka: Ị chọọ ka ihe ị na-amụ baara gị ezigbo uru, gbaa mbọ nọrọ ebe mkpọtụ na-adịghị na ebe ihe ndị ọzọ na-agaghị eme ka uche gị pụọ n’ihe ị na-amụ.

 Ihe ọzọ ga-enyere gị aka

 Na-agwa Jehova okwu n’ekpere

 Amaokwu Baịbụl ị ga-eburu n’uche: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, na-ekpenụ ekpere, na-arịọsikwanụ Chineke arịrịọ ike ma na-ekele ya. Ọ bụ otú unu ga-esi mee ka ọ mara ihe unu na-arịọ.”​—Ndị Filipaị 4:6.

 Ihe ọ pụtara: Anyị na Chineke ikwurịta okwu pụtara na anyị gwa ya okwu, anyị egeekwa ya ntị ka ọ na-agwa anyị okwu. Otú ị ga-esi na-ege ya ntị bụ ịgụ Okwu ya; otú ị ga-esi na-agwa ya okwu abụrụ ikpe ekpere. Cheta na i kpewe ekpere, i nwere ike ịrịọ Chineke ka o nyere gị aka n’ihe ndị bụ́ mkpa gị, i nwekwara ike ikele ya maka ihe ndị o meere gị.

 Ihe ị ga-atụ anya ya: Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị gị ka ekpere gị bụ igbu oge. I nwedịrị ike ichewe ma Jehova ọ̀ na-anụkwa ekpere gị ma ọ bụkwanụ gị echewe ma ọ̀ chọrọ ịnụ olu gị n’eziokwu.​—Abụ Ọma 10:1.

 Ihe i nwere ike ime: Ụbọchị ọ bụla, chee gbasara ihe i nwere ike ikpe n’ekpere. Ọ bụrụ na ị gaghị ekpeli ekpere dị ogologo n’ihi otú ihe si dịrị gị, kpebie oge ọzọ n’ụbọchị ị ga-ekpe ekpere banyere ihe ahụ. E wezụga ikpe ekpere gbasara ihe ndị bụ́ mkpa gị, chee gbasara ndị ọzọ nọ ná mkpa ị ga-etinye n’ekpere.​—Ndị Filipaị 2:4.

 Ihe ga-enyere gị aka: Ọ bụrụ na ọ na-adịzi gị ka ekpere gị bụ igbu oge, gwa Jehova gbasara ya n’ekpere. Ọ chọrọ ịnụ ihe niile na-enye gị nsogbu n’obi, ma ihe ndị na-enye gị nsogbu n’obi gbasara ekpere.​—1 Jọn 5:14.

 Ihe ọzọ ga-enyere gị aka

 Na-agwa ndị ọzọ ihe ndị i kweere

 Amaokwu Baịbụl ị ga-eburu n’uche: “Na-eme ike gị niile ka ị bụrụ onye e ji ama atụ nakwa onye na-akụzi ihe nke ọma. . . . N’ihi na ọ ga-eme ka ị zọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.”​—1 Timoti 4:16.

 Ihe ọ pụtara: Ka ị na-agwa ndị ọzọ ihe ndị i kwere, okwukwe gị ga na-esikwu ike. O nweziri ike ime ka ị zọpụta ndị na-ege gị ntị, zọpụtakwa onwe gị.

 Ihe ị ga-atụ anya ya: Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ọ gaghị na-agụ gị agụụ ịgwa ndị ọzọ ihe ndị i kweere. Ụjọ nwedịrị ike ịna-atụ gị ime ya, karịchaa n’ụlọ akwụkwọ.

 Ihe i nwere ike ime: Kpebisie ike na ị gaghị ekwe ka ihe ndị na-eme ka obi na-ajọ gị njọ, dị ka ụjọ, na-atụrụ gị ihe ị ga-eme. Pọl onyeozi kwuru, sị: ‘Ọ bụrụgodị na m na-ezisa ozi ọma n’agbanyeghị na ọ bụghị ihe m chọrọ ime, m ga-emerịrị ya n’ihi na ọ bụ ọrụ Chineke họpụtara m ka m na-arụ.’​—1 Ndị Kọrịnt 9:16, 17.

 Ihe ga-enyere gị aka: Ọ bụrụ na papa gị na mama gị ekwe, chọta Onye Kraịst ị ga na-eme otú o si eme, ya ana-enyekwara gị aka. Ọ ga-abụ onye e ji ama atụ n’ikwusa ozi ọma.​—Ilu 27:17.

 Ihe ọzọ ga-enyere gị aka

 Na-aga ọmụmụ ihe

 Amaokwu Baịbụl kwadoro ya: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche n’ihi na ọ ga-eme ka anyị na-ahụrịta ibe anyị n’anya ma na-arụ ezigbo ọrụ. Ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị.”​—Ndị Hibru 10:24, 25.

 Ihe ọ pụtara: Ihe kacha mkpa mere anyị ji aga ọmụmụ ihe bụ iji fee Jehova. Ma e nwekwara uru abụọ ọzọ ịga ọmụmụ ihe na-abara anyị. Nke mbụ bụ na ụmụnna ga-agba gị ume n’ọmụmụ ihe. Nke abụọ abụrụ na gịnwa ga-agbakwa ha ume ma ị gaa ọmụmụ ihe, zaa ajụjụ ma ọ bụ mee ihe omume.​—Ndị Rom 1:11, 12.

 Ihe ị ga-atụ anya ya: Ị nọrọ n’ọmụmụ ihe mgbe ụfọdụ, uche gị nwere ike ịpụ n’ihe a na-eme, ya emee ka ị gharazie ịmụta ihe n’ihe ndị a na-akụzi. I nwekwara ike ịkwụsị ịna-agachị ọmụmụ ihe anya ma ọ bụkwanụ ihe ndị ọzọ ewekọrọ oge gị, dị ka ime ihe omume e nyere gị n’ụlọ akwụkwọ, nke na ị gaghịzi na-enwe ohere ịga ọmụmụ ihe.

 Ihe i nwere ike ime: Na-eme ihe omume ndị e nyere gị n’ụlọ akwụkwọ, ma kpebisiekwa ike na ị ga na-agachi ọmụmụ ihe anya, gbaakwa mbọ ka ị mụta ihe na nke ọ bụla. Gbalịa ka ị zaa ajụjụ iji gosi na uche gị dị n’ihe a na-eme. A gbasaa ọmụmụ ihe, kelee ụmụnna. Gbaakwa mbọ jaa, o pekarịa mpe, otu onye mma maka ajụjụ ọ zara ma ọ bụ maka ihe omume o mere.

 Ihe ga-enyere gị aka: Kwadebe ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe tupu gị agaa. Tinye JW Library® n’ekwentị gị ma ọ bụ n’ihe ọzọ yiri ya i nwere. Gazie ebe a kpọrọ “Meetings” ka ị hụ ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe nke ọ bụla.

 Ihe ọzọ ga-enyere gị aka