Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ga-enyere M Aka ma Mụ na Onye Mụ na Ya Na-akpa Kwụsị Ịkpa?

Gịnị Ga-enyere M Aka ma Mụ na Onye Mụ na Ya Na-akpa Kwụsị Ịkpa?

 Otu nwa okorobịa aha ya bụ Steven kwuru, sị: “Mgbe mụ na onye mụ na ya na-akpa kwụsịrị ịkpa, obi gbawara m. O nwebeghị mgbe obi jọrọ m njọ otú ọ jọrọ m mgbe ahụ.”

 Ụdị ihe ahụ ò metụla gị? Ọ bụrụ na o metụla gị, isiokwu a nwere ike inyere gị aka.

 Otú ọ na-adị

 Gị na onye gị na ya na-akpa kwụsị ịkpa, ọ na-ewute ma gị ma onye ahụ.

  •  Ọ bụrụ na ọ bụ gịnwa kwuru ka unu kwụsị ịkpa, mara na o nwere ike ịdị gị otú a ọ dị Jasmine. Ọ sịrị: “Obi m na-ama m ikpe ma m cheta na m mejọrọ onye m hụburu n’anya. Achọghị m ka ụdị ihe a mee m ọzọ.”

  •  Ọ bụrụ na ọ bụghị gị chọrọ ka unu kwụsị ịkpa, ị ga-amata ihe mere ndị mmadụ ji ekwu na ọ na-adị ka ọ̀ bụ mmadụ nwụnahụrụ gị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Janet kwuru, sị: “Ọ kpataara m iru uju, iwe, obi ọjọọ, na ihe ndị ọzọ. Mana, mgbe ọ fọrọ obere ka o ruo otu afọ, m mechara wepụ obi m na ya.”

 Nke bụ́ eziokwu bụ: Gị na onye gị na ya na-akpa kwụsị ịkpa, o nwere ike ime ka ike ụwa gwụ gị. Baịbụl kwuru na: “Mmụọ nke dara mbà na-amịkpọ ọkpụkpụ.”—Ilu 17:22.

 Ihe i nwere ike ime

  •  Kọọrọ otu onye toro eto otú obi dị gị. Baịbụl sịrị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.” (Ilu 17:17) Ịkọrọ nne gị ma ọ bụ nna gị, ma ọ bụkwanụ otu onye toro eto otú obi dị gị ga-eme ka ị mara ihe ị ga-eme.

     Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Janet sịrị: “M nọọrọ onwe m ruo ọtụtụ ọnwa, o nweghịkwa onye m kọọrọ ihe mere m. Ma, ihe nyeere m aka bụ na m mechara kọọrọ ndị enyi m ihe mere m. Ọ bụ mgbe ahụ ka obi bịara dịwa m mma.”

  •  Si n’ihe ahụ mere mụta ihe. Amaokwu Baịbụl ọzọ sịrị: “Nweta amamihe, nweta nghọta.” (Ilu 4:5) Anyị nwere ike isi n’ihe mere anyị matakwuo ụdị onye anyị bụ na ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ihe agaghị otú anyị tụrụ anya ya.

     Steven anyị kwuru maka ya ná malite kwuru, si: “Mgbe mụ na enyi m nwaanyị kwụsịrị ịkpa, otu enyi m jụrụ m sị, ‘N’oge a niile gị na ya kpara, gịnị ka ị mụtara? Olee otú ihe ịmụtara ga-esi nyere gị aka ma gị na onye ọzọ kpawa?’”

  •  Kpee ekpere. Baịbụl kwuru, sị “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị.” (Abụ Ọma 55:22) Ekpere ga-enyere gị aka, meekwa ka ị mata ma è nwere uru mgbasa ahụ unu gbasara baara gị.

     Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Marcia sịrị: “Na-ekpe ekpere mgbe niile. Jehova ma otú obi dị gị na ihe merenu karịadị otú gịnwa ma.”

  •  Na-enyere ndị ọzọ aka. Baịbụl sịrị: “Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.” (Ndị Filipaị 2:4) Ọ bụrụ na ị na-enyere ndị ọzọ aka, ọ ga-eme ka ị mata na e nwere uru mgbasa ahụ unu gbasara baara gị.

     Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Evelyn sịrị: “Gị na onye gị na ya na-akpa kwụsị ịkpa, ọ nwere ike ịdị gị ka ụwa ọ̀ gwụla. Ọ na-akadị afụ ụfụ karịa ebe mmadụ merụrụ ahụ́. Ma achọpụtala m na ọ ga-emecha kwụsị. Naanị oge ka ọ ga-ewe, mana m ga-emecha nweta onwe m.”