Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Olee Otú M Ga-esi Ghara Ịna-eche Ihe Na-adịghị Mma?

Olee Otú M Ga-esi Ghara Ịna-eche Ihe Na-adịghị Mma?

 Olee ụdị onye i chere na ị bụ?

  •   M na-atụ anya na ihe ga-adị mma

     “M na-agba mbọ otú ike kwere m ịna-enwe obi ụtọ ma ghara ịna-ewe iwe. M na-agbalị kwa ụbọchị ka ihu bụrụ m ọchị ọchị, obi ana-atọkwa m ụtọ”​—Valerie.

  •   M na-atụ anya mgbe niile na ihe ọjọọ ga-eme

     “Mgbe ọ bụla ihe ọma mere, m na-agwa onwe m na ihe a agaghị abụ eziokwu nakwa na ọ ga-abụrịrị na agwọ nọ n’akịrịka.”​—Rebecca.

  •   M na-ewere ụwa otú m si hụ ya

     “M tụọ anya na ihe ga-adị mma, obi ga-agbawa m ma ihe ọjọọ mee, m na-atụkwanụ anya mgbe niile na ihe ọjọọ ga-eme, obi ga na-ajọ m njọ mgbe niile. Iwere ụwa otú m si hụ ya na-enyere m aka ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị otú ihe si dị.”​—Anna.

 Gịnị mere o ji dị mkpa?

 Baịbụl sịrị na “onye obi na-adị mma na-enwe obi ụtọ mgbe niile.” (Ilu 15:15) N’eziokwu, ndị na-anaghị eche mgbe niile na ihe ọjọọ ga-eme ma na-eche gbasara ihe ọma ndị na-eme n’ụwa, na-aka ndị ọzọ enwe obi ụtọ. Ha nwekwara ike ịna-emeta ndị enyi karịa ndị ọzọ. O doro anya na e nweghị onye ga-achọ ka ya na onye obi na-ajọ njọ mgbe niile na-anọ.

 Ọ bụrụgodị na mmadụ na-atụ anya na e nweghị ihe ga-eme, nsogbu ụwa a ka nwere ike ịbịara ya. Dị ka ihe atụ:

  •   Akụkọ gbasara agha, ndị ọjọọ obi fere azụ, na ime mpụ nwere ike ịbụ chi bọọ a nụ ọzọ n’akụkọ ụwa.

  •   Nsogbu ezinụlọ nwere ike na-ezo ka mmiri.

  •   O doro anya na gị na ezughị okè na ihe ndị ị na-anaghị emeta na-alụ.

  •   O nwere ike ịbụ na ezigbo enyi gị mere ihe wutere gị.

 Elegharala nsogbu ndị bịaara gị anya, anọkwalanụ na-eche gbasara ha nke na ha ga-emezi ka ike ụwa gwụ gị. Mee ihe ndị ị ga-emeli gbasara ha ma hapụ ndị ị na-agaghị emeli. Ọ ga-eme ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị gbasara ihe ọjọọ ndị nwere ike ime, kama, ị ga-ewere ụwa otú i si hụ ya, nsogbu agaghịkwa eme ka ike ụwa gwụ gị.

Ị ga-edili nsogbu ndị na-abịara gị, obi esiekwa gị ike na ihe dị ọkụ ga-emecha jụọ oyi

 Ihe i nwere ike ime

  •   Na-ele ihe ndị ị na-anaghị emeta anya otú kwesịrị ekwesị.

     Baịbụl kwuru, sị: “E nweghị onye ezi omume nọ n’ụwa nke na-eme naanị ihe dị mma, nke na-anaghịkwa emehie.” (Ekliziastis 7:20) Ihe ndị ị na-anaghị emeta na ihe ndị ị na-emejọ anaghị egosi na o nweghịzi ihe ị dị mma ya, kama ha na-egosi na ị bụ mmadụ.

     Ihe ị ga-emeli gbasara ya: Gbaa mbọ na-emekwu nke ọma n’ihe ndị ị na-anaghị emeta, ma atụkwala anya na ị ga-emetacha ihe niile ka onye zuru okè. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Caleb sịrị: “M na-agba mbọ ka m ghara ịna-echegbu onwe m gbasara ihe ndị m na-anaghị emeta. Kama, m na-esi na ha amụta ihe m ga-agba mbọ mezikwuo.”

  •   Ejila onwe gị atụnyere ndị ọzọ.

     Baịbụl kwuru, sị: “Ka anyị ghara ikwe ka onwe anyị na-ebu anyị isi, ghara ịna-amarịta aka, gharakwa ịna-enwere ibe anyị anyaụfụ.” (Ndị Galeshia 5:26) Obi nwere ike ịna-ajọ gị njọ ma ị gaa n’Ịntanet na-ekiri foto ndị mmadụ sere mgbe ha gara ememme niile a na-akpọghị gị ka ị bịa. O nwere ike ime ka ezigbo ndị enyi gị dịzie ka ndị iro gị.

     Ihe ị ga-emeli gbasara ya: Kweta na ọ bụghị ememme niile ka a ga-akpọcha gị ka ị bịa. Ihe ọzọ bụ na ị gaghị ejili foto ndị e tinyere n’Ịntanet mata ihe niile merenụ. Otu nwa okorobịa aha bụ Alexis kwuru, sị: “Ihe ndị mmadụ na-etinyekarị n’Ịntanet bụ ihe ndị bụ́ anya bịa lere mere ná ndụ ha. Ha anaghị etinye obere ihe niile mere ná ndụ ha.”

  •   Na-eme udo, karịchaa n’ezinụlọ unu.

     Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụkwa unu ka ọ dị n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.” (Ndị Rom 12:18) Ọ bụghị gị ga-agwa ndị ọzọ otú ha ga-esi na-akpa àgwà, ma ọ bụ gị ga-ekwu ihe ị ga-eme. I nwere ike ikpebi na ị ga na-eme udo.

     Ihe ị ga-emeli gbasara ya: Kpebisie ike na ị gaghị eso akpata nsogbu n’ezinụlọ unu, kama na ị ga-enye aka mee ka udo dị na ya otú ahụ ị na-eme ka ọ dị ebe ndị ọzọ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Melinda kwuru, sị: “Anyị niile ga na-emejọ ibe anyị, n’ihi na e nweghị onye zuru okè. Ọ bụzi anyị ka ọ dị n’aka ịma ihe anyị ga-eme ma e mejọọ anyị, ànyị ga-agba mbọ mee ka udo dịrị, ka ànyị ga-eme ihe ọzọ?”

  •   Na-ekele Chineke maka ihe ọ na-emere gị.

     Baịbụl kwuru, sị: “Na-ekelekwanụ Chineke mgbe niile.” (Ndị Kọlọsi 3:15) Ị na-ekele Chineke mgbe niile, ọ ga-eme ka i lekwasị anya n’ihe ọma ndị na-eme ná ndụ gị, ọ bụghị n’obere nsogbu ọ bụla bịaara gị.

     Ihe ị ga-emeli gbasara ya: Chọpụta ihe ndị bụ́ nsogbu gị, ma elegharakwala ihe ọma ndị na-eme ná ndụ gị anya. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Rebecca kwuru, sị: “M nwere akwụkwọ m na-eji edetu otu ihe ọma mere ná ndụ m kwa ụbọchị. M na-eji ya echetara onwe m na n’agbanyeghị nsogbu ndị m nwere, e nwere ọtụtụ ihe dị mma m ga na-echebara echiche.”

  •   Chọpụta ụdị ndị gị na ha na-akpa.

     Baịbụl kwuru, sị: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.” (1 Ndị Kọrịnt 15:33) Ọ bụrụ na ndị gị na ha na-anọ na-ekwukarị ihe na-adịghị mma gbasara ihe ọ bụla merenụ, ị ga-amụta ime ihe a na-adịghị mma ha na-eme.

     Ihe ị ga-emeli gbasara ya: A ga-enwe oge nsogbu nwere ike izu mmadụ na ndị enyi ya ahụ́, o nwekwara ike ime ka obi na-ajọ ha njọ ruo oge ụfọdụ. Gbalịa nyere ha aka otú ike gị hà, ma ekwela ka nsogbu ahụ mee ka ike ụwa gwụ gị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Michelle kwuru, sị: “Ọ bụghị naanị ndị na-anaghị ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị ka anyị na ha nwere ike ịna-akpa. Ị manụ na ọ bụrụ na onye ìsì eduo onye ìsì, ha abụọ ga-adaba n’olulu.”

 Gụọ ihe ga-enyere gị aka ịna-eche ihe dị mma

 Baịbụl kpọrọ oge a anyị bi na ya oge “ga-adị oké egwu, taakwa akpụ.” (2 Timoti 3:1) Ọ̀ na-esiri gị ike ịna-enwe obi ụtọ n’ihi otú nsogbu si ju ebe niile n’ụwa a? Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Na-atagbu Onwe Ha n’Ahụhụ?