Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Papa M na Mama M Chọọ Ịgba Alụkwaghịm?

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Papa M na Mama M Chọọ Ịgba Alụkwaghịm?

Ihe i nwere ike ime

 Gị na papa gị na mama gị kwurịta ya. Gwa ha na obi adịghị gị mma ma ọ bụ na ị maghị ihe ị ga-eme eme. Ha nwere ike ịkọrọ gị ihe na-emenụ. O nwekwara ike ime ka obi ruo gị ala.

 Ọ bụrụ na papa gị na mama gị emeghị ka obi ruo gị ala, i nwere ike ịkọrọ ya ezigbo enyi gị tọrọ gị.—Ilu 17:17.

 Ihe ga-akacha enyere gị aka bụ ịkọsara ya Chineke n’ekpere. Baịbụl sị na Chineke bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Kọọrọ ya otú ọ dị gị n’obi, ‘n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’—1 Pita 5:7.

Ihe ị na-ekwesịghị ime

Ichefu alụkwaghịm papa gị na mama gị gbara yiri ịgbake mgbe aka gbajiri gị. Ọ naghị adị mfe, ma ọ ga-emecha kwụsị iwute gị

 Eburula papa gị na mama gị iwe n’obi. E nwere otu nwa okorobịa aha ya bụ Daniel. Papa ya na mama ya kewara mgbe ọ dị afọ asaa. Daniel sịrị, “Ihe gbasara anyị emetụghị papa anyị na mama anyị n’obi. Ha echetadịghị ahụhụ anyị ga-ata ma ha gbasaa.”

 Olee nsogbu Daniel nwere ike inwe ma ọ bụrụ na ọ kwụsịghị iwe a ọ na-ewere papa ya na mama ya?—Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Ilu 29:22.

 Gịnị mere o ji dị mma ka Daniel gbaghara papa ya na mama ya ihe ọjọọ ha mere ya?—Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Ndị Efesọs 4:31, 32.

 Akpala àgwà ga-akpatara gị nsogbu. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Denny kwuru, sị, “Mgbe papa m na mama m gbara alụkwaghịm, obi bidoro jọwa m njọ. Anaghịzi m eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Adakwara m n’ule n’afọ ahụ. Ka afọ ahụ gachara, ... ihe m na-arụzi na klas bụ ime ihe ọchị, mụ na ọtụtụ mmadụ lụkwara ọgụ.”

 Olee ihe i chere mere Denny jizi na-eme ihe ọchị na klas? Oleekwa ihe i chere mere ya na ọtụtụ ndị ji na-alụ ọgụ?

 Olee otú ihe e kwuru na Ndị Galeshia 6:7 nwere ike isi nyere ndị dị ka Denny aka ka ha ghara ịkpa àgwà ga-akpatara ha nsogbu?

 E mee mmadụ ihe, obi agbawaa ya, ọ na-ewe oge tupu ya enweta onwe ya. Ma, ọ bụrụ na ị gbalịa na-akpa àgwà otú ị na-akpabu, ị ga-eji nwayọọ nwayọọ nwetawa onwe gị.