Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Kọlọsi 1:1-29
1 Mụnwa bụ́ Pọl, onye ọ bụ uche Chineke ka m bụrụ onyeozi Kraịst Jizọs, na Timoti+ nwanna anyị,
2 na-edetara ọgbakọ dị na Kọlọsi akwụkwọ ozi a. Unu bụ ndị nsọ na ụmụnna a tụkwasịrị obi, ndị ha na Kraịst dị n’otu.
Ka Chineke Nna anyị meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.
3 Mgbe ọ bụla anyị na-ekpe ekpere maka unu, anyị na-ekele Chineke bụ́ Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.
4 Ihe mere anyị ji ekele ya bụ na anyị nụrụ na unu kweere na Kraịst Jizọs, hụkwa ndị nsọ niile n’anya,
5 n’ihi na unu nwere olileanya inweta ihe e doweere unu n’eluigwe.+ Unu matara banyere olileanya a mgbe e ziri unu ozi ọma bụ́ eziokwu.
6 Ozi ọma a unu nụrụ na-amị mkpụrụ, na-agbasakwa n’ụwa niile,+ otú ahụ ọ na-amị mkpụrụ n’ime unu malite n’ụbọchị unu nụrụ nke bụ́ eziokwu gbasara amara Chineke, matakwa ya nke ọma.
7 Onye kụziiri unu eziokwu a bụ Epafras,+ ohu ibe anyị anyị hụrụ n’anya, onye ozi Kraịst a tụkwasịrị obi, onye na-anọchitekwa anya anyị.
8 Ọ gwakwara anyị na mmụọ nsọ na-enyere unu aka ịna-ahụ ndị ọzọ n’anya.
9 Ọ bụ ya mere na malite n’ụbọchị anyị nụrụ ya, anyị akwụsịbeghị ikpe ekpere maka unu,+ na-arịọ ka unu mara uche Chineke nke ọma,+ nweekwa amamihe, nakwa ka mmụọ nsọ na-eme ka unu na-aghọta ihe.+
10 Anyị na-arịọkwa ka unu na-eme ihe otú ndị na-efe Jehova* kwesịrị ịna-eme iji na-eme ya obi ụtọ, ka unu na-eme ihe ọ bụla dị mma ma na-amụtakwu eziokwu gbasara Chineke.+
11 Ihe ọzọ anyị na-arịọ bụ ka Chineke jiri ike ya dị ebube mee ka unu dị ike,+ ka unu wee na-atachi obi n’ihe niile, jirikwa ọṅụ na-edi ihe niile.
12 Ekpere anyị bụkwa ka unu na-ekele Nna anyị, onye mere ka unu ruo eruo inweta ihe o kwere ndị nsọ nọ n’ìhè ná nkwa.+
13 Ọ kpọpụtara anyị n’ọchịchịrị*+ ma kpọga anyị n’alaeze Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya,
14 onye e si n’aka ya jiri ihe mgbapụta gbapụta anyị, nke pụtara na a gbagharala anyị mmehie anyị.+
15 Onye a yiri Chineke, onye a na-enweghị ike ịhụ anya.+ Ọ bụkwa onye e bu ụzọ kee n’ime ihe niile e kere eke.+
16 N’ihi na e si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile dị ma n’eluigwe ma n’ụwa, ihe ndị e nwere ike ịhụ anya na ihe ndị a na-enweghị ike ịhụ anya,+ ma ọ̀ bụ ocheeze ma ọ bụ ndị isi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ikike. E si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile,+ e kekwara ha maka ya.
17 O bu ihe ndị ọzọ niile ụzọ malite ịdị.+ E sikwa n’aka ya mee ka ihe ndị ọzọ niile dịrị.
18 Ọ bụkwa onyeisi nke ahụ́ ya, ya bụ, ọgbakọ ya.+ Ọ bụ ya ka e ji malite ihe niile. Ọ bụ onye mbụ e si n’ọnwụ kpọlite.+ N’ihi ya, ọ bụ onye mbụ n’ihe niile.
19 N’ihi na Chineke chọrọ ka Kraịst zuo ezuo n’ihe niile.+
20 O sikwa n’aka Kraịst mee ka ya na ihe ndị ọzọ niile dị ná mma,+ ma ihe ndị dị n’ụwa ma ihe ndị dị n’eluigwe. Ọ bụkwa ọbara+ Kraịst wụsịrị n’osisi ịta ahụhụ* ka Chineke ji mee ka ya na ihe ndị ọzọ niile dịrị n’udo.
21 N’eziokwu, e nwere oge unu bụ ndị iro Chineke, oge a na-enweghị ihe jikọrọ unu na ya n’ihi na uche unu dị naanị n’ihe ọjọọ.
22 Ma ugbu a, o ji maka ọnwụ onye ahụ ji anụ ahụ́ ya chụọ àjà mee ka unu na ya dị ná mma, ka unu wee dịrị nsọ n’anya ya, bụrụkwa ndị na-enweghị ntụpọ na ndị a na-anaghị ebo ebubo n’ihu ya.+
23 Ma, unu ekwesịghị ịkwụsị inwe okwukwe na Chineke,+ kama, kwụsienụ ike na ntọala+ okwukwe unu, guzosiekwanụ ike,+ ka a ghara ime ka unu kwụsị inwe olileanya nke ozi ọma unu nụrụ mere ka unu nwee, nke e kwusakwara ebe niile n’ụwa.*+ Mụnwa bụ́ Pọl ghọkwara onyeozi maka izisa ozi ọma a.+
24 Ana m aṅụrị ọṅụ ugbu a n’agbanyeghị na m na-ata ahụhụ maka unu.+ Echere m na m ga na-ata ya na-aga ebe m so n’ahụ́ Kraịst. Ahụhụ a m na-ata bụkwa maka ọdịmma nke ahụ́ Kraịst,+ ya bụ, ọgbakọ ya.+
25 M na-ejere ndị Chineke ozi n’ihi na ọ họpụtara m maka ozi a.+ Ọ bụkwa maka ọdịmma unu. Ọ bụ ya mere m ji na-eji ike m niile ekwusa okwu Chineke.
26 Ozi a m na-ezisa bụ ihe nzuzo dị nsọ+ e zoro kemgbe ụwa,*+ e meghịkwa ka ọgbọ ndị gara aga mara gbasara ya. Ma ugbu a, e meela ka ndị nsọ mara ya.+
27 Ọ masịrị Chineke ime ka ndị mba ọzọ bụ́ ndị nsọ mara ihe nzuzo a dị nsọ,+ nke bụ́ akụ̀ dị ebube. Unu nwere olileanya ịdị ebube ka Kraịst+ n’ihi na unu na ya dị n’otu.
28 Anyị na-ekwusa gbasara Kraịst, na-adụ mmadụ niile ọdụ, jirikwa amamihe niile na-akụziri mmadụ niile ihe, ka anyị wee mee ka mmadụ niile, ndị ha na Kraịst dị n’otu, bụrụ ndị tozuru okè n’anya Chineke.+
29 Ọ bụ ya mere m ji na-arụsi ọrụ ike, jiri ike Chineke nyere m+ na-agbasi mbọ ike.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Grik, “Ọ napụtara anyị n’ikike nke ọchịchịrị.”
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Grik, “nke e kwusakwaara ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.”
^ Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”