Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Ndị I Nwere Ike Isi Gụọ Baịbụl

Ụzọ Ndị I Nwere Ike Isi Gụọ Baịbụl

Baịbụl nwere ndụmọdụ kacha mma ga-abara anyị uru ná ndụ. Ọ bụrụ na ị na-agụ ya, na-echebara ihe ndị ị na-agụ na ya echiche mgbe niile ma na-eme ha eme, ‘ụzọ gị ga-aga nke ọma.’ (Jọshụa 1:8; Abụ Ọma 1:​1-3) Ị ga-amatakwa Chineke na Ọkpara ya, Jizọs, ịmata ha nwerekwa ike ime ka a zọpụta gị.—Jọn 17:3.

Olee otú i kwesịrị isi bido gụwa Baịbụl? E nwere ọtụtụ ụzọ i nwere ike isi bido ịgụ ya. Usoro ọgụgụ Baịbụl a ga-enyere gị aka ịgụ Baịbụl niile si n’isi ruo ná ngwụcha ma ọ bụkwanụ gị agụọ ya n’isiokwu n’isiokwu. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgụ ebe ụfọdụ na Baịbụl ka ọ kọọrọ gị otú Chineke na ndị Izrel oge ochie si mekọọ ihe. I nwekwara ike ịgụ ebe ndị ọzọ ka ị mụta otú ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ si malite ma mụbaa. Ọ bụrụ na ị na-agụ isi akwụkwọ Baịbụl ole e dere maka ụbọchị nke ọ bụla, ị ga-agụcha Baịbụl niile n’ime otu afọ.

Ma ị̀ chọrọ ihe ga-enyere gị aka ka i nwee ike ị na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, ma ọ bụ na ị chọrọ ịgụcha Baịbụl niile n’otu afọ, ma ọ bụkwanụ na ị bụ onye ka na-amalite ịgụ Baịbụl amalite, usoro ọgụgụ Baịbụl a ga-enyere gị aka. Danloduo ụdị nke a e nwere ike ibipụta ebipụta ma bido taa gụwa ya.