Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Gbasara Ịṅụ Sịga Nkịtị na nke Ọgbara Ọhụrụ?

Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Gbasara Ịṅụ Sịga Nkịtị na nke Ọgbara Ọhụrụ?

 “N’ebe m bi, o siri ike ịhụ onye na-erubeghị afọ iri abụọ na atọ na-aṅụtụbeghị sịga nkịtị ma ọ bụ nke ọgbara ọhụrụ.”​—Julia.

Ihe ndị a ga-ekwu n’isiokwu a

 Ihe i kwesịrị ịma

  •   Sịga nwere ike igbu gị. Ihe bụ́ isi na-adị na sịga nwere ike igbu mmadụ, na-emekwa ka ịṅụ ihe ọ bụla ọ dị na ya rie mmadụ ahụ́. A na-akpọ ya nikotin. Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Igbochi na Ịkwụsị Ọrịa n’Amerịka kwuru na “sịga bụ ihe kacha eme ka ndị na-agaraghị arịa ọrịa rịawa ọrịa nakwa ihe kacha egbu ndị mmadụ mgbe ha na-ekwesịbeghị ịnwụ.”

     “Ihe m na-arụ n’ụlọ ọgwụ bụ ile ndị mmadụ ahụ́, e nweekwala ndị m lere ahụ́ chọpụta na sịga akpaala ha aka ọjọọ. O riri m ọnụ mgbe m hụrụ ihe sụchichara akwara ndị na-aṅụbu sịga. Emekataghị m ṅụọ sịga n’ihi na ejighị m ahụ́ m egwu egwu.”​—Theresa.

     Ị̀ ma ihe a? E nwere puku kemikal asaa dị na sịga, ọtụtụ n’ime ha nwekwara ike igbu mmadụ. N’afọ ọ bụla, imirikitiimi ndị mmadụ na-anwụ n’ihi ọrịa sịga kpataara ha.

  •   Mmadụ nwere ike isi n’ịṅụ sịga ọgbara ọhụrụ ṅụta kemikal ndị nwere ike igbu ya. Ndị ọkachamara na-ekwu na ihe mere ọtụtụ ndị ji nwee nsogbu n’akpa ume ha ma ọ bụdị nwụọ bụ n’ihi ịṅụ sịga ọgbara ọhụrụ ma ọ bụ iji ihe na-amị ya. Nikotin dịkwa n’ọtụtụ sịga ọgbara ọhụrụ otú ahụ ọ dị na sịga nkịtị. Otu akwụkwọ e dere ihe ndị bụ́ eziokwu gbasara ịṅụ sịga ọgbara ọhụrụ kwuru na nikotin “nwere ike ime ka ịṅụ ọgwụ ike rie ọtụtụ ndị na-eto eto ahụ́” n’ihi otú o si eri mmadụ ahụ́.”

     “E nwere ụdị sịga ọgbara ọhụrụ ndị na-amasị ụmụaka na ndị na-eto eto n’ihi na ha na-atọ ụtọ ka swiit na ihe ndị ọzọ na-atọ bịrịbịrị. Ha na-elekwasị anya n’ụtọ ha, chefuo na ha nwere ike ịkpatara mmadụ nsogbu.”​—Miranda

     Ị̀ ma ihe a? Ukuru ọkụ a na-ekupụ ma a ṅụwa sịga ọgbara ọhụrụ abụghị mmiri nkịtị, kama, ihe ndị nwere ike ịkpatara mmadụ nsogbu dị na ha. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ bụ kemikal ndị jọgburu onwe ha. Ọ bụkwa n’akpa ume mmadụ ka ha niile na-aga.

 Nsogbu ndị ịṅụ sịga nkịtị na nke ọgbara ọhụrụ nwere ike ịkpata

  1.  (1) O nwere ike ime ka ụbụrụ ghara ịkpakọcha mmadụ ọnụ, mee ka uche mmadụ ghara ịna-adị n’ihe, onye ahụ ana-enwekwa nsogbu ịmata otú obi dị ya, karịchaa ma ọ bụrụ na ụbụrụ onye ahụ akachabeghị

  2.  (2) O nwere ike ime ka agbụ̀ ezé mmadụ zaa azaa, onye ahụ emerụchaakwa ahụ́ n’ezé

  3.  (3) O nwere ike ime ka akpa ume mmadụ zaa, onye ahụ enweekwa nsogbu obi

     O nwere ike ime ka ụkwara ume ọkụ (asthma) mmadụ na-arịa ka njọ

     O nwere ike ime ka afọ na-enye mmadụ nsogbu, agbọ ana-enu ya

 Ihe i nwere ike ime

  •   Chọpụta ihe bụ́ eziokwu. Ekwetala ihe ọ bụla ị nụrụ, dị ka na e nweghị ihe ịṅụ sịga ọgbara ọhụrụ ga-eme gị ma ọ bụkwanụ na ọ bụ naanị ihe mmadụ ji atụ ndụ mmanụ. Mee nchọnchọ nke gị ma jirizie ihe ndị bụ́ eziokwu ị chọpụtara kpebie ihe ị ga-eme.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Onye na-amaghị ihe na-ekweta ihe niile e kwuru, ma onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.”​—Ilu 14:15.

     “Ị chọpụta ihe ndị ịṅụ sịga nkịtị na sịga ọgbara ọhụrụ nwere ike ịkpatara gị, ị ga-aghọta na ha abụghị naanị ihe e ji atụ ndụ mmanụ otú ahụ ndị a ma ama na ndị na-eto eto ibe gị na-ekwu na ha bụ.”​—Evan.

     Ihe ị ga-echebara echiche: Ndị na-eto eto na-aṅụ sịga nkịtị ma ọ bụ nke ọgbara ọhụrụ hà na-enwe obi ụtọ karịa ndị ọzọ? Hà na-adị njikere karịa ndị ọzọ ịma ihe ha ga-eme ma nsogbu bịa, ma nsogbu ahụ ọ̀ bịara taa ma ọ̀ ga-abịa echi? Ka ọ̀ bụ nkụ ahụhụ ka ha na-akpa?

  •    Chọpụta otú ga-abara gị uru ị ga-esi gbaara nchegbu ọsọ. Otu ụzọ magburu onwe ya isi belata nchegbu bụ ịna-eme ihe ndị ga-adị gị mma n’ahụ́, dị ka imega ahụ́, ịgụ akwụkwọ, ma ọ bụ gị na ndị enyi gị ga na-agba gị ume ịna-anọrị. Ime ihe ndị a ga-eme ka i nwee ọtụtụ ihe uche gị ga-adị na ha, ya emezie ka uche gị ghara ịdị n’ịṅụ sịga.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Nchegbu na-eme ka ike gwụ mmadụ, ma okwu ọma na-eme ka obi dị ya ụtọ.”​—Ilu 12:25.

     “Ụfọdụ ndị na-eche na ịṅụ sịga nkịtị ma ọ bụ nke ọgbara ọhụrụ na-eme ka mmadụ ghara ịna-echegbu onwe ya. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ha ga-emeli ka mmadụ ghara ichegbu onwe ya, ọ bụ naanị ruo obere oge. Ma, nsogbu ha na-akpatara mmadụ na-adịte aka. E nwere ihe ndị ọzọ ka mma mmadụ nwere ike ime ka ọ ghara ịna-echegbu onwe ya.”​—Angela.

     Ihe ị ga-echebara echiche: Olee ihe ndị ọzọ ka mma i nwere ike ime ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị? Ị chọọ ịmata ihe ndị ọzọ i nwere ike ime, gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-Ajụ, Sị, ‘Gịnị Ka M Ga-eme Ka M Kwụsị Ịna-echegbu Onwe M?’”

Mmadụ ịna-aṅụ sịga ma ọ bụ na-eme ihe ọzọ na-eri mmadụ ahụ́ ka o nwee ike ghara ịna-echegbu onwe ya ga-eme ka nsogbu ya ka njọ, ọ dị ka mmadụ ịwụba n’oké osimiri ka mmiri ghara ịma ya.

  •    Gbaa mbọ mara ihe ị ga-eme ma a nwaa gị ka ị ṅụọ sịga. Ụmụ akwụkwọ ibe gị nwere ike ịna-anwa gị ka ị ṅụọ sịga nkịtị ma ọ bụ nke ọgbara ọhụrụ ma ọ bụkwanụ ya abụrụ ihe ndị i ji atụrụ ndụ na-eme ka ịṅụ ha na-agụ gị agụụ. Fim, ihe ndị a na-eme na tiivi, na ebe ndị a na-akparịta ụka n’Ịntanet na-emecha ka ndị mmadụ na-eche na e nweghị ihe ịṅụ ihe ndị a mere nakwa na ha bụ ihe e ji atụ ndụ mmanụ.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Ndị tozuru etozu . . . na-echebara ihe echiche nke ọma. Ha na-esi otú a azụ onwe ha ka ha mata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ.”​—Ndị Hibru 5:14.

     “Mgbe m na-aga akwụkwọ, ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ ibe m na-akwanyere m ùgwù maka na anaghị m aṅụ sịga nkịtị ma ọ bụ nke ọgbara ọhụrụ. Ozugbo m gwara ha na agaghị m aṅụ ya, ha na-agwazi ndị ọzọ na anaghị m aṅụ ya. N’ihi ya, n’agbanyeghị na o nwere ike ịdị ka ị bụ onye nzuzu ma ị gwa ha na ị naghị aṅụ ihe ndị ahụ, ọ ga-enyere gị aka ka ị ghara ịṅụ ha.”​—Anna.

     Ihe ị ga-echebara echiche: A nwaa gị ka i mee ihe ọjọọ, ị̀ na-emerikarị ọnwụnwa ahụ? Ì nwere ike icheta oge ndị i meriri ụdị ọnwụnwa ọ bụla? Ị chọọ ihe ga-enyere gị aka n’okwu a, gụọ isiokwu bụ́ “Ihe M Ga-eme ma Ndị Ọgbọ M Nyewe M Nsogbu.” Ọ dị n’isi nke 15 n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ​—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2.

  •   Lezie anya họrọ ndị ga-abụ enyi gị. Ọ bụrụ na ndị enyi gị na-ele ịṅụ sịga nkịtị na nke ọgbara ọhụrụ anya otú gịnwa si ele ya, ọ ga-eme ka a ghara inwe onye na-anwa gị ka ị ṅụọ ha ma ọ bụkwanụ mee ka ha belata.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Onye ya na ndị ma ihe na-akpa ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.”​—Ilu 13:20.

     “Imete ndị na-ejide onwe ha na ndị na-akwụsi ike n’ihe dị mma enyi na-aba ezigbo uru. Ị hụ uru àgwà ọma ha na-abara ha, ị ga na-agbakwu mbọ ka ị na-akpa àgwà ka ha.”​—Calvin.

     Ihe ị ga-echebara echiche: Ndị enyi gị hà na-akwado gị ná mbọ ị na-agba ịna-ebi ndụ otú dị mma na otú ga-eme ka ahụ́ na-agbasi gị ike, ka hà na-eme ka o siere gị ike ime ihe ndị ị chọrọ ime?

 Oleekwanụ maka ịṅụ ìgbó?

 Ọtụtụ ndị na-ekwu na e nweghị nsogbu ìgbó nwere ike ịkpatara mmadụ. Ma, ọ bụghị eziokwu.

  •   Ịṅụ ìgbó nwere ike iri ndị na-eto eto na-aṅụ ya ahụ́. Ndị ọkachamara achọpụtala na ịṅụ ìgbó nwere ike ịla ụbụrụ mmadụ n’iyi, mee ka ụbụrụ ghara ịna-aghọ mmadụ nkọ.

  •   Otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka ndị isi na-akpakọchaghị ọnụ n’Amerịka kwuru na “a chọpụtala na ndị na-aṅụ ìgbó na ndị mmadụ na-enwekarị nsogbu, ha anaghị eme nke ọma n’agụmakwụkwọ, ha anaghị eme nke ọma n’ihe ha na-arụ, ha anaghịkwa enwecha obi ụtọ ná ndụ.”

     “E nwere mgbe ọ dị m ka ọ̀ bụ m ṅụọ ìgbó maka na m nọ na-achọ otú m ga-esi kwụsị ịna-echegbu onwe m. Ma, mgbe m chetara na o nwere ike iri m ahụ́, cheta ego m ga na-emefu na ya, nakwa nsogbu o nwere ike ịkpatara ahụ́ m, m ghọtara na naanị ihe ịṅụ ìgbó ga-eme bụ́ ime ka m na-echegbu onwe m karịa.”​—Judah.