Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Olee Otú M Ga-esi Ghara Ịna-echekarị Gbasara Mmekọahụ?

Olee Otú M Ga-esi Ghara Ịna-echekarị Gbasara Mmekọahụ?

 “Mgbe ụfọdụ, ihe gbasara mmekọahụ na-agbata m n’uche mgbe m na-atụghị anya ya, mụ echewe gbasara ya, chefuo ihe ọ bụla ọzọ. Ọ na-adị m nnọọ ka e tinyere ụbụrụ onye ọzọ n’isi m.”​—Vera.

 “Ọ na-adị m ka agaghị m akwụsịli ịna-eche gbasara mmekọahụ. Ọ na-adị m ka ihe na-agaghị ekwe omume otú ahụ ife ka nnụnụ bụ ihe na-agaghị ekwe omume.”​—John.

 Ọ̀ na-adị gị otú ahụ ọ dị Vera na John? Ọ bụrụ otú ahụ, isiokwu a nwere ike inyere gị aka.

 Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị kwụsị ịna-eche gbasara mmekọahụ?

 Otu nwa okorobịa aha ya bụ Alex kwuru, sị: “Deede m gwara m na Chineke agaraghị eke m ka mmekọahụ na-agụ m agụụ ma a sị na ọ chọghị ka m nwee mmekọahụ mgbe ọ bụla ọ gụrụ m.

 E nwere otu ihe bụ́ eziokwu n’ihe ahụ deede Alex gwara ya. Ihe ahụ bụ na Chineke kere anyị otú mmekọahụ ga na-agụ anyị. Ma, e nwere ezigbo ihe mere o ji kee anyị otú ahụ. Ị manụ na ihe mere ụmụ mmadụ ji dịrị taa bụ maka na Chineke kere anyị ịna-enwe mmekọahụ. Gịnịzi mere o ji dị mkpa ka anyị kwụsị ịna-eche gbasara mmekọahụ? Ka anyị kwuo abụọ n’ime ihe mere o ji dị mkpa:

  •   Baịbụl mere ka o doo anya na Chineke chọrọ ka ọ bụrụ naanị nwoke na nwaanyị bụ́ di na nwunye ga na-enwe mmekọahụ.​—Jenesis 1:28; 2:24.

     Ọ bụrụ na ị chọrọ ime ihe a Chineke chọrọ, ma ị lụbeghị di ma ọ bụ nwunye, ọ pụtara na ị ga-akpatara onwe gị nsogbu ma ị na-echekarị gbasara mmekọahụ. O nwedịrị ike ime ka i chefuo onwe gị gaa nwee ya. Ma, ọtụtụ ndị mere otú ahụ mechara kwaa mmakwaara.

  •   Ị na-agba mbọ ka ị kwụsị ịna-eche gbasara mmekọahụ, ọ ga-eme ka ị mụta ịna-ejide onwe gị. Ịmụta àgwà a ga-abakwaranụ gị ezigbo uru n’ihe ndị ọzọ ị na-eme ná ndụ.​—1 Ndị Kọrịnt 9:25.

 Ị na-ejide onwe gị, ị ga na-enwekwu obi ụtọ ná ndụ, ma ugbu a ma n’ọdịnihu. Ndị na-eme nchọpụta kwudịrị na ọ bụrụ na ụmụaka ndị na-ejide onwe ha etoo, o nwere ike ime ka ha ghara ịna-arịakarị ọrịa, ịna-echegbu onwe ha gbasara ego, ma ọ bụ ịna-ada iwu obodo. a

 Gịnị mere o ji esi ezigbo ike ịkwụsị iche gbasara mmekọahụ?

 Ihe ndị na-eme ka mmekọahụ na-agụ anyị agụụ anyị bu pụta ụwa na otú mmekọahụ si agba ndị mmadụ ara n’ụwa taa nwere ike ime ka o siere anyị ike ịkwụsị iche gbasara mmekọahụ.

 “Ọ dị nnọọ ka ihe niile a na-egosi na tiivi na-ekwu na e nweghị ihe o mere mmadụ inwe mmekọahụ tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye. A naghị ekwu ihe ọ bụla gbasara nsogbu o nwere ike ịkpata. Otú a e si eme ka ọ dị ka e nweghị nsogbu ọ bụla mmadụ inwe mmekọahụ tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye na-akpata nwere ike ime ka mmadụ na-echekarị gbasara ya.”​—Ruth.

 “M na-anụ ọtụtụ njakịrị gbasara mmekọahụ n’ebe m na-arụ ọrụ. Ihe a na-emekwa ka m chọwa ịmatakwu gbasara ihe ndị m nụrụ. A na-eme ka inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye yie ihe dị mma, ya esizie ike mmadụ ile ya anya ka ihe ọjoọ.”​—Nicole.

 “Ị na-ele foto ndị mmadụ tinyere n’Ịntanet, i nwere ike ilewe ihe anya otú ha si ele ya. Naanị ihe ụbụrụ gị nwere ike ịna-echeta bụ otu foto gbasara mmekọahụ ị hụrụ ebe ahụ. Ichefu ya anaghị adị mfe”​—Maria.

 Ihe ndị a anyị kwurula gbasara ha nwere ike ime ka ọ dị gị otú ọ dị Pọl onyeozi, nke mere o ji kwuo, sị: “Mgbe m chọrọ ime ihe dị mma, ihe ọjọọ na-abata m n’obi.”​—Ndị Rom 7:21.

Ekwela ka iche ihe na-adịghị mma rụọ akwụ́ n’isi gị

 Ihe i nwere ike ime

 Gbaa mbọ chewe ihe ọzọ. Gbalịa hapụ ihe gbasara mmekọahụ, chewe ihe ndị ọzọ. I nwere ike chewe gbasara otu ihe ị na-enwe mmasị ime, egwuregwu, mmega ahụ́, ma ọ bụkwanụ ihe ọ bụla ọzọ na-amasị gị ga-eme ka uche gị pụọ ná mmekọahụ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Valerie kwuru, sị: “Ịgụ Baịbụl na-enyere m aka. Ọ bụ ihe ndị gbasara Chineke dị na ya. Ị na-eche gbasara Chineke, ọ ga-esi ike gị echewe gbasara ihe ọ bụla ọzọ.”

 N’eziokwu, ihe gbasara mmekọahụ nwere ike ịgbata gị n’uche. Ma ọ bụ gị ga-ekwu ihe ị ga-eme gbasara ihe gbatara gị n’uche. Ị chọọ, ị ga-ahapụli ihe gbatara gị n’uche, chewe ihe ọzọ.

 “Ihe gbasara mmekọahụ gbata m n’uche, m na-agba mbọ kwụsị iche gbasara ya ma chewe ihe ọzọ. M na-agbalịkwa ka m mata ihe mere ihe gbasara mmekọahụ ji gbata m n’uche, ọ̀ bụ ụdị egwú m na-ekwesịghị ịna-ege ka ọ̀ bụ foto m lere m na-ekwesịghị ile.”​—Helena.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Ihe ọ bụla ziri ezi, ihe ọ bụla dị ọcha, . . . na-echebaranụ ihe ndị a echiche.”​—Ndị Filipaị 4:8.

 Mete ndị ezigbo mmadụ enyi. Ọ bụrụ na ndị enyi gị na-ekwukarị gbasara mmekọahụ, ọ ga-esiri gị ike ịghara ịna-eche gbasara ya.

 “Mgbe m nọ n’afọ iri na ụma, ọ na-esiri m ike ịghara iche ihe na-adịghị mma, ụdị ndị mụ na ha na-akpa mekwara ka o siere m ezigbo ike. Ọ bụrụ na ndị gị na ha na-anọkarị enweghị ihe ha ji omume rụrụ arụ kpọrọ, ị gaghịzi na-agba mbọ ka ị ghara iche ihe na-adịghị mma. Ihe a na-emekwa ka iche ihe dị mma sikwuo ike.”​—Sarah.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Onye ya na ndị ma ihe na-akpa ga-ama ihe,ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.”​—Ilu 13:20.

 Ejila ihe ndị na-adịghị mma atụrụ ndụ. Anyị niile ma na ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ihe niile e ji atụrụ ndụ taa na-eme ka mmekọahụ yie ihe dị mma. Otu onye aha ya bụ Nicole kwuru, sị: “Ihe kacha akpa m aka ọjọọ bụ egwú. O nwere ike ime ka ihe na-agụ m agụụ ka njọ nke na agaghị m ejidelizi onwe m.”

 “M malitere ile fim na ihe omume tiivi ndị na-egosi ihe gbasara mmekọahụ. Tupu mụ amara ihe na-emenụ, ihe m na-echezi mgbe niile bụ mmekọahụ. O sirighị m ike ịmata ihe mere m ji na-echekarị gbasara mmekọahụ. Ozugbo m kwụsịrị ile fim na ihe omume tiivi ndị ahụ, m kwụsịrị ịna-echekarị gbasara mmekọahụ. Ọ na-adịkwuru m mfe ịkwụsị iche ihe rụrụ arụ ma m lezie anya họrọ ihe ndị m ji atụrụ ndụ.”​—Joanne.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Unu ekwesịghịdị ịna-ekwurịta gbasara ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha niile ma ọ bụ anyaukwu.”​—Ndị Efesọs 5:3.

 Nke bụ́ eziokwu: Ụfọdụ ndị chere na agụụ mmekọahụ na-agụ ha dị ezigbo mkpa nke na ha ekwesịghị ijide onwe ha ma ọ gụwa ha nakwa na ha agaghịdị ejideli onwe ha. Ma ihe a ha chere abụghị ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl kwuru na anyị ga-ejili onwe anyị ma na-eche ihe dị mma. Ihe a o kwuru gosiri na Chineke ejighị ihe anyị na-eme egwu egwu.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Unu kwesịkwara ịna-eme ka otú unu si eche echiche dị ọhụrụ.”​—Ndị Efesọs 4:23.

a Ndị lụrụla di ma ọ bụ nwunye kwesịkwara ịna-ejide onwe ha. Ọ dị mkpa ka ị mụta ịna-ejide onwe gị ugbu a ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye n’ihi na i mechaa lụọ di ma ọ bụ nwunye, ị ka kwesịrị ịna-ejide onwe gị.