Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Filipaị 4:1-23

  • Inwe otu obi, ịṅụrị ọṅụ, ihe ndị e kwesịrị ichebara echiche (1-9)

    • Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla (6, 7)

  • Obi dị Pọl ụtọ na ndị Filipaị nyere ya onyinye (10-20)

  • Ekele mmechi (21-23)

4  N’ihi ya, ụmụnna m m hụrụ n’anya, agụụ ịhụ unu na-agụsi m ike, unu bụkwa ọṅụ m na okpueze m.+ Unu ndị m hụrụ n’anya, kwụsienụ ike+ otú a ka unu wee na-eme ka unu na Onyenwe anyị dị n’otu.  M na-agba Yuodia na Sintiki ume ka ha nwee otu obi n’ozi ha na-ejere Onyenwe anyị.+  Ana m arịọkwa gị, ezigbo onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ,* ka ị na-enyere ụmụ nwaanyị ndị a aka. N’eziokwu, mụ na ha na Klement nakwa ndị ọzọ gbakọrọ mbọ ọnụ n’izisa ozi ọma. Aha ha niile dị n’akwụkwọ nke ndụ.+  Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile n’ihi Onyenwe anyị. Ana m asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ.+  Meenụ ka mmadụ niile mara na unu na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.+ Onyenwe anyị nọ nso.  Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla,+ kama n’ihe niile, na-ekpenụ ekpere, na-arịọsikwanụ Chineke arịrịọ ike ma na-ekele ya. Ọ bụ otú unu ga-esi mee ka ọ mara ihe unu na-arịọ.+  Udo+ Chineke na-enye, nke karịrị nghọta mmadụ, ga-esi n’aka Kraịst Jizọs chee obi unu+ na echiche* unu nche.  N’ikpeazụ, ụmụnna m, ihe ọ bụla bụ́ eziokwu, ihe ọ bụla dị ezigbo mkpa,* ihe ọ bụla ziri ezi, ihe ọ bụla dị ọcha, ihe ọ bụla na-eme ka mmadụ hụ ibe ya n’anya, ihe ọ bụla a na-ekwu okwu ọma banyere ya, ihe ọ bụla bụ́ omume ọma, na ihe ọ bụla kwesịrị otuto, na-echebaranụ ihe ndị a echiche.+  Na-emenụ ihe ndị unu mụtara n’aka m na ihe ndị unu nabatara nakwa ihe ndị unu nụrụ m kwuru na ihe ndị unu hụrụ m na-eme,+ Chineke nke udo ga-anọnyekwara unu. 10  Ana m aṅụrị ọṅụ nke ukwuu n’ihi Onyenwe anyị, na unu amalitekwala iche banyere m ugbu a.+ Ọ bụ eziokwu na unu na-echebu banyere m, ma unu ahụghị otú unu ga-esi gosi ya. 11  Anaghị m ekwu ihe a maka na mkpa na-akpa m, n’ihi na amụtala m otú ihe m nwere ga-esi na-eju m afọ* n’agbanyeghị otú ihe si dịrị m.+ 12  Ama m otú e si ebi ndụ mgbe ihe na-adịchaghị,+ marakwa otú e si ebi ndụ mgbe ihe juru eju. N’ihe niile nakwa otú ọ bụla ihe si dị, amụtala m otú ihe m nwere ga-esi na-eju m afọ, ma mgbe m na-eriju afọ ma mgbe m nọ agụụ, ma mgbe m nwejuru ihe enweju ma mgbe m na-enweghị ihe ọ bụla. 13  N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.+ 14  Ma, unu mere nke ọma nyere m aka ná mkpagbu a na-akpagbu m. 15  N’eziokwu, unu ndị Filipaị makwa na mgbe mbụ unu nụrụ ozi ọma, mgbe m hapụkwara Masedonia gawa ebe ọzọ, e nweghị ọgbakọ ọ bụla nyeere m aka ma ọ bụ kwe ka m nyere ha aka, ma e wepụ naanị unu.+ 16  N’ihi na, mgbe m nọ na Tesalonaịka, unu ziteere m ihe, ọ bụghị naanị otu ugboro kama ugboro abụọ, ka m jiri gboo mkpa m. 17  Ọ bụghị na m na-achọ ka e nye m onyinye, kama m na-achọ ka unu na-arụ ọrụ ọma ndị ga-abakwuru unu uru. 18  Ma, enwere m ihe niile zuuru m, nweekwa karịa. E nweghịzi ihe kọrọ m ugbu a m natarala Epafrọdaịtọs+ ihe unu zitere, nke dị ka ihe na-esi ísì ọma,+ bụ́ àjà Chineke na-anabata, nke dị ya mma. 19  N’ihi ya, Chineke m, onye nwejuru akụ̀ enweju, ga-esi n’aka Kraịst Jizọs nyezuo unu ihe niile na-akpa unu.+ 20  Ka otuto dịrị Chineke anyị, bụ́ Nna anyị, ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 21  Keleerenụ m onye nsọ ọ bụla ya na Kraịst Jizọs dị n’otu. Ụmụnna ndị mụ na ha nọ na-ekele unu. 22  Ndị nsọ niile, ma karịchaa, ndị ezinụlọ Siza,+ na-ekele unu. 23  Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara n’ihi àgwà ọma unu na-akpa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “onye mụ na ya na-anya yok.”
Ma ọ bụ “uche; ike iche echiche.”
Ma ọ bụ “ihe ọ bụla e kwesịrị iji kpọrọ ihe.”
Ma ọ bụ “na-ezuru m.”