Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Mmadụ Ịna-agba Mbọ Ka A Mara Ya Amara n’Ịntanet Ọ̀ Bara Uru?

Mmadụ Ịna-agba Mbọ Ka A Mara Ya Amara n’Ịntanet Ọ̀ Bara Uru?

 Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Elaine sịrị: “Mgbe m hụrụ na ụmụ akwụkwọ ibe m nwere ọtụtụ ndị na-achọ ịhụ ihe ndị ha tinyere n’Ịntanet, m chere, sị, ‘Ha aghọọla ndị a ma ama.’ Eziokwu eziokwu, ọ dị m ka m bụrụ ha.”

 Ọ̀ dịtụla mgbe i chere ụdị ihe a Elaine chere? Ọ bụrụ na i chetụla ya, isiokwu a ga-enyere gị aka ka ị ghara ịba ná nsogbu ebe ị na-agba mbọ ka ị bụrụ onye a ma ama n’Ịntanet.

 Olee nsogbu dị na mmadụ ịbụ onye a ma ama n’Ịntanet?

 Baịbụl kwuru n’Ilu 22:1, sị: “Ọ ka mma inwe ezigbo aha kama inweju akụnụba.” Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na e nweghị ihe dị njọ na mmadụ ịchọ ka o nwee aha ọma ma ọ bụ ịchọ ka ndị ọzọ hụ ya n’anya.

 Ma, mgbe ụfọdụ, mmadụ na-anọ ebe ọ na-achọ ka ihe ya dị ndị ọzọ mma chọwazie ka ọ bụrụ onye a ma ama. Ò nwere nsogbu ụdị ihe a na-akpata? Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Onya kwuru na o nwere. Ọ sịrị:

 “Ahụla m ka ndị mmadụ na-eme ihe mmadụ na-enweghị ike iche n’echiche naanị ka ha bụrụ ndị a ma ama. Ahụtụla m onye si n’okpukpu ụlọ elu abụọ wụtuo.”

 Ụfọdụ na-ewere vidio ihe ndị na-enweghị isi ha mere tinye n’Ịntanet naanị ka ndị enyi ha hụ na ha sokwa biri. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-eto eto na-etinye ebe ha na-ata ncha n’Ịntanet. Ị manụ na onye isi kpakọrọ ọnụ ekwesịghị ime ụdị ihe a.

 Baịbụl kwuru, sị: “Ụnụ emela ihe ọ bụla n’ụzọ ịchọ . . . otito efu.”—Ndị Filipaị 2:3, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

 Ihe ị ga-echebara echiche:

  •   È nwere uru ịma gị ama n’Ịntanet ga-abara gị?

  •   Ọ̀ bara uru ime ihe ga-akpatara gị ọrịa ma ọ bụ ọnwụ ka ndị enyi gị mara na i sokwa biri?

 Mmadụ ime ka ndị ọzọ na-eche na ya bụ onye a ma ama

 Ọ bụghị mgbe niile ka ndị mmadụ na-eme ihe ndị nwere ike ịkpatara ha nsogbu iji bụrụ ndị a ma ama. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na abụọ aha ya bụ Erica kwuru ihe ọzọ ọtụtụ ndị na-eme. Ọ sịrị:

 “Ndị mmadụ na-aga n’Ịntanet tinye ọtụtụ foto gbasara ihe ha na ndị ọzọ mere. Ihe a na-eme ka o yie ka ha nwere ọtụtụ ndị enyi ha na ha na-anọrị mgbe niile. Ọ na-emezi ka ndị ọzọ na-eche na ha bụ ndị a ma ama.”

 Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na ise aha ya bụ Cara kwuru na ụfọdụ ndị na-aghọgbu ndị mmadụ ha echee na ha bụ ndị a ma ama. Ọ sịrị:

 “Ahụla m ka ndị mmadụ na-etinye foto ha nọ n’ụlọ ha see n’Ịntanet mee ya ka o yie ka ha sere ya mgbe ha gara oriri na nkwari.”

 Otu nwa okorobịa dị afọ iri abụọ na abụọ aha ya bụ Matthew kwuru na ya emetụla ụdị ihe ahụ. Ọ sịrị:

 “E nwere mgbe m tinyere foto n’Ịntanet ma kwuo na ọ bụ n’Ugwu Evarest ka m nọ see ya. Ma n’eziokwu, agatụbedịghị m Eshia bụ́ ebe ugwu ahụ dị.”

 Baịbụl kwuru, sị: “Anyị chọkwara ịna-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile.”—Ndị Hibru 13:18.

 Ihe ị ga-echebara echiche:

  •   Ọ bụrụ na ị na-aga n’Ịntanet, ị̀ na-aghọgbu ndị mmadụ iji mee ka a mara gị ama?

  •    Foto ndị ị na-etinye na ihe ndị ị na-ekwu n’Ịntanet hà na-egosi onye ị bụ n’eziokwu, gosikwa na ị bụghị o kwu ọzọ eme ọzọ?

 Ọ̀ bara uru mmadụ inwe ndị na-achọ ịhụ ihe ndị o tinyere n’Ịntanet ma ọ bụ ndị ihe o tinyere na-amasị?

 Ọtụtụ ndị chere na ihe na-eme ka a mara mmadụ ama bụ inwe ọtụtụ ndị na-achọ ịhụ ihe ndị o tinyere n’Ịntanet ma ọ bụ ọtụtụ ndị ihe o tinyere na-amasị. Matthew anyị kwuburu okwu ya sịrị na e nwere mgbe ya na-eche otú ahụ. Ọ sịrị:

 “M na-adị ajụ ndị mmadụ, sị: ‘Mmadụ ole ka i nwere na-achọ ịhụ ihe ndị i tinyere n’Ịntanet?’ ma ọ bụ ‘Mmadụ ole ka ihe i tinyere n’Ịntanet masịrị mgbe ị kacha nwee ndị ihe i tinyere masịrị?’ Ihe m na-eme ka m nwee ọtụtụ ndị na-achọ ịhụ ihe m tinyere n’Ịntanet bụ ile ihe ndị m na-amaghị ndị ha bụ na-etinye n’Ịntanet. M na-ebu n’obi na onye ọ bụla m lere ihe o tinyere, ga-elekwa ihe ndị m na-etinye. Ịbụ onye a ma ama nọ na-agụ m agụụ, ihe ndị m na-ahụ n’Ịntanet mekwara ka ọ na-agụsi m ike.”

Mmadụ ịbụ onye a ma ama n’Ịntanet dị ka ebe mmadụ na-ata ihe e ji emegharị ọnụ. O nwere ike ijidetụ ya afọ obere oge, ma ọ gaghị eju ya afọ.

 Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na ise aha ya bụ Maria kwuru na ihe ụfọdụ ndị ji ama otú ha hà bụ mmadụ ole na-achọ ịhụ ihe ndị ha tinyere n’Ịntanet ma ọ bụ mmadụ ole ihe ha tinyere masịrị. Ọ sịrị:

 “Ọ bụrụ na foto nwa agbọghọ sere tinye n’Ịntanet amasịghị ọtụtụ ndị, o nwere ike ichewe na ya jọrọ njọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị ihe ọ pụtara, ma ọtụtụ ndị ga-echekwa otú ahụ ma ọ bụrụ hanwa ka ụdị ihe ahụ mere. Ndị na-eche ụdị ihe a na-ata ndụ ha ahụhụ.”

 Baịbụl kwuru, sị: “Ka anyị ghara ikwe ka onwe anyị na-ebu anyị isi, ghara ịna-amarịta aka, gharakwa ịna-enwere ibe anyị anyaụfụ.”—Ndị Galeshia 5:26.

 Ihe ị ga-echebara echiche:

  •   Ọ bụrụ na ị na-aga n’Ịntanet, ọ̀ dị gị ka ọ na-eme ka i jiri onwe gị na-atụnyere ndị ọzọ?

  •    Mkpa gị ọ̀ bụ inwe ọtụtụ ndị na-achọ ịhụ ihe ndị i tinyere n’Ịntanet ka ọ̀ bụ imete ndị enyị hụrụ gị n’anya?