Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-aga Ọmụmụ Ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?

Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-aga Ọmụmụ Ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?

 Ndịàmà Jehova na-aga ọmụmụ ihe ugboro abụọ n’izu ọ bụla n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ka ha fee Chineke. Gịnị ka a na-eme ebe ahụ? Oleekwa uru ị ga-erite ma ị gaa ọmụmụ ihe ha?

 Gịnị ka a na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?

 Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ebe a na-anọ amụ okwu Chineke. Ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova ga-enyere gị aka:

  •   ịmara eziokwu banyere Chineke.

  •   ịghọta ihe ihe ndị na-eme n’ụwa ugbu a pụtara.

  •   ịbụ ezigbo mmadụ.

  •    inweta ezigbo ndị enyi.

 Ị̀ ma ihe mere Ndịàmà Jehova ji akpọ ebe ha na-anọ efe Chineke Ụlọ Nzukọ Alaeze? Ọ bụ n’ihi na ihe ha na-anọkarị ebe ahụ eme bụ ihe gbasara Alaeze Chineke.​—Matiu 6:​9, 10; 24:14; Luk 4:43.

 Gịnị mere i ji kwesị ịna-aga ọmụmụ ihe?

 Ihe ha na-amụ ebe ahụ ga-enyere gị aka. Ihe ndị e ji Baịbụl amụ n’ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova ga-enyere gị aka ‘inweta amamihe.’ (Ilu 4:5) Ọ pụtara na Baịbụl ga-enyere gị aka ịna-eme mkpebi ndị dị mma. Ọ ga-enyekwara gị aka ịmata azịza ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa. Ụfọdụ n’ime ha bụ:

 Lee isiokwu ụfọdụ si na Baịbụl a na-ekwu n’ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova ná ngwụcha izu ọ bụla:

  •   N’Ihi Gịnị Ka O Ji Dị Mkpa Ka Baịbụl Na-eduzi Gị?

  •   Olee Ebe Ị Ga-esi Nweta Enyemaka n’Oge Ị Nọ n’Ahụhụ?

  •   Ihe Alaeze Chineke Na-emere Anyị Ugbu A.

 “O nwere mgbe otu nwa klas anyị bịara ọmụmụ ihe anyị, ya na ndị ezinụlọ anyị anọrọ otu ebe, anyị sapeta akwụkwọ anyị, ya esoro anyị na-ele anya na ya. Mgbe e mechara, ọ gwara m na otú ụmụnna si zaa ajụjụ n’ọmụmụ ihe ahụ masịrị ya. Ọ gwakwara m na ha enweghị akwụkwọ e ji amụ Baịbụl na chọọchị ha otú anyị nwere.”​—Brenda.

 Ị̀ ma na a naghị akwụ ụgwọ oche n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, a naghịkwa ana ụtụ ọ bụla?

 Ịga ọmụmụ ihe ga-agba gị ume. Baịbụl kwuru na otu n’ime ihe mere Ndị Kraịst ji ezukọ bụ ‘ịna-agbarịta ibe ha ume.’ (Ndị Hibru 10:​24, 25) Anyị na ndị hụrụ Chineke na ndị ọzọ n’anya karịa onwe ha ịna-akpakọrịta ga-eme ka obi na-eru anyị ala n’ụwa a ọtụtụ ndị na-achọ ihe ga-adị naanị ha mma.

 “Ọ na-abụ m lọta n’ụbọchị, iwe nwere ike ịna-ewe m, ike agwụruokwa m n’ọkpụkpụ. Ma m gaa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ndị bịaranụ na-eme ka obi dị m mma. M lawa ma a gbasaa, obi na-adị m ụtọ, mụ adịkwa njikere maka ihe nwere ike ime n’ụbọchị na-esonụ.”​—Elisa.

 Ị̀ ma na Ndịàmà Jehova nwere ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ na puku iri abụọ (120,000) n’ụwa niile, ha na-anọkwa n’ebe dị iche iche karịrị puku iri isii (60,000) amụ ihe? Kwa afọ, Ndịàmà Jehova na-arụ ihe dị ka otu puku na narị Ụlọ Nzukọ Alaeze ise (1,500) n’ihi otú ha si amụba. a

a Ị chọọ ịmata ebe e nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze, gaa ebe e dere “Ọmụmụ Ihe Ndịàmà Jehova” ma pịa ebe e dere “Chọta nke Dị Gị Nso.”