Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Mere M Kwesịrị Iji Na-ekpe Ekpere?

Gịnị Mere M Kwesịrị Iji Na-ekpe Ekpere?

 Otu nchọpụta e mere n’Amerịka gosiri na mmadụ asatọ n’ime ndị na-eto eto iri ọ bụla nọ n’obodo ahụ na-ekpe ekpere. Mana, ọ bụ naanị mmadụ anọ n’ime ha na-ekpe ya kwa ụbọchị. O doro anya na ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ò nwere uru ọzọ ikpe ekpere bara ka ọ̀ bụ naanị ihe mmadụ na-eme ka o wee nweta onwe ya?’

  • Gịnị bụ ekpere?

  • Chineke ọ̀ na-anụ ekpere?

  • Gịnị ka m nwere ike ikpe n’ekpere?

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Gịnị bụ ekpere?

 Ekpere bụ ụzọ mmadụ si agwa Onye kere ihe niile okwu. Chegodị ihe ọ pụtara. Jehova ka ụmụ mmadụ n’ihe niile. Ma, “ọ nọ onye ọ bụla n’ime anyị nso.” (Ọrụ Ndịozi 17:27) Baịbụl gwadịrị anyị, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”​—Jems 4:8.

 Olee otú i nwere ike isi bịaruo Chineke nso?

  •   Otu bụ Ekpere. Ọ bụ otú anyị si agwa Chineke okwu.

  •   Nke ọzọ bụ ịmụ Baịbụl. Chineke na-esi na Baịbụl agwa anyị okwu.

 Ọ bụrụ na anyị ana-agwa Chineke okwu n’ekpere, na-amụkwa Baịbụl iji nụ ihe ndị ọ na-agwa anyị, ọ ga-eme ka anyị na ya bụrụ ezigbo enyi.

 “Otu n’ime ihe ọma kachanụ meere anyị bụ na anyị nwere ike ịgwa Jehova, onye Kacha Elu, okwu.”​—Jeremy.

 “Ịkọrọ Jehova obi m n’ekpere na-eme ka mụ na ya dịkwuo ná mma.”​—Miranda.

Chineke ọ̀ na-anụ ekpere?

 O nwere ike isiri mmadụ ike ikwere na Chineke na-anụ ekpere n’eziokwu ọ bụrụgodị na onye ahụ kweere na Chineke, na-ekpekwa ekpere. Ma, Baịbụl kwuru na Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Ọ gwara gị ka ị ‘na-akọrọ ya ihe niile na-echegbu gị.’ N’ihi gịnị? Ọ bụ ‘n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’​—1 Pita 5:7.

 Ihe ị ga-echebara echiche: Ị̀ na-ewepụta oge kọọrọ ndị ezigbo enyi gị otú obi dị gị mgbe niile? Ọ bụrụ na ị na-eme ya, sikwa otú ahụ na-ewepụta oge na-akọrọ Chineke otú obi dị gị. Na-ekpe ekpere mgbe niile. I kpewe ekpere, na-akpọ ya aha ya bụ́ Jehova. (Abụ Ọma 86:​5-7; 88:9) Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl kwuru ka ị ‘na-ekpe ekpere mgbe niile.’​—1 Ndị Tesalonaịka 5:17.

 “M na-ekpe ekpere. Ọ bụ otú m si agwa Nna m nke eluigwe okwu. M na-agwa ya ihe niile dị m n’obi.”​—Moises.

 “M na-agwa Jehova obi m otú ahụ m ga-esi agwa mama m ma ọ bụ ezigbo enyi m.”​—Karen.

Gịnị ka m nwere ike ikpe n’ekpere?

 Baịbụl kwuru, sị: “N’ihe niile, na-ekpenụ ekpere, na-arịọsikwanụ Chineke arịrịọ ike ma na-ekele ya. Ọ bụ otú unu ga-esi mee ka ọ mara ihe unu na-arịọ.”​—Ndị Filipaị 4:6.

 Ọ̀ pụtara na i nwere ike ịkọrọ Jehova nsogbu gị? Eenụ. Baịbụl kwudịrị, sị: “Bunye Jehova ibu na-anyịgbu gị. Ọ ga-enyere gị aka.”​—Abụ Ọma 55:22.

 E wezụga nsogbu gị, i kwesịkwara ịkọrọ Jehova ihe ndị ọzọ ma i kpewe ekpere. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Chantelle sịrị: “Ọ bụrụ na ihe m na-eme bụ naanị ịrịọ Jehova ka o nyere m aka, gị amara na mụ abụghị ezigbo enyi ya. Ekwesịrị m ibu ụzọ kelee ya. E nwekwara ọtụtụ ihe ọ na-emere m, m ga-eji maka ha na-ekele ya.”

 Ihe ị ga-echebara echiche: Olee ihe ndị merela ná ndụ gị i kwesịrị ikele Chineke maka ha? Ì nwere ike iche banyere ihe atọ ị ga-eji maka ha kelee Jehova taa?

 “Ihe ndị na-abụghị oké ihe, dị ka ọmarịcha okooko osisi masịrị anyị, nwere ike ime ka anyị kpee ekpere kelee Jehova.”​—Anita.

 “Ị hụ otu ihe Chineke kere nke masịrị gị ma ọ bụ otu amaokwu Baịbụl ruru gị n’obi, chebara ya echiche ma kelee Jehova maka ya.”​—Brian.