Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ ma M Jiri Ekwentị Zigara Mmadụ Ozi?

Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ ma M Jiri Ekwentị Zigara Mmadụ Ozi?
  • :-) I nwere ike izigara ndị enyi gị na ndị ọzọ ozi iji mara otú ha mere.

  • :-( Ma, ọ bụrụ na ị kpacharaghị anya, ozi i zigaara mmadụ nwere ike ime ka gị na ya see. O nwekwara ike ime ka i nwee aha ọjọọ.

 Onye i kwesịrị izigara ozi

 Ọtụtụ ndị na-eto eto anaghị eji izigara mmadụ ozi egwu egwu. Ọ bụ ụzọ ha na ndị enyi ha na-esi ekwurịta okwu ma ọ bụrụ na papa ha na mama ha akwado ya.

 Ezenwaanyị kwuru, sị: “Papa m anaghị ekwe ka mụ na nwanne m nwaanyị na ụmụ okorobịa na-ekwu okwu n’ekwentị. Anyị chọọ ka anyị na ha kwuo okwu, anyị na-eji fon nkịtị. Anyị na-anọkwa n’ebe ndị ọzọ ga na-anụ ihe anyị na ha na-ekwu.

 Ihe i kwesịrị ịma: Ọ bụrụ na ị na-enye onye ọ bụla ị hụrụ nọmba ekwentị gị, o nwere ike itinye gị ná nsogbu.

 Ikenna kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị na-enye onye ọ bụla ị hụrụ nọmba ekwentị gị, i nwere ike ịna-enweta ozi na foto ndị na-adịghị mma.”

 Izundu kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị na-ezigara onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị ozi mgbe niile, ọ gaghị ara ahụ́ onye ahụ erie gị obi.”

 Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.” (Ilu 22:3) Ọ ga-ara ahụ́ gị abaa ná nsogbu ma ọ bụrụ na ị naghị ezigakarịrị onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị ozi n’ekwentị.

 Ihe mere eme: Ojiugo kwuru, sị: “O nwere otu nwa okorobịa mụ na ya dị ná mma. Ọ na-ezitekarịrị m ozi, mụ ana-ezigakwara ya. N’obi m, ọ bụ naanị enyi ka anyị bụ. Ma, amaghị m na o bu ihe ọzọ n’obi. Ọ bụ mgbe ọ gwara m na ya hụrụ m n’anya ka anya mepere m. Asị na m maara, mụ na ya agaraghị na-akpa, agakwaraghị m na-ezigara ya ozi mgbe niile.”

 Ihe ị ga-echebara echiche: Gịnị ka i chere Ojiugo kwesịrị ime ugbu a nwatakịrị nwoke ahụ gwara ya ihe o bu n’obi?

 Tupu ihe ahụ emee, Olee ihe Ojiugo gaara eme ka nwa okorobịa ahụ ghara ichewe ihe ọzọ n’obi?

 Ụdị ozi i nwere ike izigara mmadụ

 Izigara mmadụ ozi anaghị ara ahụ́. Obi na-adịkwa mmadụ mma ma e zitere ya ozi. Ma, onye anyị zigaara ozi nwere ike ịghọtahie ihe anyị dere.

 Ihe i kwesịrị ịma: Ndị mmadụ nwere ike ịghọtahie ozi i zigaara ha n’ekwentị.

 Uchechi kwuru, sị: “Ị gaghị ejili ozi mmadụ ziteere gị mara otú obi ya dị, ọ bụrụgodị na o ziteere gị ihe e sere ese. O nwere ike isere gị na ya okwu.”

 Ulooma sịrị: “Ahụla m ụmụ agbọghọ a sị na ha na-achụ ụmụ nwoke naanị maka ihe ha zigaara ụmụ okorobịa.”

 Baịbụl kwuru, sị: “Onye ezi omume na-atụgharị uche iji zaa okwu.” (Ilu 15:​28) Ihe amaokwu Baịbụl a na-ekwu bụ na i kwesịrị ịgụgharị ihe i dere tupu gị ezigawara ya mmadụ.

 Mgbe i kwesịrị izigara mmadụ ozi

 Ọ bụ gị kwesịrị iji aka gị ekpebi mgbe ị ga-ezigara mmadụ ozi na mgbe ị na-agaghị ezigara ya.

 Ihe i kwesịrị ịma: Ọ bụrụ na ị na-ezigara ndị mmadụ ozi mgbe ọ bụla dị gị mma, o nwere ike ime ka ha chewe na àgwà gị adịghị mma. O nwekwara ike ime ka ndị enyi gị na-agbara gị ọsọ.

 Adanta kwuru, sị: “Ọ naghị ara ahụ́ mụ echefuo na ọ bụghị mgbe niile ka m kwesịrị izigara ndị mmadụ ozi. Ọ na-abụ mụ na mmadụ na-ekwu okwu ma ọ bụkwanụ na-eri nri, mụ ana-ezigara mmadụ ozi.”

 Akuudo kwuru, sị: “Mmadụ ekwesịghị ịna-ezigara onye ọzọ ozi mgbe ọ na-anya ụgbọala. Ọ bụrụ na i wepụtụ anya chọọ ide ihe, i nwere ike inwe ihe mberede okporo ụzọ.”

 Baịbụl kwuru, sị: “E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla, . . . oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.” (Ekliziastis 3:1, 7) Ihe a Baịbụl kwuru gbasakwara izigara mmadụ ozi.

 Ihe ndị ị ga-eme

Onye i kwesịrị izigara ozi

  •  ;-)Na-eme ihe papa gị na mama gị gwara gị mee.​—Ndị Kọlọsi 3:20.

  •  ;-)Ọ bụghị onye ọ bụla ị hụrụ gị enye ya nọmba ekwentị gị. Ọ bụrụ na gị amụta otú ị ga-esi na-ewetu obi ala gwa mmadụ na ị gaghị enye ya nọmba ekwentị gị, ọ ga-abara gị uru ma ị ghọọ dimkpa.

  •  ;-)Ezigarala mmadụ ozi ga-eme ka o chewe na ị na-achụ ya. Ọ bụrụ na onye ahụ erie gị obi, ọ ga-eme ka obi gbawaa gị.

 Uchechi kwukwara, sị: “Papa m na mama m ma na m na-akpachara anya mgbe m na-ezigara mmadụ ozi. Ha ma na agaghị m ana ndị àgwà ha na-adịghị mma nọmba ekwentị ha.”

Ụdị ozi i nwere ike izigara mmadụ

  •  ;-)Tupu gị edewe ozi ị chọrọ izigara mmadụ, jụọ onwe gị ma ọ̀ bụ izigara onye ahụ ozi ga-aka mma. O nwere ike ịka mma ka ị kpọọ onye ahụ n’ekwentị ma ọ bụkwanụ gaa hụ ya ihu na ihu.

  •  ;-)Ezigarala mmadụ ihe ị ma na ị gaghị agwa ya ma unu nọrọ ihu na ihu. O nwere otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na atọ. Aha ya bụ Ugomma. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ị gaghị agwali mmadụ ihe ị chọrọ izigara ya, ezigarala ya ihe ahụ.”

 Emeka kwuru, sị: “Agbachịla nkịtị ma mmadụ zitere gị foto na-adịghị mma. Gwa ya papa gị na mama gị. Ọ ga-eme ka ị ghara ịba ná nsogbu, meekwa ka ha tụkwasị gị obi.”

Mgbe i kwesịrị izigara mmadụ ozi

  •  ;-)Kpebie mgbe ị ga na-eji ekwentị gị na mgbe ị na-agaghị eji ya. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Nneka kwuru, sị: “Anaghị m eji ekwentị m mgbe m na-eri nri ma ọ bụ mgbe m na-amụ ihe. M na-agbanyụkwa ya ma m gaa ọmụmụ ihe. Ihe mere m ji agbanyụ ya bụ ka m ghara ịpịgharịwa ya ma mmadụ zitere m ozi.”

  •  ;-)Na-echebara ndị ọzọ echiche. (Ndị Filipaị 2:4) Ọ bụghị gị na mmadụ na-ekwu okwu, gị ana-ezigara onye ọzọ ozi.

 Adaugo kwuru, sị: “Ekpebiri m na m gaghị na-ezigara mmadụ ozi ma mụ na ndị enyi m nọrọ, ọ gwụkwala ma ihe m chọrọ ịgwa ya ọ̀ dị oké mkpa. Anaghịkwa m enye ndị m na-amachaghị nọmba ekwentị m.”