Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

M̀ Kwesịrị Ime Baptizim?​—Nke 3: Gịnị Na-egbochi M Ime Baptizim?

M̀ Kwesịrị Ime Baptizim?​—Nke 3: Gịnị Na-egbochi M Ime Baptizim?

 Ụjọ ọ̀ na-atụ gị mgbe ọ bụla i chetara na ị ga-enyefe Jehova onwe gị, meekwa baptizim? Ọ bụrụ otú ahụ, isiokwu a ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-eme ka ụjọ kwụsị ịtụ gị.

Ihe ndị a ga-ekwu n’isiokwu a

 Ọ̀ bụrụkwanụ na mụ emee mmehie dị oké njọ ma m mechaa baptizim?

 Ihe mere i ji eche otú ahụ: O nwere ike ịbụ na e nwere onye ị ma mere mmehie dị oké njọ, a chụọkwa ya n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrịnt 5:​11-13) I nwere ike ịna-echegbu onwe gị na ụdị ihe ahụ nwekwara ike ime gị.

 “Oge mbụ m chere echiche ime baptizim, ụjọ tụrụ m na m nwere ike imecha mee ihe ọjọọ. M chekwara otú ọ ga-esi ewute ndị mụrụ m.”​—Rebekah.

 Amaokwu Baịbụl ị ga-eburu n’uche: “Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ọjọọ ọ na-eso . . . Ya lọghachikwute Jehova, onye ga-emere ya ebere. Ya lọghachikwute Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya kpamkpam.”​—Aịzaya 55:7.

 Chee banyere ihe a: Ọ bụ eziokwu na mmadụ mee mmehie dị óke njọ ma jụ ichegharị, a na-achụpụ ya n’ọgbakọ, ma Jehova na-emere ndị dị umeala n’obi chegharịrịnụ ma nabata aka ná ntị a dọrọ ha ebere.​—Abụ Ọma 103:13, 14; 2 Ndị Kọrịnt 7:11.

 Ma, nke bụ eziokwu bụ na n’agbanyeghị na i zughị okè, Chineke nyere gị aka, i nwere ike imeri ọnwụnwa. (1 Ndị Kọrịnt 10:13) A sị ka e kwuwe, ònye na-ekpebiri gị ihe ị ga-eme? Ọ̀ bụ gị? Ka ọ̀ bụ onye ọzọ?

 “M nọ na-atụ ụjọ na m nwere ike ime mmehie dị oké njọ ma m mechaa baptizim. Ma, m mechara ghọta na ọ ga-abụrụ m mmehie ma m hapụ ime baptizim. M ghọtakwara na ekwesịghị m ikwe ka ihe ndị nwere ike ime n’ọdịnihu gbochie m ime baptizim ugbu a”​—Karen

 Ihe bụ́ isi bụ: Ọ bụrụ na ị chọrọ izere mmehie dị oké njọ, ị ga-ezereli ya, otú ahụ ọtụtụ ndị na-efe Jehova na-eme.​—Ndị Filipaị 2:12.

 Ihe ọzọ ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu bụ́ “How Can I Resist Temptation?

 Ọ̀ bụrụkwanụ na m na-atụ ụjọ ma m̀ ga-emelikwa ihe ndị ha na ime baptizim so?

 Ihe mere i ji eche otú ahụ: Dị ka ihe atụ, o nwere ike bụrụ na ị ma ndị na-eto eto ụfọdụ hapụrụ ndị enyị ha na ndị ezinụlọ ha kwaga ebe dị anya ka ha nwee ike ijekwuru Jehova ozi. Ị na-echegbu onwe gị na a ga na-ele gị anya ka i mee otú ahụ.

 “Onye Kraịst ọ bụla e mere baptizim ruru eru ijekwuru Jehova ozi. Ma, ụfọdụ ndị achọghị iwepụta onwe ha ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọnọdụ ha agaghị ekwe ha mee otú ahụ.”​—Marie.

 Amaokwu Baịbụl ị ga-eburu n’uche: “Ka onye ọ bụla na-eleru ihe ọ na-eme anya, ka o wee na-enwe ọṅụ maka ihe ọ na-eme ma ghara ịna-eji onwe ya atụnyere onye ọzọ.”​—Ndị Galeshia 6:4.

 Chee banyere ihe a: Kama iji onwe gị atụnyere ndị ọzọ, chebakwuoro ihe a dị na Mak 12:30 echiche: “Jiri obi gị niile  . . hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.”

 Cheta na ọ bụ obi gị niile ka ị ga-eji jeere Jehova ozi, ọ bụghị obi onye ọzọ. I jiri obi gị niile hụ Jehova n’anya, ị ga-achọta otú dị iche iche ị ga-esi na-ejere ya ozi otú kacha mma i nwere ike ime.

 “Ọ bụ eziokwu na ime baptizim abụghị obere okwu, ma ọ naghị eme ka ihe siere mmadụ ike. Ọ bụrụ na i mete ezigbo ndị enyi, ha ga na-enyere gị aka. Ị ga na-enwekwu obi ụtọ ma i jiri nwayọọ nwayọọ na-eme ihe ụfọdụ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ị na-agbara ime baptizim ọsọ, ọ bụ onwe gị ka ị na-eme.”​—Julia.

 Ihe bụ́ isi bụ: Gbalịa ka i jiri ịhụnanya Jehova gosiri gị kpọrọ ihe. Ọ bụ ya ga-eme ka inye ya ihe kacha mma.​—1 Jọn 4:19.

 Ihe ọzọ ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu bụ́ “How Responsible Am I?

 Ọ̀ bụrụkwanụ na ọ dị m ka m rughị eru ife Jehova?

 Ihe mere i ji eche otú ahụ: Jehova bụ Ọkaakaa eluigwe na ụwa. E jiri ya tụnyere mmadụ, e nweghị ihe ha bụ. I nwere ike ịna-eche ma Jehova ọ̀ ma na e nwere onye dị ka gị.

 “Ebe ọ bụ na ndị mụrụ m bụ Ndịàmà Jehova, m nọ na-eche na ọ bụ ndị mụrụ m ka ha na Jehova dị ná mma, ọ bụghị mụnwa nakwa na ọ bụghị mụnwa ka Jehova dọtara.”​—Natalie.

 Amaokwu Baịbụl ị ga-eburu n’uche: “E nweghị onye ga-abịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, onye zitere m, adọtaghị ya.”​—Jọn 6:44.

 Chee banyere ihe a: Na ị na-eche echiche ime baptizim nwere ike ịna-egosi na Jehova na-adọta gị ka gị na ya dịrị n’ezigbo mma. Ị̀ ga-ekwenụ ka gị na ya dịrị ná mma?

 Chetakwa na ọ bụ Jehova na-ekpebi ihe ndị ọ chọrọ ka ha bịaruo ya nso ga na-eme, ọ bụghị gịnwa ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ. Okwu ya na-emesikwa gị obi ike na ị ‘bịaruo Chineke nso, ọ ga-abịarukwa gị nso.’​—Jems 4:8.

 “Nke bụ́ eziokwu bụ na na ị matara Jehova ma na-abịaru ya nso gosiri na ọ hụrụ gị n’anya. N’ihi ya, i chewe na i rughị eru ife Jehova, chetara onwe gị na ọ naghị ele gị anya otú ahụ. Otú Jehova si ele ihe anyị zikwara ezi.”​—Selina.

 Ihe bụ́ isi bụ: Ọ bụrụ na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru na ndị chọrọ ime baptizim ga na-eme, ọ pụtara na i ruru eru ife Jehova. Chetakwa na ọ bụ Jehova ka i kwesịrị ife ofufe.​—Mkpughe 4:11.

 Ihe ọzọ ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Mere M Kwesịrị Iji Na-ekpe Ekpere?