Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Hibru 10:1-39
-
Ọbara anụmanụ enweghị ike iwepụ mmehie (1-4)
-
E nwere ihe Iwu ahụ nọchiri anya ya (1)
-
-
Kraịst chụrụ àjà naanị otu ugboro (5-18)
-
Ụzọ ọhụrụ nke na-eduba ná ndụ (19-25)
-
Ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị (24, 25)
-
-
Anyị ekwesịghị ịkpachara anya na-eme mmehie (26-31)
-
Obi ike na okwukwe ga-eme ka anyị tachie obi (32-39)
10 Iwu ahụ* nọchiri anya+ ihe ọma ndị na-abịa abịa,+ ma ọ bụghị ya bụ ihe ọma ndị ahụ. N’ihi ya, o nweghị* ike iji àjà ndị a na-achụ mgbe niile kwa afọ mee ka ndị na-abịakwute Chineke zuo okè.+
2 A sị na o nwere ike ime ka ha zuo okè, ọ̀ bụ na a garaghị akwụsị ịchụ àjà ndị ahụ maka na obi agaghịzi na-ama ndị na-efe Chineke ikpe ma e mehaala ka ha dị ọcha otu ugboro?
3 Ma àjà ndị ahụ na-echetara ndị mmadụ kwa afọ+ na ha bụ ndị mmehie,
4 n’ihi na ọbara oké ehi na ọbara ewu enweghị ike iwepụ mmehie.
5 N’ihi ya, mgbe ọ bịara n’ụwa, ọ sịrị: “‘Ihe ị chọrọ abụghị àjà na onyinye, kama ị kwadebeere m ahụ́.
6 I nweghị mmasị n’àjà a na-esucha ọkụ nakwa n’àjà mmehie.’+
7 M wee sị: ‘Lee, abịala m ime uche gị, Chineke+ (e dere banyere m n’akwụkwọ mpịakọta).’”
8 Mgbe o kwuchara, sị: “Ihe ị chọrọ abụghị àjà na onyinye, i nweghịkwa mmasị n’àjà a na-esucha ọkụ nakwa n’àjà mmehie,” ya bụ, àjà ndị Iwu* kwuru ka a na-achụ,
9 o kwuziri, sị: “Lee, abịala m ime uche gị.”+ O wepụrụ ihe nke mbụ ka o wee webata nke abụọ.
10 Ọ bụ “uche”+ Chineke a mere e ji jiri àjà e ji ahụ́ Jizọs Kraịst chụọ naanị otu ugboro mee ka anyị dị nsọ.+
11 Onye nchụàjà ọ bụla na-eguzo kwa ụbọchị na-eje ozi dị nsọ*+ ma na-achụ otu ụdị àjà ugboro ugboro,+ bụ́ àjà ndị na-enweghị ike iwepụcha mmehie.+
12 Ma nwoke a chụrụ otu àjà maka mmehie, bụ́ àjà ga-adịru mgbe niile, nọrọzie ala n’aka nri Chineke.+
13 Malite mgbe ahụ gawa, ọ nọ na-eche ruo mgbe a ga-eme ka ndị iro ya bụrụ ihe o ji agbakwasị ụkwụ.+
14 N’ihi na ọ bụ otu àjà ọ chụrụ ka o ji mee ka ndị a na-edo nsọ zuo okè+ mgbe niile.
15 Mmụọ nsọ na-agbakwara anyị àmà na ọ bụ eziokwu, n’ihi na mgbe o kwuchara, sị:
16 “‘Ihe a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ha ga-agba mgbe oge ahụ gachara,’ ka Jehova* kwuru. ‘M ga-etinye iwu m n’uche ha, m ga-edekwa ya n’obi ha,’”+
17 o kwuziri, sị: “Agaghịzi m echeta mmehie ha na omume ọjọọ ha.”+
18 Ebe ọ bụ na a gbagharala ha mmehie ha, e nweghịzi àjà a ga-achụ maka mmehie.
19 Ụmụnna m, ebe ọ bụ na ọbara Jizọs na-eme ka obi sie anyị ike isi n’ụzọ e si abanye n’ebe nsọ*+ ahụ na-abanye,
20 bụ́ ụzọ ọhụrụ o megheere anyị nke na-eduba ná ndụ, nke e si n’ákwà mgbochi ahụ abanye,+ ya bụ, ahụ́ ya,
21 ebe ọ bụkwa na anyị nwere onye nchụàjà ukwu na-elekọta ụlọ Chineke,+
22 ka anyị jiri ezi obi na-abịa Chineke nso ma nwee okwukwe siri ezigbo ike, ebe ọ bụ na e meela ka obi anyị dị ọcha ka anyị ghara inwe akọnuche ọjọọ,+ e jirikwa mmiri dị ọcha sachaa ahụ́ anyị.+
23 Ka anyị nọgidesie ike na-ekwupụta olileanya anyị n’ihu ọha n’amaghị jijiji,+ n’ihi na onye kwere anyị nkwa kwesịrị ka a tụkwasị ya obi.
24 Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche n’ihi na ọ ga-eme ka anyị na-ahụrịta ibe anyị n’anya ma na-arụ ezigbo ọrụ.+
25 Ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị+ otú ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume+ ma na-emekwu ihe ndị a ebe anyị na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.+
26 N’ihi na ọ bụrụ na anyị akpachara anya na-eme mmehie mgbe anyị matachara eziokwu nke ọma,+ e nweghịzi àjà ọ bụla fọrọ a ga-achụ maka mmehie anyị,+
27 kama ihe ga-echere anyị bụ ikpe dị egwu na iwe Chineke na-enwu ka ọkụ nke ga-erepịa ndị na-emegide ya.+
28 Onye ọ bụla dara Iwu Mosis, a na-egbu ya n’emetereghị ya ebere* ma mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ gbaa akaebe na o mere otú ahụ.+
29 Ọ̀ bụ na unu echeghị na ahụhụ a ga-ata onye zọrọ Ọkpara Chineke ụkwụ ga-aka njọ, bụ́ onye na-ejighị ọbara ọgbụgba ndụ+ e ji doo ya nsọ kpọrọ ihe, onye ledakwara mmụọ nke amara Chineke anya ma mejọọ ya?+
30 N’ihi na anyị ma Onye kwuru, sị: “Ọ bụ m ga-abọ ọbọ. M ga-akwụ ụgwọ.” E dekwara, sị: “Jehova* ga-ekpe ndị ya ikpe.”+
31 Mmadụ daba n’aka Chineke dị ndụ, nke ya agwụla.
32 Ma, na-echetanụ ụbọchị ndị gara aga, bụ́ mgbe e mechara ka unu hụ ìhè.+ N’oge ahụ, unu tachiri obi mgbe unu nọ na-atagbu onwe unu n’ahụhụ.
33 N’oge ụfọdụ, a kparịrị unu n’ihu ọha* ma kpagbuo unu. N’oge ụfọdụkwa, unu so ndị e mere ụdị ihe ndị a taa ahụhụ.*
34 N’ihi na unu meteere ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ ebere, unu akwụsịghịkwa inwe ọṅụ mgbe e bukọọrọ ihe unu,+ ebe unu ma na unu nwere ihe ka mma, nke na-adịgide adịgide.+
35 N’ihi ya, unu akwụsịla inwe obi ike,* ebe ọ bụ na unu ga-enweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.+
36 N’ihi na unu kwesịrị ịtachi obi,+ ka unu wee nweta ihe Chineke kwere ná nkwa mgbe unu mechara uche ya.
37 N’ihi na ọ ka fọrọ “obere oge,”+ ‘onye ahụ nke na-abịa ga-abịarute, ọ gaghịkwa egbu oge.’+
38 “Ma onye nke m nke na-eme ezi omume ga-adị ndụ maka na o nwere okwukwe,”+ ‘ọ bụrụkwa na o si n’ebe m nọ laa azụ, ihe ya agaghị amasị m.’*+
39 Ma anyị abụghị ụdị ndị na-ala azụ ka e wee bibie anyị,+ kama anyị bụ ndị nwere okwukwe ka e wee chebe ndụ* anyị.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ O nwere ike ịbụ, “ndị mmadụ enweghị.”
^ Ya bụ, Iwu Mosis.
^ Ya bụ, Iwu Mosis.
^ Ma ọ bụ “na-ejere ọhaneze ozi.”
^ Ma ọ bụ “n’Ebe Kacha Nsọ.”
^ Ma ọ bụ “n’enwereghị ya ọmịiko.”
^ Na Grik, “a kpọpụtara unu n’ọgbọ egwuregwu.”
^ Ma ọ bụ “unu kwụ ndị e mere ụdị ihe ndị a n’akụkụ.”
^ Na Grik, “ikwu okwu n’atụghị ụjọ.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”