NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ
M̀ Kwesịrị Ime Baptizim?—Nke 2: Ijikere Maka Ime Baptizim
Ọ bụrụ na ị na-ebi ụdị ndụ Baịbụl kwadoro, gị na Chineke adịkwa ná mma, o doro anya na ime baptizim ga na-abata gị n’obi. Olee otú ị ga-esi amata na ị dịla njikere ime ya? a
Ihe ndị a ga-ekwu n’isiokwu a
Gịnị na gịnị ka m kwesịrị ịma?
Ijikere maka ime baptizim apụtaghị na ị ga-eburu ọtụtụ ihe n’isi, ka à ga-asị na ị na-aga ile ule n’ụlọ akwụkwọ. Ma, i kwesịrị ịmụta ịna-eche “echiche” nke ọma, si otú ahụ mee ka obi sie gị ike na ihe Baịbụl na-akụzi bụ eziokwu. (Ndị Rom 12:1) Dị ka ihe atụ:
Ì kwetasiri ike na Chineke dị adị nakwa na ọ bụ ya ka i kwesịrị ịna-efe?
Baịbụl sịrị: “Onye ọ bụla na-abịakwute Chineke ga-ekwetarịrị na ọ dị adị nakwa na ọ na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.”—Ndị Hibru 11:6.
Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere m ji kwere na Chineke?’ (Ndị Hibru 3:4) ‘Gịnị mere m ji kwesị ịna-efe ya?’—Mkpughe 4:11.
Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu bụ́ “È Nwere Onye Kere Ihe Niile Ka Ọ̀ Bụ na E Nweghị?—Agba nke Mbụ: Olee Ihe Mere Ị Ga-eji Kwere na Chineke Dị?”
Ì kwetasiri ike na ihe dị na Baịbụl si n’aka Chineke?
Baịbụl sịrị: “Ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ si n’ike mmụọ nsọ Chineke. Ha bakwara uru iji ha akụzi ihe, iji ha adọ mmadụ aka ná ntị, iji ha agbazi mmadụ, nakwa iji ha azụ mmadụ ka ọ na-eme ezi omume.”—2 Timoti 3:16.
Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere m ji kwere na ihe e dere na Baịbụl abụghị uche mmadụ?’—Aịzaya 46:10; 1 Ndị Tesalonaịka 2:13.
Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka?—Nke 1: Na-agụ Baịbụl Gị.”
Ì kwetasiri ike na Jehova ji ọgbakọ Ndị Kraịst emezu nzube ya?
Baịbụl sịrị: “Ka a na-eto [Chineke] n’ọgbọ niile ruo mgbe niile ebighị ebi n’ihi ihe o sirila n’aka ọgbakọ nakwa n’aka Kraịst Jizọs rụọ.”—Ndị Efesọs 3:21.
Jụọ onwe gị, sị: ‘M gaa ọmụmụ ihe, m̀ na-ele ihe m na-amụta na Baịbụl anya ka ihe si n’aka mmadụ ka ọ̀ bụ ihe si n’aka Jehova?’ (Matiu 24:45) ‘M̀ na-aga ọmụmụ ihe ọ bụrụgodị na nne na nna m enweghị ike ịga (ma ọ bụrụ na ha kwere ka ị gaa)?’—Ndị Hibru 10:24, 25.
Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-aga Ọmụmụ Ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?”
Gịnị ka m kwesịrị ịna-eme?
A naghị atụ anya na ị ga-ezu okè ka i wee mee baptizim. Ma, i kwesịrị ịna-eme ihe ga-egosi n’eziokwu na ị chọrọ ‘ịhapụ ihe ọjọọ, mewe ezi ihe.’ (Abụ Ọma 34:14) Dị ka ihe atụ:
Ị̀ na-ebi ndụ otú dabara n’iwu Jehova?
Baịbụl sịrị: “Na-agbanụ mbọ ka unu nwee ezigbo akọnuche.”—1 Pita 3:16.
Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú m sirila gosi na m “na-echebara ihe echiche nke ọma” nakwa na ‘azụọla m onwe m ka m mata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ?’ (Ndị Hibru 5:14) ‘M̀ ga-echetali oge ndị m jụrụ ime ihe na-adịghị mma ndị ọgbọ m chọrọ ka m mee? Ndị m metere enyi hà na-agba m ume ime ihe dị mma?’—Ilu 13:20.
Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu bụ́ “How Can I Train My Conscience?”
Ị̀ ghọtara na ị ga-aza Jehova ajụjụ maka ihe niile ị na-eme?
Baịbụl sịrị: “Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.”—Ndị Rom 14:12.
Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-agwa onwe m na ndị ọzọ eziokwu?’ (Ndị Hibru 13:18) ‘M mehie ihe, m̀ na-ekweta na m mehiere ka m na-agba mbọ izochi ya ma ọ bụkwanụ bo ya ndị ọzọ?’—Ilu 28:13.
Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ihe M Kwesịrị Ime Ma M Mejọọ Ihe?”
Ị̀ na-agba mbọ ka gị na Jehova dịrị ná mma?
Baịbụl sịrị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8.
Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe m na-eme iji bịaruo Jehova nso?’ Dị ka ihe atụ, ‘M̀ na-agụchi Baịbụl anya?’ (Abụ Ọma 1:1, 2) ‘M̀ na-ekpe ekpere mgbe niile?’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:17) ‘M̀ na-akpọ okwu aha ma m kpewe ekpere? Ndị enyi m hà bụ ndị enyi Jehova?’—Abụ Ọma 15:1, 4.
Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu ndị a: “Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka?—Nke 2: Mee Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọ Gị Ụtọ” nakwa “Gịnị Mere M Kwesịrị Iji Na-ekpe Ekpere?”
IHE I NWERE IKE IME: Gụọ isi nke 37 n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2. Ọ ga-enyere gị aka ịkwadebe maka baptizim. Chebara ihe omume dị na peeji nke 308 na 309 echiche nke ọma.
a Gụọ isiokwu bụ́ “M̀ Kwesịrị Ime Baptizim?—Nke 1.” Ọ kọwara ihe mmadụ inyefe Chineke onwe ya na ime baptizim pụtara na ihe mere ha ji dị mkpa.