Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Olee Ihe Ga-enyere M Aka Ịna-emega Ahụ́?

Olee Ihe Ga-enyere M Aka Ịna-emega Ahụ́?

 Gịnị mere m kwesịrị iji na-emega ahụ́?

 Ná mba ụfọdụ, ndị na-eto eto anachaghị emega ahụ́. Nke a nwekwara ike ịkpatara ha ọrịa. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na “ọzụzụ nke ahụ́ bara . . . uru.” (1 Timoti 4:⁠8) Chebara ihe ndị na-esonụ echiche:

  •   Mmega ahụ́ ga-eme ka ahụ́ dị gị mma. Imega ahụ́ na-eme ka ahụ́ mmadụ na-emepụta ihe ga-eme ka ahụ́ dị onye ahụ mma, ya ana-enwekwa obi ụtọ. Ụfọdụ na-ekwu na imega ahụ́ na-eme ka mmadụ ghara ịda mbà n’obi.

     “Ọ bụrụ na m gbaa ọsọ n’isi ụtụtụ, ọ na-eme ka m rụọ ọrụ nke ọma, obi ana-atọkwa m ụtọ. Ịgba ọsọ na-eme ka obi dị m mma.”​—⁠Regina

  •   Mmega ahụ́ nwere ike ime ka ị dịkwuo mma n’anya. Imega ahụ́ otú kwesịrị ekwesị ga-eme ka ahụ́ gbasịkwuo gị ike. O nwekwara ike ime ka i nwekwuo obi ike.

     “Obi na-atọ m ụtọ ugbu a na m nwere ike ijide ihe aka bulie onwe m elu ugboro iri, ma n’afọ gara aga, anaghị m emeli ya ọ bụrụgodị otu ugboro. Obi dị m ụtọ na m na-elekọta ahụ́ m nke ọma.”​—⁠Olivia.

  •   Mmega ahụ́ nwere ike ime ka ị dị ogologo ndụ. Imega ahú ga-eme ka obi gị na-arụ ọrụ nke ọma, meekwa ka ị na-eku ume nke ọma. O nwekwara ike ime ka ị ghara ịna-arịa ọrịa obi. Ọrịa a kacha akpata ọnwụ ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.

     “Ọ bụrụ na anyị ana-emega ahụ́ nke ọma, anyị na-egosi Onye kere anyị na anyị ejighị ahụ́ o nyere anyị egwu egwu.”​—⁠Jessica.

 Isi ihe a na-ekwu: Imega ahụ́ ga-abara gị ezigbo uru n’ọdịnihu. E nwekwara uru ọ ga-abara gị ugbu a. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Tonya kwuru, sị: “O nweghị mgbe ị ga-asị, ‘A sị na m ma, agaraghị m aga ije ahụ m gara ma ọ bụ gbaa ọsọ ahụ m gbara. Mgbe ụfọdụ, m na-enwe ihe ndị na-egbochi m ịga megaa ahụ́. Ma m gbaa mbọ gaa megaa ahụ́, obi na-atọ m ezigbo ụtọ, anaghịkwa m akwa mmakwaara maka imega ahụ́.”

Ọ bụrụ na a naghị elebara ụgbọala anya nke ọma, ọ ga-emecha kwụsị ịrụ ọrụ, otú ahụ ka ọ dịkwa ahụ́ gị ma ọ bụrụ na ị naghị emega ahụ́

 Gịnị mere anaghị m emega ahụ́?

 Ihe ndị na-esonụ nwere ike igbochi gị ịna-emega ahụ́:

  •   Enweghị m ihe na-eme ka ọ gụọ agụụ. “Ndị mmadụ na-eche na ha bụ anwụghị anwụ mgbe ha ka na-eto eto. Ha na-echekwa na o nweghị mgbe ha ga-arịa ọrịa. Ha na-eche na ọ bụ ndị agadi na-arịa ọrịa.”​—⁠Sophia.

  •   Enweghị m ohere. “N’agbanyeghị na m na-arụkarị ọrụ, m na-ewepụta oge m ji eri nri na oge m ji ehi ụra, ma iweputa oge m ga-eji na-emega ahụ́ na-esiri m ezigbo ike.”​—⁠Clarissa.

  •   Enweghị m ego m ji akwụ ụgwọ ebe a na-emega ahụ́. “Mmadu ịna-adị gara gara na-efu ezigbo ego. Ị ga-akwụ ụgwọ ma ị chọọ ịnọ n’ebe a na-emega ahụ́ na-emega ahụ́.”​—⁠Gina.

 Ihe ị ga-echebara echiche:

 Olee ihe kacha egbochi gị ịna-emega ahụ́? Gbalịsie ike ka ị gbaara ihe ahụ ọsọ. Ime otú ahụ ga-abara gị ezigbo uru.

 Olee otú m ga-esi na-emega ahụ́?

 Lee ihe ụfọdụ nwere ike inyere gị aka:

  •   Gbaa mbọ mee ka ahụ́ na-agbasi gị ike.​—⁠Ndị Galeshia 6:⁠5.

  •   Zere ịkụdo ihe aka. (Ekliziastis 11:⁠4) Dị ka ihe atụ, i kwesịghị iche ka i debanye aha gị n’ebe a na-emega ahụ́ tupu ị malite imega ahụ́. Naanị ihe ị ga-eme bụ ịmalite ná ndị nke na-atọ gị ụtọ ma na-eme ha kwa ụbọchi.

  •   Iji mata ihe ụfọdụ banyere mmega ahụ́, jụọ ndị ọzọ ụdị mmega ahụ́ ha na-eme.​—⁠Ilu 20:⁠18.

  •   Depụta mgbe ị ga na-emega ahụ́. Nwee ihe i bu n’obi ị chọrọ iji mmega ahụ́ ahụ mezuo. Depụtakwa otú i si na-eme nke ọma na ya.​—⁠Ilu 21:⁠5.

  •   Chọọ onye gị na ya ga na-eso emega ahụ́. Ọ bụrụ na ị chọta onye gị na ya ga na-eso emega ahụ́, ọ ga-agba gị ume ịnọgide na-emega ahụ́.​—⁠Ekliziastis 4:​9, 10.

  •   Cheta na ị ga-enwe ihe ndị ga-egbochi gị ịna-emega ahụ́. Ma ekwekwala ka ha mee ka ị kwụsị ịna-emega ahụ́.​—⁠Ilu 24:10.

 Na-emega ahụ́ otú kwesịrị ekwesị

 Baịbụl gwara ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ka ha “na-emeru ihe n’ókè.” (1 Timoti 3:​2, 11) N’ihi ya, na-emega ahụ́ otú kwesịrị ekwesị. Mmadụ imega ahụ́ karịa otú o kwesịrị ime abaghị uru ọ bụla. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Julia kwuru, sị: “M hụ nwoke ọdịdị ahụ́ ya dị mkpa karịa amamihe ya, ihe ya anaghị amasị m.”

 Ekwekwala ka mmega ahụ́ na-agba gị ara. Ime otú ahụ nwere ike imerụ gị ahụ́. O nwekwara ike ime ka ị ghara ilekwasị anya ‘n’ihe ndị ka mkpa’ ná ndụ.​—⁠Ndị Filipaị 1:⁠10.

 Ihe ọzọ bụ na ikwe ka mmega ahụ́ na-agba gị ara nwere ike itinye gi ná nsogbu. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Vera kwuru, sị: “Ọtụtụ ụmụ agbọghọ na-edowe foto nke ndị ha chọrọ ịdị ka ha. Ha na-elekwa foto ndị ahụ mgbe ike imega ahụ́ na-adịghị ha. Ha lechaa, ha ewere onwe ha tụnyere ndị ahụ, ya emee ka ha daa mbà n’obi. Ọ ka mma ka mmadụ gbalịa mee ka ahụ́ na-agbasi ya ike, ọ bụghị naanị ime ka ọ na-adị mma n’anya.”