Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Olee Ihe M Kwesịrị Ime Ma M Mejọọ Ihe?

Olee Ihe M Kwesịrị Ime Ma M Mejọọ Ihe?

 Gịnị ka  ga-eme ma ọ bụrụ gị?

 Gụọ ihe mere Karina, ma weregodị ya na ọ bụ gịnwa ka o mere. Olee ihe  gaara eme ma asị na ọ bụ gịnwa ka o mere?

 Ka m nya ụgbọala anyị na-aga ụlọ akwụkwọ, onye uwe ojii jidere m n’ihi oké ọsọ m na-agba, ma nye m akwụkwọ gosiri na m dara iwu. Iwe were m, mụ agwa ya mama m. Mama m asị m gaa gwa papa m ihe merenụ. Ma, achọghị m ịgwa ya papa m.”

  Gịnị ka  ga-eme ma ọ bụrụ gị?

  1.  A: Gbachi nkịtị, buru n’obi na papa gị agaghị amata gbasara ya.

  2.  B: Gwa papa gị ihe niile merenụ.

 Obi gị nwere ike ịgwa gị ka ị họrọ Nke A. I nwere ike ịna-eche na mama gị ga-ewere ya na ị kọọrọla papa gị ihe niile merenụ. Ma e nwere ezigbo ihe mere ị kwesịrị iji kwuo ihe i mere, ma ọ bụ iwu okporo ụzọ ka ị dara, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ka i mere.

 Ihe atọ mere ị ga-eji kweta ihe i mejọrọ

  1.  1. Ọ bụ ihe i kwesịrị ime. Baịbụl kwuru otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-akpa àgwà. Ọ sịrị: “Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.”​​—Ndị Hibru 13:18.

     “M gbalịsiri ike iji hụ na m na-ekwu eziokwu mgbe niile, na iji isi m buru ihe m metara. M mejọọ ihe, m na-ekweta ozugbo.”​​—Alexis.

  2.  2. Mmadụ kweta ihe o mejọrọ, o nwere ike ime ka a gbaghara ya. Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-ezochi ajọ omume ya agaghị enwe ihe ịga nke ọma, ma onye na-ekwupụta ya ma na-ahapụ ya ka a ga-emere ebere.”​​—Ilu 28:13.

     “Ọ dịghị mfe mmadụ ịkata obi kweta ihe o mejọrọ. Ma, ime otú ahụ ga-eme ka ndị mmadụ tụkwasị gị obi. Ha ga-amata na ịbụ onye na-ekwu eziokwu, ha agaghị ewerekwa ihe ahụ i mejọrọ ka oké ihe.”​​—Richard.

  3.  3. Nke ka nke bụ na ọ na-eme Jehova Chineke obi ụtọ. Baịbụl kwuru, sị: “N’ihi na onye aghụghọ bụ ihe arụ n’anya Jehova, ma ya na ndị na-eme ihe n’eziokwu na-enwe mmekọrịta chiri anya.”​​—Ilu 3:32.

     “Mgbe m mechara otu ihe dị ezigbo njọ, ọ bịara doo m anya na ọ ga-aka mma ikweta ihe m mere kama izochi ya. O nweghị otú Jehova ga-esi agọzi m ma ọ bụrụ na mụ anaghị eme ihe otú ọ chọrọ.”​​—Rachel.

 Gịnị ka Karina mechara mee? O zochiiri papa ya na ya dara iwu okporo ụzọ. Ma, papa ya mechara chọpụta. Karina kwuru, sị: “Mgbe ihe dị ka otu afọ gachara, ka papa m nọ na-eleba anya n’akwụkwọ ịnshọransị ezinụlọ anyị, ọ hụrụ akwụkwọ gosiri na m dara iwu okporo ụzọ. M bara n’ezigbo nsogbu. Iwe were mama m na mụ agwaghị ya papa m otú ahụ ọ gwara m mee.”

 Ihe ọ mụtara: Karina kwuru, sị: “Mmadụ ịgbalị izochi ihe o mejọrọ na-eme ka ihe ka njọ. Onye ahụ ga-emecha taa ahụhụ ya.”

 Otú Ị Ga-esi Mụta Ihe n’Ihe I Mejọrọ

 Ọ dịghị onye na-adịghị emejọ ihe. (Ndị Rom 3:23; 1 Jọn 1:8) Dị ka anyị hụrụ, mmadụ ikweta ihe o mejọrọ ozugbo o mere ihe ahụ na-egosi na onye ahụ bụ dimkpa, nakwa na ọ dị umeala n’obi.

 Ihe ọzọ dị mkpa bụ ịmụta ihe n’ihe ndị i mejọrọ. Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị na-eto eto anaghị amụta ihe n’ihe ndị ha mejọrọ. O nwere ike ịdị ha otú ọ dịbu otu nwa agbọghọ aha ya bụ Priscilla. Priscilla kwuru, sị: “Obi na-ajọ m ezigbo njọ maka ihe ndị m mejọrọ. Ọ na-eme ka ihere onwe m na-eme m, na-adịkwa m ka ihe o mebichaala nke na ọ gaghị ekwe mmekwata. Ya dị otú ahụ, ike ụwa agwụ m, ya adịrịzie m ka nke m na-eme ọ̀ gwụla.”

 Ò nwere mgbe ọ na-adị gị otú ahụ ọ dị Priscilla? Ọ bụrụ otú ahụ, cheta na: Ichegbu onwe gị maka ihe ndị i mejọrọ n’oge gara aga, dị ka ebe onye na-akwọ ụgbọala na-ele anya n’enyo e ji ahụ ihe na-eme n’azụ, kama ilewe anya n’ihu. Ịna-echegbu onwe gị maka ihe ndị i mejọrọ n’oge gara aga ga-eme ka ike ụwa gwụ gị, meekwa ka o siere gị ike ịma ihe ị ga-eme maka nsogbu ndị ọzọ ga-abịara gị.

 Kama ime otú ahụ, ọ ka mma ka i bido lewe ihe anya otú kwesiri ekwesi.

 “Mụta ihe n’ihe ndị i mejọrọ n’oge gara aga ka ị ghara ime ha ọzọ. Ma, a nọkwala na-eche gbasara ha mgbe niile ka ọ ghara ime ka ị daa mba.”​—Elliot.

 “M na-ewere ihe ndị m mejọrọ ka ihe ndị m ga-eji na-amụta ihe na ihe ndị ga-enyere m aka ịghọ ezigbo mmadụ. Eche m na ọ bụ ihe kacha mma ime n’ihi na ọ ga-enye aka ka i si na ya mụtakwuo ihe.”​—Vera.