Ozi Ọma Mak Dere 12:1-44

  • Ihe atụ ndị ọrụ ubi obi tara mmiri (1-12)

  • Chineke na Siza (13-17)

  • Ajụjụ banyere mbilite n’ọnwụ (18-27)

  • Iwu abụọ kachanụ (28-34)

  • Kraịst ọ̀ bụ nwa Devid? (35-37a)

  • “Kpacharanụ anya maka ndị odeakwụkwọ” (37b-40)

  • Mkpụrụ ego abụọ nwaanyị di ya nwụrụ (41-44)

12  Jizọs malitere imere ha ihe atụ. Ọ sịrị: “Otu nwoke kọrọ ubi vaịn,+ gbaa ya ogige gburugburu, gwuo olulu ebe mmanya si n’ebe a na-azọchapụta mmanya ga na-asọba ma rụọ ụlọ elu.+ O nyefeziri ya n’aka ndị ọrụ ubi, wee gawa mba ọzọ.+  Mgbe oge e ji aghọ mkpụrụ vaịn ruru, o zipụrụ otu ohu ya ka ọ gakwuru ndị ọrụ ubi ahụ nata ha ụfọdụ n’ime mkpụrụ si n’ubi vaịn ahụ.  Ma ha jidere ya, tikasịa ya ahụ́ ma chụlaa ya n’enyeghị ya ihe ọ bụla.  O zigakwaara ha ohu ọzọ. Ma ha kụrụ ya ihe n’isi, menyekwa ya ihere.+  O wee ziga onye ọzọ, ha egbuo ya. O zigakwara ọtụtụ ndị ọzọ. Ma ha tiri ụfọdụ n’ime ha ihe, gbuokwa ụfọdụ n’ime ha.  O wee zigara ha onye nke ikpeazụ o nwere, bụ́ ọkpara ya ọ hụrụ n’anya,+ kwuo, sị, ‘Ha ga-akwanyere ọkpara m ùgwù.’  Ma ndị ọrụ ubi ahụ gwara ibe ha, sị, ‘Ọ bụ onye a ga-eketa ubi a.+ Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ihe ọ ga-eketa bụrụzie nke anyị.’  Ha wee jide ya, gbuo ya ma tụpụ ya n’ubi vaịn ahụ.+  Gịnịzi ka onye nwe ubi vaịn ahụ ga-eme? Ọ ga-abịa gbuo ndị ọrụ ubi ahụ ma nyefee ndị ọzọ ubi vaịn ahụ.+ 10  Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị ihe a e dere n’Akwụkwọ Nsọ: ‘Nkume ndị na-arụ ụlọ jụrụ aghọọla nkume ji ụlọ.+ 11  Ihe a si n’aka Jehova,* ọ dịkwa ebube n’anya anyị’?”+ 12  Ha wee chọọ ijide ya n’ihi na ha ma na ọ bụ ha ka o bu n’obi mee ihe atụ ahụ. Ma, ha tụrụ ìgwè mmadụ ahụ egwu. N’ihi ya, ha hapụrụ ya pụọ.+ 13  Ha zipụziri ụfọdụ ndị Farisii nakwa ụfọdụ ndị òtù Herọd ka ha gakwuru ya, ka ha si n’ihe ọ ga-ekwu mata ya n’ọnyà.+ 14  Mgbe ha rutere, ha sịrị ya: “Onye Ozizi, anyị ma na ị na-ekwu eziokwu, ị naghịkwa asọ onye ọ bụla anya n’ihi na ị naghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ihe ị na-akụzi banyere Chineke bụ eziokwu. È kwesịrị ịkwụ Siza ụtụ isi ka ọ̀ bụ na e kwesịghị? 15  Ọ̀ bụ anyị kwụọ, ka ọ̀ bụ anyị akwụla?” Ọ chọpụtara na ha bụ ndị ihu abụọ, ya asị ha: “Gịnị mere unu ji na-anwa m? Wetaranụ m mkpụrụ ego dinarịọs* ka m hụ.” 16  Ha wetaara ya otu, ya asị ha: “Isi ònye na aha ònye dị n’ego a?” Ha sịrị ya: “Ọ bụ nke Siza.” 17  Jizọs wee sị: “Kwụọnụ Siza ihe Siza,+ ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.”+ Ihe a o kwuru juru ha anya. 18  Ndị Sadusii, bụ́ ndị na-asị na mbilite n’ọnwụ adịghị,+ bịara jụọ ya, sị:+ 19  “Onye Ozizi, Mosis dere na ọ bụrụ na nwanne mmadụ anwụọ, ma nwunye ya amụtaraghị ya nwa, nwanne ya nwoke kwesịrị ịlụrụ nwaanyị ahụ ọ hapụrụ ma mụtara nwanne ya nwoke nwa.+ 20  E nwere ụmụnne asaa. Nke mbụ lụrụ nwunye, ma ọ nwụrụ n’amụtaghị nwa. 21  Nke abụọ lụụrụ nwaanyị ahụ, ma ọ nwụkwara n’amụtaghị nwa. Otu ihe ahụ mekwara onye nke atọ. 22  Ụmụ nwoke asaa ahụ nwụrụ n’amụtaghị nwa. N’ikpeazụ, nwaanyị ahụ nwụkwara. 23  A kpọlite ha n’ọnwụ, ònye n’ime ha ka ọ ga-abụ nwunye ya ebe ọ bụ na ha asaa lụchara ya?” 24  Jizọs sịrị ha: “Unu amaghị Akwụkwọ Nsọ, unu amaghịkwa otú ike Chineke si arụ ọrụ. Ọ bụ ya mere unu ji efu ụzọ.+ 25  N’ihi na mgbe ha ga-esi n’ọnwụ bilie, ụmụ nwoke agaghị alụ nwaanyị, a gaghịkwa eke ụmụ nwaanyị di, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe.+ 26  Ọ̀ bụ na unu agụbeghị akụkọ osisi ogwu ahụ n’akwụkwọ Mosis? Chineke na-ekwu banyere ndị nwụrụ anwụ a ga-akpọlite n’ọnwụ mgbe ọ gwara Mosis, sị: ‘Abụ m Chineke Ebreham na Chineke Aịzik na Chineke Jekọb.’+ 27  Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ. N’eziokwu, unu efuola ụzọ.”+ 28  Otu n’ime ndị odeakwụkwọ nke bịara n’ebe ahụ nụrụ ka ha na-arụrịta ụka. Ebe ọ ma na ihe Jizọs zara ha dị mma, ọ jụrụ ya, sị: “Olee nke bụ́ nke mbụ* n’ihe niile e nyere n’iwu?”+ 29  Jizọs zara, sị: “Nke mbụ bụ, ‘Nụrụ, Izrel, Jehova* bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova.* 30  Jiri obi gị niile na mkpụrụ obi* gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ Jehova* bụ́ Chineke gị n’anya.’+ 31  Nke abụọ bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.’+ E nweghị ihe ọ bụla ọzọ e nyere n’iwu karịrị iwu ndị a.” 32  Odeakwụkwọ ahụ sịrị ya: “Onye Ozizi, ihe i kwuru bụ eziokwu. ‘Ọ bụ otu Chineke ka e nwere, e nweghịkwa ọzọ ma e wepụ ya.’+ 33  Mmadụ iji obi ya niile na nghọta ya niile na ike ya niile hụ ya n’anya nakwa ịhụ onye agbata obi ya n’anya otú ọ hụrụ onwe ya karịrị àjà niile a na-esucha ọkụ na àjà ndị ọzọ.”+ 34  Jizọs hụrụ na o kwuru okwu ka onye ma ihe, ya asị ya: “Ọ bụ naanị obere ihe ji gị ịbanye n’Alaeze Chineke.” Ma, e nweghịzi onye obi kara ịjụ ya ajụjụ.+ 35  Ma, ka Jizọs na-ezi ihe n’ụlọ nsọ, ọ sịrị: “Gịnị mere ndị odeakwụkwọ ji asị na Kraịst bụ nwa Devid?+ 36  Devid si n’ike mmụọ nsọ+ kwuo, sị: ‘Jehova* gwara Onyenwe m, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m ga-eme ka ndị iro gị nọrọ n’okpuru ụkwụ gị.”’+ 37  Devid kpọrọ ya Onyenwe ya. Oleezi otú o si bụrụ nwa ya?”+ Ìgwè mmadụ nọ na-ege ya ntị, obi ana-atọ ha ụtọ. 38  Ka ọ nọ na-ezi ihe, ọ sịrị: “Kpacharanụ anya maka ndị odeakwụkwọ, ndị ọ na-amasị iyi uwe mwụda na-agagharị ma na-achọ ka a na-ekele ha n’ọma ahịa.+ 39  Ha na-achọkwa ka ha nọrọ n’oche ihu* n’ụlọ nzukọ nakwa n’isi oche ná nri anyasị.+ 40  Ha na-anara ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ihe niile ha nwere,* na-ekpekwa ogologo ekpere ka ndị mmadụ hụ ha. Ikpe a ga-ama ha ga-akarị nke ndị ọzọ.” 41  Jizọs nọdụrụ ala chee ihu n’ebe igbe ndị a na-atụnye ego+ dị. O wee malite ile otú ìgwè mmadụ si na-atụnye ego n’igbe ndị ahụ. Ọtụtụ ndị bara ọgaranya nọkwa na-atụnye ọtụtụ mkpụrụ ego.+ 42  Ma, otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye bịara tụnye obere mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụta ihe dị nnọọ ntakịrị.*+ 43  Jizọs wee kpọọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya, ya asị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu na nwaanyị a di ya nwụrụ, bụ́ onye dara ogbenye, tụnyere ihe karịrị ihe ndị niile na-atụnye ego n’igbe ndị ahụ tụnyere.+ 44  N’ihi na ha niile si n’ọtụtụ ihe ha nwere na-atụnye ihe. Ma nwaanyị a tụnyere ihe niile o nwere, n’agbanyeghị na ọ bụ ogbenye ọnụ ntụ.”*+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ A5.
Gụọ B14.
Ma ọ bụ “nke kachanụ.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “n’oche kacha mma.”
Na Grik, “na-eripịa ụlọ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ.”
Na Grik, “mkpụrụ ego leptọn abụọ, nke bụ́ mkpụrụ ego kwọdrans.” Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ọ dara ụkpa.”