Ozi Ọma Jọn Dere 6:1-71

  • Jizọs nyere puku ụmụ nwoke ise nri (1-15)

  • Jizọs jere ije n’elu mmiri (16-21)

  • Jizọs bụ “achịcha na-enye ndụ” (22-59)

  • Okwu Jizọs mere ka ọtụtụ ndị kwụsị iso ya (60-71)

6  Mgbe e mechara, Jizọs gara n’ofe nke ọzọ nke Oké Osimiri Galili,* ma ọ bụ Taịbirias.+  Ìgwè mmadụ nọkwa na-eso ya+ n’ihi na ha na-ahụ ọrụ ebube ndị ọ na-arụ* mgbe ọ na-agwọ ndị ọrịa.+  Jizọs wee rịgoro n’elu ugwu ma nọrọ ala n’ebe ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya.  Ememme Ngabiga,+ bụ́ ememme ndị Juu na-eme, na-erukwa nso.  Mgbe Jizọs leliri anya hụ na ìgwè mmadụ na-abịakwute ya, ọ jụrụ Filip, sị: “Ebee ka anyị ga-azụta achịcha ndị a ga-ata?”+  Ma, o kwuru ihe a ka ọ mara ihe dị Filip n’obi n’ihi na ọ* ma ihe ọ* na-aga ime.  Filip zara ya, sị: “E jirigodị narị mkpụrụ ego dinarịọs abụọ (200) zụta achịcha, ọ gaghị ezu onye ọ bụla n’ime ha inweta ntakịrị.”  Otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ Andru nwanne Saịmọn Pita, sịrị ya:  “Lee nwata nwoke bu ogbe achịcha ọka bali ise na obere azụ̀ abụọ. Ma olee otú ha ga-esi zuoro ọtụtụ mmadụ a?”+ 10  Jizọs wee sị: “Gwanụ ha ka ha nọdụ ala.” Ebe ọ bụ na ahịhịa juru eju n’ebe ahụ, ha nọdụrụ ala. Ụmụ nwoke nọ n’ebe ahụ dị ihe dị ka puku ise (5,000).+ 11  Jizọs weere achịcha ahụ. Mgbe o kelechara Chineke, o kesaara ha ndị ahụ nọ ọdụ n’ala. Otú ahụ ka o kesakwaara ha obere azụ̀ ahụ. Ha wee rijuo afọ. 12  Mgbe ha rijuchara afọ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Tụtụkọtanụ ihe ha rifọrọ, ka ihe ọ bụla ghara ịla n’iyi.” 13  Ha wee tụtụkọta iberibe achịcha ndị ahụ tara achịcha ọka bali ise ahụ tafọrọ, ya eju nkata iri na abụọ. 14  Mgbe ndị mmadụ hụrụ ọrụ ebube ndị ọ rụrụ,* ha malitere ịsị: “N’eziokwu, onye a bụ Onye Amụma ahụ ga-abịa n’ụwa.”+ 15  Ma, ebe Jizọs ma na ha na-achọ ịbịa jide ya ka ha mee ya eze, ọ gaghachiri+ n’ugwu naanị ya.+ 16  Mgbe o ruru mgbede, ndị na-eso ụzọ ya gbadara gaa n’oké osimiri.+ 17  Ha banyere n’ụgbọ mmiri, kwọrọ ya gawa ka ha gafee oké osimiri ahụ ruo Kapaniọm. N’oge ahụ, ọchịchịrị agbaala, ma Jizọs abịakwutebeghị ha.+ 18  Oké osimiri ahụ malitere inugharị n’ihi na nnukwu ifufe na-efe.+ 19  Ma mgbe ha kwọọrọ ụgbọ ha ruo ihe dị ka kilomita ise ma ọ bụ isii,* ha hụrụ Jizọs ka ọ na-eje ije n’elu oké osimiri ma na-abịaru ụgbọ mmiri ahụ nso, egwu wee tụwa ha. 20  Ma ọ sịrị ha: “Ọ bụ m. Unu atụla egwu.”+ 21  Ha jizi obi ụtọ nabata ya n’ụgbọ mmiri ahụ. N’oge na-adịghị anya, ụgbọ mmiri ahụ ruru n’ebe ha na-aga.+ 22  N’echi ya, ìgwè mmadụ ndị nọ n’ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ hụrụ na e nweghị ụgbọ mmiri dị n’ebe ahụ ma e wepụ otu obere ụgbọ mmiri. Ha chọpụtakwara na Jizọs esoghị ndị na-eso ụzọ ya banye n’ụgbọ mmiri, kama na ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ ya pụwara. 23  Ma, ụgbọ mmiri ndị si Taịbirias rutere n’ebe dị nso n’ebe ahụ ha tara achịcha mgbe Onyenwe anyị kelechara Chineke. 24  N’ihi ya, mgbe ìgwè mmadụ ahụ hụrụ na Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya anọghị n’ebe ahụ, ha banyere ụgbọ mmiri ha bịawa Kapaniọm ịchọ Jizọs. 25  Mgbe ha hụrụ ya n’ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ, ha sịrị ya: “Onye Ozizi,*+ olee mgbe i ji rute ebe a?” 26  Jizọs zara ha, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na ihe mere unu ji achọgharị m abụghị maka na unu hụrụ ọrụ ebube ndị m rụrụ,* kama ọ bụ maka na unu tara achịcha, afọ eju unu.+ 27  Unu arụla ọrụ maka nri nke na-ala n’iyi, kama rụọnụ ọrụ maka nri nke ga-adịru ebighị ebi,+ nke Nwa nke mmadụ ga-enye unu, n’ihi na ọ bụ onye a ka Nna m, bụ́ Chineke, kara akara nke na-egosi na ihe ya masịrị ya.”+ 28  N’ihi ya, ha sịrị ya: “Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị wee na-arụ ọrụ dị Chineke mma?” 29  Jizọs zara ha, sị: “Ọrụ dị Chineke mma unu ga-arụ bụ inwe okwukwe n’onye o zitere.”+ 30  Ha sịziri ya: “Olee ọrụ ebube ị ga-arụ,*+ ka anyị hụ ya ma kwere na gị? Olee ọrụ ị ga-arụ? 31  Nna nna anyị hà riri mana n’ala ịkpa+ otú ahụ e dere ya, sị, ‘O nyere ha achịcha si n’eluigwe ka ha rie.’”+ 32  Jizọs gwaziri ha, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na Mosis enyeghị unu achịcha si n’eluigwe, ma Nna m na-enye unu ezigbo achịcha si n’eluigwe. 33  N’ihi na achịcha nke Chineke bụ onye ahụ si n’eluigwe bịa, nke na-enye ụwa ndụ.” 34  N’ihi ya, ha sịrị ya: “Onyenwe anyị, na-enye anyị achịcha a mgbe niile.” 35  Jizọs sịrị ha: “Abụ m achịcha na-enye ndụ. Agụụ agaghị agụ onye na-abịakwute m, mmiri agaghịkwa agụ onye nwere okwukwe n’ebe m nọ ọzọ.+ 36  Ma agwala m unu na unu ahụla m, ma unu ekweghị.+ 37  Ndị niile Nna m nyere m ga-abịakwute m, emekataghị m chụpụ onye na-abịakwute m+ 38  n’ihi na esi m n’eluigwe bịa+ ime uche onye zitere m, ọ bụghị uche m.+ 39  Uche onye zitere m bụ ka onye ọ bụla n’ime ndị niile o nyere m ghara ifunahụ m, kama ka m kpọlite ha n’ọnwụ+ n’ụbọchị ikpeazụ. 40  N’ihi na uche Nna m bụ ka onye ọ bụla nke nabatara Ọkpara ahụ ma nwee okwukwe na ya nwee ndụ ebighị ebi.+ M ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ+ n’ụbọchị ikpeazụ.” 41  Ndị Juu malitere ịtamu ntamu n’ihi Jizọs maka na ọ sịrị: “Abụ m achịcha nke si n’eluigwe bịa.”+ 42  Ha wee malite ịsị: “Onye a ọ́ bụghị Jizọs nwa Josef, onye anyị ma nne ya na nna ya?+ Olee otú o sizi na-asị: ‘Esi m n’eluigwe bịa’?” 43  Jizọs sịrị ha: “Kwụsịnụ ịtamu ntamu. 44  E nweghị onye ga-abịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, onye zitere m, adọtaghị ya.+ M ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.+ 45  E dere n’Akwụkwọ Ndị Amụma, sị: ‘Jehova* ga-akụziri ha niile ihe.’+ Onye ọ bụla gere Nna m ntị ma mụta ihe na-abịakwute m. 46  E nweghị mmadụ ọ bụla hụrụla Nna m,+ ma e wepụ onye ahụ si n’ebe Chineke nọ. Onye a ahụla Nna ahụ.+ 47  N’eziokwu, ana m asị unu na onye ọ bụla kweere ga-enweta ndụ ebighị ebi.+ 48  “Abụ m achịcha na-enye ndụ.+ 49  Nna nna unu hà riri mana n’ala ịkpa ma mechaa nwụọ.+ 50  Ma onye ọ bụla na-eri achịcha a si n’eluigwe bịa agaghị anwụ anwụ. 51  Abụ m achịcha na-enye ndụ nke si n’eluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọ bụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ebighị ebi. N’eziokwu, achịcha m ga-enye bụ anụ ahụ́ m ka ụwa wee nweta ndụ.”+ 52  Ndị Juu wee malite ịrụrịta ụka, sị: “Olee otú nwoke a ga-esi enye anyị anụ ahụ́ ya ka anyị rie?” 53  N’ihi ya, Jizọs sịrị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu na ọ bụrụ na unu erighị anụ ahụ́ Nwa nke mmadụ ma ṅụọ ọbara ya, unu enweghị ndụ n’ime onwe unu.+ 54  Onye ọ bụla na-eri anụ ahụ́ m ma na-aṅụ ọbara m nwere ndụ ebighị ebi, m ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ+ n’ụbọchị ikpeazụ, 55  n’ihi na anụ ahụ́ m bụ ezigbo nri, ọbara m bụkwa ezigbo ihe ọṅụṅụ. 56  Mụ na onye ọ bụla na-eri anụ ahụ́ m ma na-aṅụ ọbara m dị n’otu, yanwa na mụnwa dịkwa n’otu.+ 57  Otú ahụ Nna m dị ndụ zitere m, m wee dị ndụ n’ihi Nna m, ka onye na-eri anụ ahụ́ m ga-adị ndụ n’ihi m.+ 58  Ọ bụ achịcha a bụ achịcha si n’eluigwe bịa. Ọ dịghị ka achịcha nna nna unu hà riri ma mechaa nwụọ. Onye na-eri achịcha a ga-adị ndụ ebighị ebi.”+ 59  O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ndị Juu dị* na Kapaniọm. 60  Mgbe ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya nụrụ ihe a, ha sịrị: “Okwu a na-agba agba ná ntị. Ònye ga-achọkwanụ ige ya?” 61  Ma, ebe Jizọs ma na ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu n’ihi ihe o kwuru, ọ sịrị ha: “Ihe a ò meela ka okwukwe unu gharazie isi ike?* 62  Gịnịzi ga-eme ma unu hụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-arịgo n’ebe ọ nọbu?+ 63  Ọ bụ mmụọ bụ ihe na-enye ndụ.+ Anụ ahụ́ abaghị uru ọ bụla. Okwu m gwara unu si n’ike mmụọ nsọ, ọ na-enyekwa ndụ.+ 64  Ma e nwere ụfọdụ n’ime unu na-ekweghị.” Jizọs kwuru ihe a n’ihi na site ná mmalite, ọ ma ndị na-ekweghị ekwe, marakwa onye ga-arara ya nye.+ 65  O wee sị: “Ọ bụ ya mere m ji sị unu na e nweghị onye ọ bụla ga-abịakwute m, ọ gwụla ma Nna m ò kwere ka ọ bịakwute m.”+ 66  N’ihi ihe a o kwuru, ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya laghachiri n’ihe ndị ha hapụrụ ahapụ,+ kwụsịkwa iso ya. 67  Jizọs wee jụọ ndịozi ya iri na abụọ, sị: “Ùnu chọkwuru ịla?” 68  Saịmọn Pita zara ya, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-alakwuru?+ Okwu gị na-enye ndụ ebighị ebi.+ 69  Anyị ekwerela, marakwa na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.”+ 70  Jizọs sịrị ha: “Ọ́ bụghị m họọrọ unu mmadụ iri na abụọ?+ Ma, otu onye n’ime unu bụ onye nkwutọ.”*+ 71  N’eziokwu, ọ na-ekwu banyere Judas nwa Saịmọn Iskarịọt n’ihi na ọ bụ ya ga-arara ya nye, n’agbanyeghị na o so ná ndịozi iri na abụọ ahụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ bụ ọdọ mmiri. Baịbụl kpọkwara ya Ọdọ Mmiri Genesaret na Oké Osimiri Taịbirias.
Na Grik, “ihe àmà ndị ọ na-eme.”
Ya bụ, Jizọs.
Ya bụ, Jizọs.
Na Grik, “ihe àmà ndị o mere.”
Ihe dị ka maịl atọ ma ọ bụ anọ. Na Grik, “ihe dị ka stediọm 25 ma ọ bụ 30.” Otu stediọm bụ mita 185. Stediọm a abụghị ámá egwuregwu. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “hụrụ ihe àmà.”
Na Grik, “ihe àmà ị ga-eme.”
Gụọ A5.
O nwere ike ịbụ, “n’ebe ọhaneze gbakọtara.”
Na Grik, “Ihe a ò meela ka unu daa?”
Ma ọ bụ “ekwensu.”