Mkpughe E Kpugheere Jọn 4:1-11

  • Jọn hụrụ ọhụụ ebe Jehova nọ n’eluigwe (1-11)

    • Jehova nọ ọdụ n’ocheeze ya (2)

    • Ndị okenye iri abụọ na anọ nọ ọdụ n’ocheeze (4)

    • Ndị mmụọ ozi anọ (6)

4  Mgbe ihe a gachara, ahụrụ m ọnụ ụzọ e meghere emeghe n’eluigwe. Olu mbụ m nụrụ, nke na-ada ka opi, gwara m, sị: “Gbagote ebe a. M ga-egosi gị ihe ndị ga-emerịrị.”  Mgbe ihe a mechara, mmụọ nsọ malitere idu m ozugbo, mụ ahụ otu ocheeze n’eluigwe, nke e nwere onye nọ ọdụ na ya.+  Onye ahụ nke nọ ọdụ n’ocheeze ahụ na-egbuke ka nkume jaspa+ na nkume dị oké ọnụ* nke na-acha ọbara ọbara. Eke na egwurugwu nke na-egbuke ka emerad gbakwara ocheeze ahụ gburugburu.+  Ocheeze iri abụọ na anọ gbakwara ocheeze ahụ gburugburu. Ahụkwara m ka ndị okenye iri abụọ na anọ, ndị yi uwe na-acha ọcha, nọ ọdụ n’ocheeze ndị ahụ.+ Onye ọ bụla n’ime ha kpukwa okpueze ọlaedo n’isi ya.  Àmụ̀mà si n’ocheeze ahụ na-egbu,+ anụkwara m olu dị iche iche, égbè eluigwe sikwa n’ocheeze ahụ na-agba.+ Mpanaka* asaa ndị na-enwu ọkụ dịkwa n’ihu ocheeze ahụ. Mpanaka* ndị ahụ pụtara mmụọ asaa nke Chineke.+  N’ihu ocheeze ahụ, e nwere ihe yiri oké osimiri nke dị ka enyo+ ma ọ bụ kristal. N’etiti ocheeze ahụ nakwa gburugburu ocheeze ahụ, e nwere ndị mmụọ ozi anọ*+ ndị ihu na azụ ha bụ anya anya.  Mmụọ ozi nke mbụ dị ka ọdụm.+ Mmụọ ozi nke abụọ dị ka oké ehi.+ Mmụọ ozi nke atọ+ nwere ihu yiri ihu mmadụ. Mmụọ ozi nke anọ+ dị ka ugo nke na-efe efe.+  Nke ọ bụla n’ime ndị mmụọ ozi anọ ahụ* nwere nku isii. Nku ha niile bụkwa anya anya.+ Ehihie na abalị, ha na-asị: “Nsọ, nsọ, nsọ ka Jehova* Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, dị.+ Ọ bụ onye dịbu adị na onye dị adị na onye na-abịa.”+  Mgbe ọ bụla ndị mmụọ ozi ndị ahụ* toro Chineke, bụ́ onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, onye na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi,+ sọpụrụkwa ya ma kelee ya, 10  ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ+ na-ada n’ala n’ihu Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, na onye na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi, ma kpọọrọ ya isiala. Ha na-atọgbọkwa okpueze ha n’ihu ocheeze ahụ, sị: 11  “Jehova* Chineke anyị, onye dị ike,+ i ruru eru ka ndị niile too gị+ ma sọpụrụ gị,+ n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile,+ ọ bụ n’ihi uche gị ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere i ji kee ha.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “nkume sadiọs.”
Ma ọ bụ “Oriọna.”
Ma ọ bụ “Oriọna.”
Na Grik, “ihe anọ dị ndụ.”
Na Grik, “ihe anọ ahụ dị ndụ.”
Gụọ A5.
Na Grik, “ihe anọ ahụ dị ndụ.”
Gụọ A5.