Abụ Ọma 103:1-22

  • “Ka m too Jehova”

    • Ọ na-ewepụ mmehie anyị ka ọ dị ezigbo anya (12)

    • Chineke na-emere ụmụ ya ebere (13)

    • Chineke na-echeta na anyị bụ ájá (14)

    • Ocheeze Jehova na ọchịchị ya (19)

    • Ndị mmụọ ozi na-eme ihe Chineke kwuru (20)

Abụ Devid. 103  Ka m* too Jehova. Ka ihe niile dị n’ime m too aha nsọ ya.   Ka m* too Jehova. Ka a ghara inwe mgbe m ga-echefu ihe niile o mere.+   Ọ na-agbaghara gị mmehie gị niile,+Ọ na-agwọkwa gị ọrịa gị niile.+   Ọ na-azọ gị ndụ ka ị ghara ịbanye n’olulu.*+ O kpuwere gị ịhụnanya ya na ebere ya+ ka okpueze.   Ọ na-emere gị ọtụtụ ihe ọma+ n’oge niile ị dị ndụ,Ka i wee bụrụ okorobịa ahụ́ na-adịghachi ọhụrụ ka ahụ́ ugo.+   Jehova na-emere ndị niile a na-emegbu emegbu+ ihe ọma,+Ọ na-ekpekwa ha ikpe ziri ezi.   O mere ka Mosis mara otú o si eme ihe,+Mee ka ndị Izrel mara ihe ndị ọ na-eme.+   Jehova nwere ọmịiko* ma na-eme ebere.+ Ọ naghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ịhụnanya ya dịkwa ukwuu.+   Ọ gaghị eburu ihe ọjọọ mmadụ mere n’obi mgbe niile,+Ọ gaghịkwa na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi.+ 10  Ọ naghị emeso anyị ihe otú anyị si emehie,+Ọ naghịkwa akwụ anyị ụgwọ otú ihe ọjọọ anyị na-eme hà.+ 11  N’ihi na otú a na-enweghị ike ịtụ ihe eluigwe ji dị elu karịa ụwa atụ̀Ka a na-enweghị ike ịtụ ịhụnanya* ọ na-egosi ndị na-atụ egwu ya.+ 12  Otú ọwụwa anyanwụ si dị ezigbo anya n’ọdịda anyanwụBụkwa otú o wepụrụ mmehie anyị ka ọ dị ezigbo anya n’ebe anyị nọ.+ 13  Jehova emeerela ndị na-atụ egwu ya ebere+Otú nna si emere ụmụ ya ebere. 14  N’ihi na ọ ma nnọọ otú e si kee anyị.+ Ọ na-echeta na anyị bụ ájá.+ 15  Ndụ mmadụ efu dị ka nke ahịhịa ndụ.+ Mmadụ na-ama mma otú okooko osisi dị n’ọhịa si ama mma.+ 16  Ma mgbe ifufe fere, a naghịzi ahụ ya,Ya adịzie ka à ga-asị na e nwetụbeghị mgbe ọ dị. 17  Ma Jehova na-ahụ ndị na-atụ egwu ya+ n’anyaRuo mgbe ebighị ebi.* Ọ na-emere ụmụ ụmụ ha ihe ọma,+ 18  Na-emere ndị na-anaghị emebi ọgbụgba ndụ ha na ya+Nakwa ndị na-elezi anya na-edebe iwu ya ihe ọma. 19  Jehova emeela ka ọchịchị* ya kwụsie ike n’eluigwe.+ Ọ na-achị ihe niile.+ 20  Unu ndị mmụọ ozi+ Jehova, ndị siri ezigbo ike,Ndị na-erubere ya isi+ ma na-eme ihe o kwuru, toonụ ya. 21  Unu niile bụ́ ndị agha+ Jehova,Ndị na-ejere ya ozi ma na-eme uche ya,+ toonụ ya. 22  Ka ihe niile Jehova kere too yaN’ebe niile ọ na-achị. Ka m jiri obi m niile too Jehova.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “n’ili.”
Ma ọ bụ “na-eme amara.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”
Ma ọ bụ “ocheeze.”