Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom 14:1-23

  • Kwụsịnụ ikpe ibe unu ikpe (1-12)

  • Emela ihe ga-eme ka ndị ọzọ mehie (13-18)

  • Na-eme ka gị na ndị ọzọ na-adị n’udo (19-23)

14  Nabatanụ onye okwukwe ya na-esighị ike,+ ma unu ekpela ya ikpe maka otú o si ele ihe anya.*  Onye okwukwe ya siri ike na-eri ihe niile, ma onye okwukwe ya na-esighị ike na-eri naanị akwụkwọ nri.  Ka onye na-eri ihe niile ghara ileda onye na-anaghị eri ihe niile anya, ka onye na-anaghịkwa eri ihe niile ghara ikpe onye na-eri ihe niile ikpe+ n’ihi na Chineke anabatala onye ahụ.  Ònye ka ị bụ na ị ga na-ekpe onye na-ejere onye ọzọ ozi ikpe?+ Ọ bụ Chineke bụ́ nna ya ukwu ga-ekpebi ma ihe ọ na-eme ọ̀ dị mma ka ọ̀ dị njọ.+ N’eziokwu, ebe Jehova* na-enyere ya aka, ihe ọ na-eme ga-adị ya mma.  Otu onye na-ewere na otu ụbọchị ka ụbọchị ndị ọzọ.+ Onye ọzọ na-ewere na ụbọchị niile bụ otu ihe.+ Ka obi sie onye ọ bụla ezigbo ike n’ihe o kweere.  Onye na-edebe otu ụbọchị ka ụbọchị pụrụ iche na-edebe ya maka Jehova.* Onye na-eri ihe niile na-eri ya maka Jehova* n’ihi na ọ na-ekele Chineke.+ Onye na-anaghịkwa eri ihe niile anaghị eri ya maka Jehova,* ma ọ na-ekelekwa Chineke.+  N’eziokwu, e nweghị onye n’ime anyị dị ndụ maka naanị onwe ya,+ e nweghịkwa onye na-anwụ maka naanị onwe ya.  N’ihi na ọ bụrụ na anyị dị ndụ, anyị dị ndụ maka Jehova,*+ ọ bụrụkwa na anyị nwụrụ anwụ, anyị nwụrụ maka Jehova.* N’ihi ya, ma ànyị dị ndụ ma ànyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Jehova.*+  N’ihi na ọ bụ ya mere Kraịst ji nwụọ ma dị ndụ ọzọ, ka o wee bụrụ Onyenwe ndị nwụrụ anwụ na ndị dị ndụ.+ 10  Ma gịnị mere i ji ekpe nwanna gị ikpe?+ Ma ọ bụ, gịnị mere i jikwa eleda nwanna gị anya? N’ihi na anyị niile ga-eguzo n’ihu oche ikpe Chineke.+ 11  N’ihi na e dere, sị: “Ọ bụ ihe a ka Jehova* kwuru, ‘Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ,+ ikpere niile ga-egburu m n’ala, ire niile ga-ekwupụtakwa na m bụ Chineke.’”+ 12  N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.+ 13  N’ihi ya, ka anyị kwụsị ịna-ekpe ibe anyị ikpe,+ kama ka anyị kpebie na anyị agaghị edowe ihe mkpọbi ụkwụ n’ihu nwanna ma ọ bụ mee ihe ga-eme ka o mehie.+ 14  Ebe m bụ onye na-eso ụzọ Onyenwe anyị Jizọs, ama m, o dokwara m anya na e nweghị ihe na-eji aka ya aghọ ihe rụrụ arụ.+ Ọ bụ naanị mgbe mmadụ weere na ihe rụrụ arụ ka ihe ahụ bụụrụ onye ahụ ihe rụrụ arụ. 15  N’ihi na ọ bụrụ na nri ị na-eri na-akpasu nwanna gị iwe, ị naghịzi egosi na ị hụrụ ya n’anya.+ Ekwela ka nri ị na-eri bibie* nwanna gị, onye Kraịst nwụrụ maka ya.+ 16  N’ihi ya, unu emela ihe unu chere na ọ dị mma ma ọ bụrụ na ọ na-eme ka ndị mmadụ na-ekwu okwu ọjọọ gbasara unu. 17  N’ihi na ọ bụghị iri nri na ịṅụ mmanya ga-eme ka mmadụ baa n’Alaeze Chineke,+ kama ọ bụ ezi omume na udo na ọṅụ, nke mmụọ nsọ na-eme ka mmadụ nwee. 18  N’ihi na Chineke na-anabata onye ọ bụla si otú a agbara Kraịst ohu, ihe onye ahụ na-adịkwa ndị mmadụ mma. 19  N’ihi ya, ka anyị na-eme ihe ọ bụla anyị nwere ike ime ka anyị na ndị ọzọ na-adị n’udo,+ ka anyị na-emekwa ihe ndị ga-agba ibe anyị ume.+ 20  Kwụsịnụ imebi ọrụ Chineke naanị n’ihi nri.+ N’eziokwu, ihe niile dị ọcha. Ma ọ dịghị mma ka mmadụ rie ihe ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka onye ọzọ zọhie ụkwụ.+ 21  Ọ ka mma ka ị ghara ịta anụ ma ọ bụ ịṅụ mmanya ma ọ bụ ime ihe ọ bụla ga-eme ka nwanna gị zọhie ụkwụ.+ 22  Okwukwe ahụ i nwere, were ya ka ihe dị n’etiti gị na Chineke. Ọ bụrụ na obi mmadụ anaghị ama ya ikpe mgbe ọ na-eme ihe o kpebiri ime, onye ahụ na-enwe obi ụtọ. 23  Ma ọ bụrụ na o nwee obi abụọ, a maala ya ikpe ma o rie ya n’ihi na o jighị okwukwe rie ya. N’eziokwu, ihe ọ bụla a na-ejighị okwukwe mee bụ mmehie.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “maka ihe ndị dị ya n’obi.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ya bụ, mee ka ọ ghara inwekwa okwukwe ma ọ bụ ka ọ ghara inweta ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.