Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Efesọs 5:1-33

  • Ikwu ihe dị mma na ịkpa àgwà dị mma (1-5)

  • Na-akpanụ àgwà ka ụmụ nke ìhè (6-14)

  • Jupụtanụ na mmụọ nsọ (15-20)

    • Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa (16)

  • Ọdụ a dụrụ ndị di na ndị nwunye (21-33)

5  N’ihi ya, na-emenụ ka* Chineke,+ maka na unu bụ ụmụ ya ọ hụrụ n’anya.  Hụkwanụ ndị ọzọ n’anya mgbe niile,+ otú ahụ Kraịst hụrụ anyị* n’anya+ ma jiri onwe ya chụọrọ Chineke àjà na-esi ísì ọma maka anyị.*+  Unu ekwesịghịdị ịna-ekwurịta gbasara ịkwa iko* na ụdị adịghị ọcha niile ma ọ bụ anyaukwu,+ n’ihi na ndị nsọ ekwesịghị ịna-eme otú ahụ.+  Unu emekwala omume na-eme ihere ma ọ bụ kwuo okwu nzuzu ma ọ bụ okwu njakịrị rụrụ arụ,+ n’ihi na ha ekwesịghị ekwesị. Kama ime ihe ndị a, na-ekelenụ Chineke.+  N’ihi na unu ma, ya edookwa unu anya, na o nweghị onye na-akwa iko*+ ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha ma ọ bụ onye anyaukwu,+ nke pụtara onye na-ekpere arụsị, ga-eketa Alaeze Kraịst na nke Chineke.+  Unu ekwela ka onye ọ bụla jiri okwu na-enweghị isi ghọgbuo unu, n’ihi na ọ bụ ụdị ihe a mere Chineke ga-eji wesa ndị na-enupụrụ ya isi iwe.  N’ihi ya, ka a ghara inwe ihe ọ bụla ga-ejikọ unu na ha,  n’ihi na unu nọbu n’ọchịchịrị, ma unu nọzi n’ìhè+ maka na unu na Onyenwe anyị dị n’otu.+ Na-akpanụ àgwà ka ụmụ nke ìhè.  N’ihi na onye nọ n’ìhè ahụ ga na-adị obiọma n’ihe niile, na-eme ezi omume, na-akpakwa àgwà dị mma.+ 10  Na-achọpụtanụ ihe dị Onyenwe anyị mma.+ 11  Unu esola ha eme ihe ndị na-enweghị isi ha na-eme, nke e ji mara ndị nọ n’ọchịchịrị.+ Kama na-agbanụ ha n’anwụ. 12  N’ihi na ọ na-eme anyị ihere ịkọ ihe ndị ha na-eme na nzuzo. 13  Ìhè na-agba ihe niile n’anwụ. N’ihi ya, ihe niile a gbara n’anwụ apụtala ìhè. 14  Ọ bụ ya mere Akwụkwọ Nsọ ji sị: “Gị onye na-arahụ ụra, teta, sikwa n’ọnwụ bilie,+ Kraịst ga-emekwa ka ị nọrọ n’ìhè.”+ 15  N’ihi ya, kpacharanụ nnọọ anya ka unu ghara ịna-akpa àgwà ka ndị na-amaghị ihe, kama na-akpanụ àgwà ka ndị ma ihe. 16  Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa,*+ n’ihi na oge a anyị bi na ya jọrọ njọ. 17  N’ihi ya, kwụsịnụ ịna-ele ihe anya otú na-ekwesịghị ekwesị, kama, gbalịanụ na-aghọta ihe Jehova* chọrọ ka unu na-eme.+ 18  Unu aṅụbigakwala mmanya ókè,+ n’ihi na ọ na-eme ka mmadụ na-ebi ndụ ịla n’iyi, kama jupụtanụ na mmụọ nsọ. 19  Jirinụ abụ ọma na abụ e ji eto Chineke nakwa abụ e ji efe ya na-agba ibe unu ume. Jirinụ obi unu niile na-abụku Jehova* abụ.+ 20  Na-ekelenụ Chineke bụ́ Nna anyị mgbe niile+ maka ihe niile n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.+ 21  Na-edonụ onwe unu n’okpuru ibe unu+ n’ihi ezigbo ùgwù unu na-akwanyere Kraịst. 22  Ka ndị nwunye na-edo onwe ha n’okpuru ndị di ha+ otú ha si edo onwe ha n’okpuru Onyenwe anyị, 23  n’ihi na di bụ onyeisi nwunye ya+ dị ka Kraịst bụkwa onyeisi ọgbakọ ya,+ ya bụ, ahụ́ ya, nke ọ bụkwa onye nzọpụta ya. 24  N’eziokwu, ndị nwunye kwesịrị ịna-edo onwe ha n’okpuru ndị di ha n’ihe niile, otú ahụ ọgbakọ si edo onwe ya n’okpuru Kraịst. 25  Ndị bụ́ di, hụnụ nwunye unu n’anya+ otú ahụ Kraịst hụkwara ọgbakọ ya n’anya ma nwụọ maka ya,+ 26  iji doo ya nsọ, jirikwa mmiri nke okwu Chineke saa ya, ya adị ọcha.+ 27  O mere ihe ndị a ka ọgbakọ maa mma n’anya ya, ghara inwe ntụpọ ma ọ bụ nkwarụ ma ọ bụ ihe ọ bụla yiri ya,+ kama ka ọ dị nsọ, gharakwa inwe ihe ga-emerụ ya.+ 28  Ndị bụ́ di kwesịkwara isi otú ahụ hụ nwunye ha n’anya otú ha si hụ ahụ́ nke ha n’anya. Onye hụrụ nwunye ya n’anya hụrụ onwe ya n’anya. 29  N’ihi na ọ dịghị mmadụ ọ bụla kpọtụrụla ahụ́* ya asị, kama ọ na-azụ ahụ́ ya, na-elekọtakwa ya, dị ka Kraịst na-emekwara ọgbakọ ya, 30  n’ihi na anyị bụ ihe ndị dị n’ahụ́ ya.+ 31  “N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nne ya na nna ya ma rapara n’ahụ́ nwunye ya,* ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ́.”+ 32  Ihe nzuzo a dị nsọ+ dị ezigbo mkpa. Ana m ekwu gbasara Kraịst na ọgbakọ ya.+ 33  Ma, ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya+ otú ọ hụrụ onwe ya. Nwunye kwesịkwara ịna-akwanyere di ya ezigbo ùgwù.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “na-eṅominụ.”
O nwere ike ịbụ, “unu.”
O nwere ike ịbụ, “unu.”
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Na Grik, “Na-azụtaranụ onwe unu oge.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Na Grik, “anụ ahụ́.”
Ma ọ bụ “ya na nwunye ya anọrọ.”