Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | NDỊ NA-ETO ETO

Ihe Ị Ga-eme ma E Zitere Gị Ozi n’Ekwentị

Ihe Ị Ga-eme ma E Zitere Gị Ozi n’Ekwentị

IHE NDỊ MMADỤ NA-EMEKARỊ

Ọ bụrụ na gị na enyi gị na-akpa nkata, enyi gị ọzọ ezitere gị ozi n’ekwentị gị, gịnị ka i kwesịrị ime?

  1. Gụọ ozi ahụ ka ị na-agwa enyi gị okwu.

  2. Sị ya cheregodị ka ị gụọ ozi ahụ.

  3. Hapụ ozi ahụ, kwuwenụ ihe unu na-ekwu.

Nke ọ bụla i kpebiri ime n’ime ihe atọ a nwere ihe o mere.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Ọ bụrụ na gị na enyi gị na-akparịta ụka gị ana-ede ozi ị ga-ezigara enyi gị ọzọ, ọ dị ka ebe mmadụ na-anya ụgbọala na-eri nri. Ị manụ na ọ dịghị mma. Ma, i nwere ike ịsị na ebe ha abụọ bụ enyi gị, o nweghị ihe o mere. Nke bụ́ eziokwu bụ na i kwesịrị ịkwanyere onye ahụ gị na ya na-ekwu okwu ùgwù. Ọ pụtaghị na ị gaghị eme ihe ọzọ ma gị na mmadụ na-akparịta ụka. Ma, cheta na ọ bụrụ na ị naghị akwanyere ndị enyi gị ùgwù, ọ gaghị ete aka ha agaghịzi abụ ndị enyi gị.

Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ maka na ndị mmadụ anaghị achọ ka ejiri ha na-eti epele. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ugochi * sịrị, “Ọ na-ewe m iwe ma mụ na enyi m na-ekwu okwu ya ana-ele anya n’ekwentị ya ka à ga-asị na e nwere ihe ka mkpa ọ na-atụ anya ya.” Ì chere na Ugochi na ụdị onye ahụ ga-abụte enyi aka?

Ka ị na-echebara ihe ị na-eme ma gị na mmadụ na-ekwu okwu echiche, legodị anya n’ebe ahụ e dere “Ihe Ndị Mmadụ Na-emekarị.” Olee nke i chere dị mma? O doro anya na nke A adịghị mma. Gịnị ka i chere banyere nke B na nke CH? Ọ bụrụ na ị sị onye gị na ya na-ekwu okwu ya chere ka ị gụọ ozi e ziteere gị, ọ̀ dị njọ? Ọ bụrụkwanụ na ị hapụ ozi ahụ, gị na enyi gị ana-ekwu ihe unu na-ekwu, ọ̀ dị njọ?

Ị hụlanụ na o nwere ike isitụrụ anyị ike ịma ihe anyị ga-eme iji kwanyere ndị enyi anyị ùgwù. Ma, Baịbụl ga-enyere anyị aka. Ọ sịrị: “Otú unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emeso unu, na-emesonụ ha otú ahụ.” (Luk 6:31) Ihe a Baịbụl kwuru nwere ike i nyere anyị aka mgbe anyị na-ede ozi na mgbe anyị na-agụ nke e ziteere anyị. Olee otú ọ ga-esi enyere anyị aka?

 IHE I NWERE IKE IME

Mara mgbe i kwesịrị izigara mmadụ ozi. Nwa okorobịa aha ya bụ Izundụ sịrị: “Oge ụfọdụ, mmadụ na-ezitere m ozi na-enweghị isi n’ime abalị. Ụdị ozi ahụ na-akpọte m n’ụra.” Jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ na-ezigara ndị mmadụ ozi mgbe ha kwesịrị ịna-ehi ụra?’—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ekliziastis 3:1.

Edela ihe ọ bụla sọrọ gị. Gị na mmadụ na-ekwu okwu, otú i si ekwu okwu, otú ihu gị dị na otú i si emegharị ahụ́ ga-enyere onye ahụ aka ịghọtakwu ihe ị na-ekwu. Ma, e nweghị otú onye ị na-edere ozi ga-esi ahụ ihe ndị a. Oleezi ihe i kwesịrị ime? Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Enyinne, sịrị: “Edela ihe ga-egosi na ị naghị akwanyere onye ahụ ùgwù. Jụọ onye ahụ otú o mere. Na-etinye ‘biko’ na ‘i meela’ n’ihe ị na-ede.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Kọlọsi 4:6.

Mara ihe i kwesịrị ime. Legodị anya n’ebe ahụ e dere “Ihe Ndị Mmadụ Na-emekarị.” Ọ bụrụ na e zitere gị ozi dị mkpa ị na-atụ anya ya, i nwere ike ịsị onye gị na ya na-ekwu okwu ya cheregodị ka ị gụọ ozi ahụ. Ma, i nwekwara ike ịgụ ozi ahụ ma e mechaa. Nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Amaka, sịrị: “Ị ka nwere ike ịgụ ozi ahụ ma gị na enyi gị kwuchaa okwu. Ma, ọ bụrụ na ị hapụ enyi gị gụwa ozi ahụ, o nwere ike hapụ gị pụwa.” Ọ bụrụ na ị nọ ná nnọkọ, ọ ga-aka mma ka ị gụọ ozi ọ bụla e ziteere gị mgbe unu gbasara. Nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Nkechi, sịrị: “Ya abụla gị na ndị mmadụ na-ekwurịta okwu, gị ana-edegara ndị ọzọ ozi ma ọ bụ na-agụ nke e detaara gị. Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, ọ na-egosi na i jighị ndị mmadụ kpọrọ ihe.”

Chebara ihe i dere echiche tupu i zipụ ya. Oge ụfọdụ, mmadụ nwere ike ịghọtahie ozi i ziteere ya. Gịnị ga-enyere gị aka ide ozi gị otú ọ ga-edo mmadụ anya? Nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na otu aha ya bụ Ụkachi, sịrị, “Ọ bụrụ na ihe ị chọrọ ide bụ ihe egwuregwu, dee ya otú onye ahụ ga-esi aghọta na ọ bụ ihe ọchị ka i ziteere ya. Iwe nwere ike iwe ụfọdụ ndị ma ọ bụdị ha abaa gị ọgụ ma ọ bụrụ na ha aghọtahie ihe i detaara ha.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 12:18.

Ị̀ hụlanụ na ihe i ji ekwentị gị na-eme mgbe gị na ndị enyi gị na-ekwu okwu nwere ike ime ka gị na ha dịkwuo ná mma ma ọ bụ kpatara gị nsogbu?

Ihe ị ga-echebara echiche: Ọ bụrụ na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya, anyị ga na-akpaso ha àgwà ọma. Olee ihe ga-egosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya? Baịbụl kwuru, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo, ọ dịghị etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu, ọ dịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya, ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe.” (1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5) Olee nke anyị kwesịrị imekwu nke ọma n’ime ihe ndị a Baịbụl kwuru?

^ para. 11 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.