Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8

Chineke Ọ̀ Na-Anụ Ekpere Anyị?

Chineke Ọ̀ Na-Anụ Ekpere Anyị?

È nwetụla mgbe i chere na Chineke anaghị anụ ekpere gị? Ọ bụrụ otú ahụ, e nwere ndị ọ dị otú ọ dị gị. Ọtụtụ ndị ekpeela ekpere maka nsogbu ha, ma nsogbu ndị ahụ akwụsịbeghị. Ọ̀ pụtara na Chineke anaghị anụ ekpere anyị? Mba. Baịbụl gwara anyị na Chineke na-anụ ekpere anyị ma anyị kpee ya otú kwesịrị ekwesị. Ka anyị tụlee ihe Baịbụl kwuru.

CHINEKE NA-ANỤ EKPERE.

“Gị Onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka anụ ahụ́ niile bụ́ mmadụ ga-abịakwute.” —Abụ Ọma 65:2.

Ihe mere ụfọdụ ndị ji ekpe ekpere bụ n’ihi na ha sịrị na ọ na-eme ka ahụ́ ruo ha ala n’agbanyeghị na ha ekwetaghị na e nwere onye na-anụ ekpere ha. Ma, ekpere abụghị naanị ihe na-eme ka ahụ́ ruo anyị ala ka anyị nwee ike idi nsogbu anyị. Baịbụl gwara anyị na “Jehova * nọ ndị niile na-akpọku ya nso, bụ́ ndị niile na-akpọku ya n’eziokwu. . . . Ọ ga-anụkwa mkpu enyemaka ha na-eti.”—Abụ Ọma 145:18, 19.

N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova Chineke na-anụ ekpere ndị na-efe ya. O kwuru, sị: “Unu ga-akpọku m, bịakwa kpekuo m ekpere, m ga-egekwa unu ntị.”—Jeremaya 29:12.

CHINEKE CHỌRỌ KA Ị KPEGARA YA EKPERE.

“Nọgidesienụ ike n’ekpere.”—Ndị Rom 12:12.

Na Baịbụl, a gbara anyị ume ka anyị “na-ekpe ekpere mgbe niile” nakwa ka anyị “na-anọgide n’ekpere n’oge niile.” N’eziokwu, Jehova Chineke chọrọ ka anyị na-ekpegara ya ekpere.—Matiu 26:41; Ndị Efesọs 6:18.

Gịnị mere Chineke ji chọọ ka anyị na-ekpegara ya ekpere? Chegodị ihe a: Olee nna na-agaghị enwe obi ụtọ ma nwa ya gwa ya ka o nyere ya aka? O doro anya na o nwere ike ịbụ na nna ahụ amarala ihe dị nwa ya mkpa, ma ọ nụ ka nwa ya na-arịọ ya ka o nyere ya aka, ọ na-egosi ya na nwa ya tụkwasịrị ya obi nakwa na ya na ya dị ná mma. Otú ahụ ka ọ dịkwa Jehova Chineke. Anyị kpegara ya ekpere, anyị na-egosi ya na anyị tụkwasịrị ya obi, chọọkwa ka anyị na ya dị ná mma.—Ilu 15:8; Jems 4:8.

IHE BANYERE GỊ NA-EMETỤ CHINEKE N’OBI N’EZIOKWU.

“Na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”—1 Pita 5:7.

Chineke chọrọ ka anyị na-ekpegara ya ekpere n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya, ihe banyere anyị na-emetụkwa ya n’obi. Ọ ma nsogbu anyị na ihe niile na-echegbu anyị. Ọ chọkwara inyere anyị aka.

N’oge niile Eze Devid dị ndụ, o kpegaara Jehova Chineke ekpere ka o nyere ya aka. Ọ gwakwara ya ihe ndị dị ya n’obi. (Abụ Ọma 23:1-6) Olee otú obi dị Chineke gbasara Devid? Chineke hụrụ Devid n’anya, zakwa ọtụtụ ekpere ndị o kpere. (Ọrụ Ndịozi 13:22) Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Chineke na-anụ ekpere anyị n’ihi na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi.

“ỊHỤNANYA JURU M OBI N’IHI NA JEHOVA NA-ANỤ OLU M”

Ọ bụ otu n’ime ndị so dee abụ ọma kwuru ihe a. Ọ ma na Chineke nụrụ ekpere ndị o kpere. Ihe a nyekwaara ya ezigbo aka. Ya na Chineke bịara dịkwuo ná mma, ya enyekwara ya aka idi nsogbu ndị ya na ya na-alụ.—Abụ Ọma 116:1-9.

Ọ bụrụ na obi siri anyị ike na Chineke na-anụ ekpere anyị, anyị ga-anọgide na-ekpe ekpere. Chegodị ihe mere otu nwoke bi n’ebe ugwu Spen aha ya bụ Pedro. Nwa ya nwoke dị afọ iri na itoolu nwụnahụrụ ya n’ihe mberede okporo ụzọ. Pedro gwara Chineke otú obi dị ya mgbe ọ na-eru uju. O kpere ekpere ọtụtụ ugboro ka Chineke kasie ya obi ma nyere ya aka. Chineke ọ̀ zara ya ekpere? O kwuru, sị: “Jehova zara ekpere m. O si n’aka Ndị Kraịst ibe m kasie mụ na nwunye m obi ma nyere anyị aka.”

Otú Chineke si aza ekpere anyị ọtụtụ mgbe bụ isi n’aka ndị enyi anyị hụrụ anyị n’anya kasie anyị obi ma nyere anyị aka

Ọ bụ eziokwu na ekpere emeghị ka nwa Pedro bilie, ma o nyeere ya na ndị ezinụlọ ya ezigbo aka. Nwunye ya aha ya bụ María Carmen, kwuru, sị: “Ekpere nyeere m aka ịkwụsị iru uju. Ama m na Jehova Chineke ghọtara otú obi dị m n’ihi na mgbe m kpegaara ya ekpere, obi bịara ruo m ala, mụ enwetakwa onwe m.”

Ma Baịbụl ma ihe ndị merela ndị mmadụ ná ndụ emeela ka o doo anya na Chineke na-aza ekpere. Ma, o dokwara anya na Chineke anaghị aza ekpere niile. Olee ihe mere Chineke ji aza ekpere ụfọdụ ma ghara ịza ụfọdụ?

^ par. 5 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.—Abụ Ọma 83:18.