Gaa n'Isiokwu

Baịbụl Ọ̀ Sịrị na Inwe Mmekọahụ Dị Njọ?

Baịbụl Ọ̀ Sịrị na Inwe Mmekọahụ Dị Njọ?

Ihe Baịbụl kwuru

 Baịbụl ekwughị na inwe mmekọahụ dị njọ. Ihe e dere na Baịbụl gosiri na ọ bụ onyinye Chineke nyere ndị lụrụ di na nwunye. O kere anyị “nwoke na nwaanyị.” O kwukwara na ihe ndị o kere “dị nnọọ mma.” (Jenesis 1:​27, 31) Mgbe ọ kpọtaara nwoke mbụ ahụ nwunye ya, o kwuru na ha ga-abụ “otu anụ ahụ́.” (Jenesis 2:​24) Na ha bụ otu anụ ahụ́ pụtara na ha nweere onwe ha ịna-enwe mmekọahụ, na-akpakwa ibe ha ezigbo nso.

 Lee ihe Baịbụl kwuru gbasara obi ụtọ nwoke na-enwe ma ọ lụọ nwaanyị. Ọ sịrị: ‘Ṅụrịa ọṅụ n’ihi nwunye ị lụrụ n’okorobịa. Ka ara ya na-egbu gị dị ka mmanya n’oge niile. Ka ịhụnanya ya na-enye gị oké obi ụtọ mgbe niile.’ (Ilu 5:​18, 19) Chineke chọkwara ka mmekọahụ na-atọ ndị nwunye ụtọ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị “ka di na-enye nwunye ya ihe ruuru ya; ka nwunye na-emekwara di ya otú ahụ.”​—1 Ndị Kọrịnt 7:3.

Naanị ndị e nyere ikike inwe mmekọahụ

 Chineke chọrọ ka ọ bụrụ naanị ndị lụrụ di na nwunye ga na-enwe mmekọahụ. Ọ bụ ya ka e kwuru ná Ndị Hibru 13:4. Ebe ahụ sịrị: “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile, ka ihe ndina alụmdi na nwunye gharakwa ịbụ ihe e merụrụ emerụ, n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe.” Ndị di na nwunye ekwesịghị ịna-agba n’èzí. Obi ga-aka adị ma di ma nwunye ụtọ ma ọ bụrụ na onye nke ọ bụla ana-achọ otú ọ ga-esi emeta onye nke ọzọ mma n’ihi na Baịbụl sịrị na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”​—Ọrụ Ndịozi 20:35.