Gaa n'Isiokwu

Ahụ́ Ike

Otú Ị Ga-esi Eme Ka Ahụ́ Gbasie Gị Ike

Ihe Ndị Ị Ga Na-eme Ka Ahụ́ Na-adị Gị Mma

Ihe ise ndị nwere ike inyere gị aka ka ahụ́ na-adị gị mma.

Ihe Anyị Ga-eme Ka Anyị Ghara Ịna-ebutekarị Ọrịa

Kwa ụbọchị, ahụ́ anyị na-alụso ọtụtụ ndị iro ọgụ. Ndị iro a anaghị eme mkpọtụ, a naghịkwanụ ahụ ha anya, ma ha nwere ike ịkpatara anyị ọnwụ.

Ihe Ga-eme Ka Ndụ Gị Ka Mma—Mmadụ Ijide Onwe Ya

Ọ bụrụ na anyị amụta ịna-ejide onwe anyị, ọ ga-abara anyị uru.

Ekwela Ka E Jiri Akụkọ Ụgha Duhie Gị

Akụkọ na-eduhie mmadụ, akụkọ na-emeghị eme, na akụkọ e ji emenye ndị mmadụ ụjọ juru ebe niile. Ha nwere ike ịkpatara gị nsogbu.

Ihe Ga-eme Ka Ndụ Gị Ka Mma—Ahụ́ Ike

Baịbụl na-agba anyị ume ka anyị mee ihe ndị anyị nwere ike ime iji na-elekọta ahụ́ anyị.

Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịna-enwe Obi Ụtọ Ma Ị Kawa Nká

Ihe isii Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ịna-enwe obi ụtọ ma ị kawa nká.

Idi Ọrịa

Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka Ma Ọ Bụrụ na M Na-arịa Ọrịa Na-anaghị Ala Ala?

Ee. Lee ihe atọ nwere ike inyere gị aka idi ọrịa na-anaghị ala ala ị na-arịa.

Otú Ị Ga-esi Enyere Ndị Isi Na-akpakọchaghị Ọnụ Aka

Inyere enyi gị isi na-akpakọchaghị ọnụ aka nwere ike ime ka ihe katụrụ ya mma.

Ndụ Ọ̀ Ka Nwere Isi Mgbe Ezigbo Ọrịa Ji Gị?

Mụta ihe nyeere ụfọdụ ndị aka mgbe ezigbo ọrịa ji ha.

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ahụ́ Adịghị M? (Nkebi nke 3)

Akụkọ mmadụ atọ na-eto eto nwere ike inyere gị aka ịmata otú ị ga-esi na-edi nsogbu gị.

Idi Nkwarụ

Ọrịa M Na-arịa Emeghị Ka Ike Gwụ M

Otu nwaanyị ọrịa mere ka ọ nọrọ n’oche ndị ngwọrọ nwetara “ike karịrị ike nkịtị” n’ihi okwukwe ya.

Anya Jairo Na-enyere Ya Aka Ife Chineke

N’agbanyeghị na Jairo nwere ọrịa ụbụrụ nke mere ka ọ bụrụ naanị anya ya ka ọ na-emegharịli n’ahụ́ ya, obi dị ya ụtọ na ndụ ọ dị bara uru.

Ọ Bụ Ijere Chineke Ozi Na-agwọ Ya

Kemgbe a mụrụ Onesmus, ọ na-arịa ọrịa ọkpụkpụ. Ọkpụkpụ ya esighị ike. Olee otú nkwa Chineke kwere na Baịbụl si gbaa ya ume?

Aka M Ka M Ji Ahụ Ụzọ

Nwanna James Ryan bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ dara ogbi kemgbe a mụrụ ya, e mechaa ya ekpuo ìsì. Olee ihe nyeere ya aka ịna-enwe obi ụtọ?

Vidio: “Ma Ọ́ Bụghị Ya, M Gaaraghị Ama Ihe M Ga-eme”

Lee vidio a ka ị nụ ihe onye ìsì kwuru gbasara otú Baịbụl e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì si baara ya uru.

Jehova Emeerela M Ihe Ọma Na-erughịrị M

Mgbe Félix Alarcón nwechara ihe mberede okporo ụzọ nke mere ka ahụ́ ya kpọnwụọ, si n’olu ruo n’ụkwụ, ọ matara na ndụ ọ dị bara uru.

Ilekọta Onye Ọrịa

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ilekọta Ndị Nne na Nna Merela Agadi?

Baịbụl kọrọ gbasara ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị na-efe Chineke mere ya. Baịbụl nwekwara ndụmọdụ ndị ga-abara ndị na-elekọta ndị agadi uru.

Gịnị Ka Ị Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Nwa Gị Nwere Nkwarụ?

Leba anya ná nsogbu atọ nwere ike ịbịara gị na otú ihe Baịbụl kwuru nwere ike isi nyere gị aka.

Gịnị Ka M Ga-eme ma Ọ Bụrụ na Ahụ́ Adịghị Mama M ma Ọ Bụ Papa M?

Ọ bụghị naanị gị ka ụdị ihe a metụrụla. Mata ihe nyeere mmadụ abụọ aka.

Mgbe Onye Ezinụlọ Gị Na-arịa Ọrịa Ga-egbu Ya

Olee otú ndị ezinụlọ nke onye na-arịa ajọọ ọrịa ga-esi na-elekọta ya? Olee ihe ha ga-eme ka ihe ndị na-enye ha nsogbu n’obi n’oge ahụ ghara ịna-akpa ha aka ọjọọ?

Ọrịa Dị Iche Iche

Olee Ihe Dị Iche na Nri Adịghị Mmadụ Mma n’Ahụ́ na Nri Adịghị Mmadụ Mma n’Afọ?

Mmadụ ò kwesịrị iji aka ya kpebie na ya agaghị eri nke a ma ọ bụ nke ọzọ, na-eche na ahụ́ ya anaghị anabata nri ndị ahụ?

Ihe I Kwesịrị Ịma Gbasara Ịba

Ọ bụrụ na i bi n’ebe ndị mmadụ na-arịakarị ịba ma ọ bụkwanụ na ị chọrọ ịga ebe ahụ, o nwere ihe ụfọdụ ị ga-eme ka i chebe onwe gị.

Ịda Mbà n’Obi

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ịda Mbà?

Gụọ ihe mere ụfọdụ ji ada mbà na ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ma ị daa mbà.

Ànọ M Ndụ Eme Gịnị?

Gịnị mere mmadụ ga-eji na-ekwu na ọnwụ kaara ya mma?

Mgbe Ọ Dị Ka Ị Gaghịzi Edili Nsogbu Gị

Ndụ ka bara uru n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla.

Gịnị Mere Ndị Na-eto Eto Ji Ada Mbà? Gịnị Ga-enyere Ha Aka?

Gụọ ihe a ka ị mata ihe ndị e ji ama na ọ na-achọ ime mmadụ, nakwa ihe ndị nwere ike ịna-akpata ya. Ị ga-ahụkwa ihe ndị nne na nna na ndị ọzọ nwere ike ime iji nye aka.

Olee Otú M Ga-esi Ghara Ịna-eche Ihe Na-adịghị Mma?

I mee ihe ndị e kwuru ebe a, ị ga-amụta otú ị ga-esi na-eche ihe ndị dị mma.

Gịnị Ka M Ga-eme ma Ọ Bụrụ na Obi Dara M Mbà?

Ihe ndị e dere n’isiokwu a ga-enyere gị aka.

Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka Ma M Daa Mbà n’Obi?

E nwere ihe atọ Chineke na-enye ndị dara mbà n’obi ga-enyere ha aka maka nsogbu ha.

Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka ma Echiche Igbu Onwe M Batawa M n’Obi?

Olee ndụmọdụ ndị bara uru Baịbụl na-enye onye ike ụwa gwụrụ?

Nchegbu

Ihe Ị Ga-eme ma I Chegbuwe Onwe Gị

Lee ihe ụfọdụ nwere ike inyere gị aka ma i chegbuwe onwe gị. Ha nwekwara ike inyere gị aka ibelata nchegbu.

Gịnị Ka M Ga-eme Ka M Kwụsị Ịna-echegbu Onwe M?

E nwere ihe isii ga-enyere gị aka ka nchegbu baara gị uru kama ịghọrọ gị nsogbu.

Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere Gị Aka Ịghara Ịna-echegbukarị Onwe Gị?

Ọ dịzi ka nchegbu bụ ihe ya na ndụ so aga. Ò nwere mgbe mmadụ na-agaghịzi na-echegbu onwe ya?

Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Nchegbu

O nwere nchegbu dị mma, nwee nke na-emebi ihe. Gịnị ga-enyere gị aka ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị?

Ihe Mere O Ji Ara Ahụ́: Ihe Mmadụ Ji n’Aka Dị Ọtụtụ

Ọ bụghị ihe niile ị chọrọ ime ka ị ga-emeli. Gịnị ka ị ga-eme ka nsogbu bịaara gị ghara ịnyịgbu gị?

Nyere Nwa Gị Nwaanyị Aka

Nsogbu ọtụtụ ụmụ agbọghọ na-enwe ma ha na-eto na-echegbu ha. Olee otú papa ha na mama ha nwere ike isi nyere ha aka?

Ihe Ị Ga-eme ma Ihe Gbanweere Gị

Ihe nwere ike ịgbanwere onye ọ bụla n’ime anyị. Gụọ isiokwu a ka ị hụ ihe nyeere ụfọdụ ndị aka mgbe ihe gbanweere ha.

Ihe Anyị Ga-eme Ka Obi Na-eru Anyị Ala

Gụọ ihe a ka ị hụ ihe atọ ga-enyere gị aka ka obi na-erukwu gị ala.

Okwu Gbasara Ịgwọ Ọrịa

Onye Kraịst Ò Nwere Ike Ịga Ụlọ Ọgwụ Ma Ọ Bụ Ṅụọ Ọgwụ Ma Ọ Rịawa Ọrịa?

Otú anyị họọrọ ka e si gwọọ anyị ò nwere ike ịkpasu Chineke iwe ma ọ bụ mee ya obi ụtọ?

Otú Ị Ga-esi Nyere Onye nke Gị Na-arịa Ọrịa Aka

Mmadụ ịna-ahụ dọkịta mgbe niile ma ọ bụ ịnọ n’ụlọ ọgwụ ọtụtụ ụbọchị adịghị mfe. Ma, olee otú ị ga-esi nyere onye nke gị ahụ́ na-adịghị aka?

Ndịàmà Jehova Na-aka Agbake Ngwa Ngwa n’Ihi na Ha Anaghị Ekwe Ka A Mịnye Ha Ọbara

Akụkọ ndị a nụrụ gosiri na ndị ọrịa na-ekweghị ka a mịnye ha ọbara na-akacha agbake, ha anaghịkwa anọte aka n’ụlọ ọgwụ.