Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Bụ Ijere Chineke Ozi Na-agwọ Ya

Ọ Bụ Ijere Chineke Ozi Na-agwọ Ya

Mgbe ndị ọsụ ụzọ abụọ banyere n’otu ụlọ na Kenya, ha hụrụ otu nwoke dina n’àkwà. O juru ha anya na ahụ́ ya dị ezigbo obere. Aka ya abụọ dịkwa mkpụmkpụ. Mgbe ha gwara ya na Chineke kwere nkwa na “onye ngwọrọ ga-awụli elu dị ka oké ele,” obi tọrọ ya ezigbo ụtọ.—Aịza. 35:6.

Aha nwoke ahụ bụ Onesmus. Ọ fọrọ obere ka o ruo afọ iri anọ ugbu a. Mgbe a mụrụ ya, a chọpụtara na ọ na-arịa ọrịa ọkpụkpụ, nke mere ka ọkpụkpụ ya ghara isi ike. Obere ihe e mere ya nwere ike ime ka ọkpụkpụ ya gbajie. Ebe ọ bụ na ọrịa ahụ enweghị ọgwụgwọ, Onesmus tụrụ anya na ahụ́ ga na-egbu ya mgbu mgbe niile, ya ana-anọkwa n’ígwè ndị ngwọrọ.

Onesmus kwere ka a mụwara ya Baịbụl. Ma, mama ya ekweghị ka ọ gaa ọmụmụ ihe n’ihi na o chere na o nwere ike ime ka o merụọ ahụ́, ahụ́ ana-egbukwu ya mgbu. N’ihi ya, ụmụnna na-etinyere ya ihe e kwuru n’ọmụmụ ihe na teepụ, ya anọrọ n’ụlọ na-egere ya. Mgbe a mụụrụ Onesmus ihe ọnwa ise, o kpebiri na ya ga-aga ọmụmụ ihe n’agbanyeghị nsogbu o nwere ike ịkpatara ya.

Ịga ọmụmụ ihe ò mere ka nsogbu ya ka njọ? Mbanụ. O nyedịịrị ya aka. Onesmus kwuru, sị: “Ọ na-abụ, m nọrọ n’ọmụmụ ihe, ọ na-adị m ka ahụ́ anaghịzi egbu m mgbu.” O kwuru na ọ bụ ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl mere ka obi na-adịkwu ya mma. Mgbe mama ya chọpụtara na obi na-adịzi ya mma, obi tọrọ ya ezigbo ụtọ, ya ekwetakwa ka ya na Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl. Ọ na-ekwukarị, sị: “Ọ bụ ijere Chineke ozi na-agwọ nwa m.”

N’oge na-adịghị anya, e mere Onesmus onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, mechaakwa mee ya baptizim. Ọ bụ ohu na-eje ozi ugbu a. N’agbanyeghị na ọ naghị aga ije nakwa na ọ naghị eji otu aka ya eme ihe ọ bụla, ọ chọrọ iji ike ya niile na-ejere Jehova ozi. O nwere mgbe ọ chọrọ ịsụ ụzọ inyeaka, ma ụjọ ana-atụ ya itinye akwụkwọ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na ọ ma na ọ bụ onye ọzọ ga na-akwagharị ya n’ígwè ndị ngwọrọ ya. Mgbe ọ kọọrọ ya ụmụnna, ha kwere ya nkwa na ha ga na-akwado ya. Ha mere otú ahụ ma nyere ya aka, ya asụọ ụzọ inyeaka.

Mgbe Onesmus chọrọ ịghọ ọsụ ụzọ oge niile, ụjọ ekweghịkwa ya tinye akwụkwọ. Ma, otu ụbọchị ọ gụchara ihe mmụta dịịrị ụbọchị, ọ gbara ya ume. Ihe mmụta dịịrị ụbọchị ahụ si n’Abụ Ọma 34:8. Ebe ahụ sịrị: “Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.” Onesmus chebaara amaokwu ahụ echiche, kpebie ịghọ ọsụ ụzọ oge niile. Ọ na-ejizi ụbọchị anọ aga ozi ọma n’izu ọ bụla. Ọ na-amụkwara ọtụtụ ndị Baịbụl, ha ana-eme nke ọma. Ọ gara Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ n’afọ 2010. Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ na otu n’ime ndị kụziiri ha ihe n’ụlọ akwụkwọ ahụ so na mmadụ abụọ ahụ bịara zie ya ozi ọma.

Papa Onesmus na mama ya anwụọla, ma ụmụnna na-egboro ya mkpa ya. Obi dị ya ụtọ maka ihe ọma niile Chineke na-emere ya ugbu a. Ọ na-atụkwa anya mgbe ọ na-enweghị onye ga-asị: “Ana m arịa ọrịa.”—Aịza. 33:24.