Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Nyere Nwa Gị Nwaanyị Aka

Nyere Nwa Gị Nwaanyị Aka

GỊNỊ BỤ NSOGBU?

Ka e were ya na nwa gị nwaanyị dị afọ iri na atọ gwara gị na ike ụwa agwụla ya. Gị ekwuo n’obi gị, ‘Ọ̀ dịkwanụ afọ ole ike ụwa na-agwụrụ ya?’ Ma, tupu gị agwa ya ihe dị gị n’obi, ka anyị kwugodị ihe ndị nwere ike ime ka ike ụwa gwụ nwa gị nwaanyị ka na-eto eto.

IHE MERE IKE JI AGWỤ YA

Ọ ghọwala nwaanyị. Otú ahụ́ nwa gị si agbanwe nwere ike ime ka ọ na-echegbu onwe ya. Ọ na-aka njọ ma ọ bụrụ na ndị ọgbọ ya etokarịala ya ma ọ bụ na yanwa etokarịala ha. E nwere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ngọzi. * Ọ dị afọ iri abụọ ugbu a. Ọ sịrị: “Ná ndị ọgbọ m, eso m ná ndị mbụ yiwere uwe ara. Ọ na-emecha m ihere mgbe ahụ.”

Obi na-ajọ ya njọ. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Amaka kwuru, sị: “Obi na-adị m ụtọ ma chi bọọ. Ma chi jihaala, iwe eju m obi, mụ ana-ebe sọọsọ ákwá. Ihe a niile na-eme m obi ọjọọ. Amaghị m ihe na-eme m eme. Obere ihe mehaala m, iwe abịa m.”

O bidola ịhụ nsọ ya. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Chinwe kwuru, sị: “Mama m gwara m ihe m nwere ike ịhụ ma m malite ịhụ nsọ m, ma otú o si malite tụrụ m n’anya. M na-asa ahụ́ ọtụtụ ugboro n’ụbọchị n’ihi na ọ na-adị m ka m̀ na-esi ísì. Nke ka njọ bụ na ụmụnne m ndị tọrọ m ji m na-eme ihe ọchị.”

Ndị ọgbọ ya na-enye ya nsogbu. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Nwanneka kwuru, sị: “Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na atọ, ndị ọgbọ m na-enyesi m nsogbu ike ka m mewe ihe ha chọrọ. Ụmụ akwụkwọ anyị na-emesi onye ọ bụla gbapụrụ iche ike.” Nwa agbọghọ ọzọ dị afọ iri na anọ aha ya bụ Uchechi sịrị, “Ndị ọgbọ m na-achọ ka ha na ụmụ akwụkwọ ibe ha na-akpakọrịta. Obi anaghị adị ha mma ma ha gbapụ iche.”

 IHE I NWERE IKE IME

Gbaa nwa gị ume ka o kwuo ihe na-enye ya nsogbu. O nwere ike ọ gaghị adịrị ya mfe ịgwa gị ihe bụ nsogbu ya. Nweere ya ndidi. Cheta na Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ịbụ ndị na-anụ ihe ngwa ngwa nakwa ndị na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa.—Jems 1:19.

Ejila ihe ọ gwara gị egwu egwu. Cheta na ọ matabeghị ihe ị ma nakwa na o nwebeghị ihe ọ hụrụ ná ndụ. Ọ mụtabeghịkwa ihe ọ ga-eme ma o nwee nsogbu.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Rom 15:1.

Enyela ya ọtụtụ ọrụ. Otu akwụkwọ e dere banyere ụmụaka kwuru na ike ụwa na-agwụkarị ụmụaka ndị papa ha na mama ha na-enye ọtụtụ ọrụ. Oge ụfọdụ isi na-awakarị ha ma ọ bụ afọ ana-ata ha.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Filipaị 1:9, 10.

Hụ na ọ na-arahụ ụra nke ọma. Ndị na-eto eto anaghị ehikarị ụra. Ọ bụrụ na nwa gị anaghị ehi ụra nke ọma, ụbụrụ ya agaghị na-aghọ nkọ, ike ụwa ga na-agwụkwa ya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ekliziastis 4:6.

Nyere ya aka ka o megawa ahụ́. Ọ na-abụ ụfọdụ ụmụ agbọghọ megaa ahụ́, ahụ́ eruo ha ala. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na mmega ahụ́ bara uru. (1 Timoti 4:8) Ihe ụfọdụ ụmụ agbọghọ na-eme ka obi ruo ha ala ma iwe bịa ha bụ ide otú obi dị ha n’akwụkwọ. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na abụọ aha ya bụ Nneọma sịrị, “Mgbe m dị obere, e nwee nsogbu ọ bụla m na-amaghị otú m ga-eme ya, mụ edee ya n’akwụkwọ. Ime otú ahụ nyeere m aka ịghọta otú obi dị m ma nsogbu ọ bụla bịara m, ọ na-emekwa ka m mara ihe m ga-eme.”

Na-eme ihe ị chọrọ ka nwa gị na-eme. Gịnị ka ị na-eme ma i nwee nsogbu? Ị̀ na-achịju ọrụ aka, e mechaa ahụ́ agaghịzi eru gị ala maka na ị ga-achọ imecha ha niile? Ị̀ na-arụgbu onwe gị n’ọrụ, nke mere na ị naghị elebara ihe ndị ka mkpa ná ndụ anya? Ndị Filipaị 4:5 kwuru, sị: “Meenụ ka mmadụ niile mara na unu nwere ezi uche.” Chetakwa na nwa gị na-ahụ ihe ị na-eme, ma ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ.

^ para. 6 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.