Gaa n'Isiokwu

Onye Kraịst Ò Nwere Ike Ịga Ụlọ Ọgwụ Ma Ọ Bụ Ṅụọ Ọgwụ Ma Ọ Rịawa Ọrịa?

Onye Kraịst Ò Nwere Ike Ịga Ụlọ Ọgwụ Ma Ọ Bụ Ṅụọ Ọgwụ Ma Ọ Rịawa Ọrịa?

Ihe Baịbụl Kwuru

 Ee. Jizọs sịrị na “mkpa ọgwọ ọrịa adịghị ndị ahụ́ dị mma, kama mkpa ya dị ndị ahụ́ na-enye nsogbu.” Ihe a Jizọs kwuru gosiri na o nweghị ihe o mere ma ndị na-eso ụzọ ya chọọ otú ha ga-esi agwọ onwe ha ma ha rịawa ọrịa. (Matiu 9:12) Ọ bụ eziokwu na Baịbụl abụghị akwụkwọ na-ekwu otú e si agwọ ọrịa, ma o kwuru ihe ndị ga-enyere onye chọrọ ime uche Chineke aka ma ahụ́ rịawa ya.

Ajụjụ ndị ị ga-ajụ onwe gị

 1. M̀ ma otú a chọrọ isi agwọ m ọrịa? Baịbụl sị ka anyị gbalịa na-achọpụta nke bụ́ eziokwu kama ‘ịna-ekweta okwu niile.’—Ilu 14:15.

 2. M̀ kwesịrị ịmata ihe ndị dọkịta ndị ọzọ kwuru gbasara otú a chọrọ isi agwọ m ọrịa? Inwe “ọtụtụ ndị ndụmọdụ” ga-abara gị uru, karịchaa, ma ọ bụrụ na ọrịa na-arịa gị abụghị obere ọrịa.—Ilu 15:22.

 3. Otú a chọrọ isi agwọ m ọrịa a ọ̀ ga-eme ka m mebie iwu Chineke nyere ka anyị “na-ezere . . . ọbara”?—Ọrụ Ndịozi 15:20.

 4. À ga-eme mgbaasị tupu a chọpụta ihe na-arịa m ma ọ bụ gwọọ m? Baịbụl katọrọ “ime mgbaasị.” (Ndị Galeshia 5:19-21) Lee ajụjụ ndị ị ga-ajụ onwe gị iji mara ma à ga-eme mgbaasị:

  •   Onye a chọrọ ịgwọ m ọ̀ na-eme mgbaasị?

  •   Onye a chọrọ ịgwọ m ò kweere na ọrịa ndị mmadụ na-arịa bụ ihe e mere ha eme ma ọ bụkwanụ ọrịa arụsị ha mejọrọ mere ha?

  •   O mewe m ọgwụ, ọ̀ ga-achụ àjà, na-agwa ndị mmụọ okwu, ma ọ bụ mee ụdị mgbaasị ndị ọzọ?

 5. M̀ na-echezi banyere ahụ́ ike m karịa otú o kwesịrị? Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘mee ka mmadụ niile mara na anyị nwere ezi uche.’ (Ndị Filipaị 4:5) Inwe ezi uche ga-enyere gị aka ilekwasị anya ‘n’ihe ndị ka mkpa,’ dị ka ihe ndị gbasara ofufe Jehova.—Ndị Filipaị 1:10; Matiu 5:3.