Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Ahụ́ Na-adịghị Na-aka Agbake Ọsịịsọ

Ndịàmà Jehova Ahụ́ Na-adịghị Na-aka Agbake Ọsịịsọ

AKỤKỌ SI ỌSTRELIA: Akwụkwọ a na-akpọ The Sydney Morning Herald nke Ọktoba 2, afọ 2012, kwuru sị: “Ndịàmà Jehova na-ekweghị ka a mịnye ha ọbara n’ihi ihe ha kweere na-aka agbake ngwa ngwa karịa ndị ọrịa ndị ọzọ.”

Akwụkwọ ahụ kwughachiri ihe prọfesọ James Isbister kwuru. Prọfesọ a na-arụ na Sydney Medical School, nke dị na Mahadum Sidni. Akwụkwọ ahụ kwuru na “Prọfesọ Isbister sịrị na ndị dọkịta na-aka agwọ Ndịàmà Jehova nke ọma n’ihi na ha na-agbalị ime ka ọbara ha [ya bụ, Ndịàmà Jehova ha na-agwọ] ghara ịgbafusị. Ọ bụ ya mere na ha anaghị anwụkarị n’ọrịa, ha anaghịkwa anọte aka n’ụlọ ọgwụ ma a wachaa ha ahụ́, ma e jiri ha tụnyere ndị nke a mịnyere ọbara mgbe a na-awa ha ahụ́.”

Ọ bụghị naanị Isbister kwutụrụla ụdị ihe a. Akwụkwọ a na-akpọ Archives of Internal Medicine, nke Ọgọst 13-27, afọ 2012, kwuru gbasara Ndịàmà Jehova a wara obi, sị: “Ndịàmà Jehova anaghị enwekarị nsogbu ma a wachaa ha obi, ha na-anọkwa obere oge n’ụlọ ọgwụ, ma e jiri ha tụnyere ndị ọzọ a mịnyere ọbara mgbe a na-awa ha obi.”