Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Ezigbo Ọrịa Ji Gị

Mgbe Ezigbo Ọrịa Ji Gị

Otu nwaanyị aha ya bụ Linda, dị iri afọ asaa na otu, kwuru, sị: “Mgbe dọkịta gwara m na m nwere ọrịa kansa n’akpa ume na n’eriri afọ, m sịrị onwe m na nke a bụzinụ ọnwụ. Ma, mgbe m laruru, m gwara onwe m, sị, ‘Ihe a abụghị ihe m tụrụ anya ya, ma m ga-achọ otú m ga-esi na-edi ya.’”

Otu nwaanyị dị afọ iri anọ na itoolu aha ya bụ Elise kwuru, sị: “M na-arịa ọrịa akwara. Ọ na-eme ka akụkụ ihu m ebe aka ekpe na-egbu m ezigbo mgbu. Mgbe ụfọdụ, mgbu ọ na-egbu m na-eme ka ike ụwa gwụ m. Ọtụtụ mgbe, ọ na-adị m ka ụwa nke m ọ̀ ka njọ, mụ echewedị echiche igbu onwe m.”

Ọ BỤRỤ na o nweela mgbe a gwara gị na ị na-arịa ọrịa nwere ike igbu gị ma ọ bụkwanụ na onye nke gị na-arịa ọrịa nwere ike igbu ya, ị ga-ama na ọ na-agbawa obi. E wezụga ọrịa ahụ, obere ihe nwere ike ịkpasu onye ahụ ahụ́ na-adịghị ma ọ bụ ndị ezinụlọ ya iwe ma ọ bụkwanụ mee ka ha chegbuwe onwe ha. Ihe ndị nwere ike ime ka ụjọ na nchegbu ha kakwuo njọ bụ ịgaghachi n’ụlọ ọgwụ ọtụtụ mgbe, ego ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ nwere ike ime ka ịgwọ onye ahụ sie ike, ma ọ bụkwanụ nsogbu ndị ọgwụ nwere ike ịkpatara onye ahụ. Nchegbu ya na ọrịa so aga abụghị obere ihe.

Olee ihe nwere ike inyere anyị aka? Ọtụtụ ndị achọpụtala na ikpe ekpere na ịgụ Baịbụl enyerela ha ezigbo aka. Ndị ezinụlọ mmadụ na ndị enyi ya nwekwara ike inyere ya aka.

IHE NYEERE ỤFỌDỤ NDỊ AKA

Otu nwoke dị iri afọ ise na asatọ aha ya bụ Robert kwuru, sị: “Tụkwasị Chineke obi, ọ ga-enyere gị aka idi ọrịa ị na-arịa. Na-ekpe ekpere, na-akọrọ Jehova otú obi dị gị. Rịọ ya ka o nye gị mmụọ nsọ ya. Rịọkwa ya ka o nyere gị aka ka i nwee ike idi ọrịa ị na-arịa, ka obi ghara ikoro ndị ezinụlọ unu.”

Robert kwukwara, sị: “Ọ na-aba ezigbo uru ma ndị ezinụlọ gị nyere gị aka. Kwa ụbọchị, otu onye ma ọ bụ abụọ n’ime ndị ezinụlọ anyị na-akpọ m n’ekwentị jụọ m otú m mere. Ndị enyi m nọ ebe dị iche iche na-agbakwa m ume. N’eziokwu, ihe a ha mere nyeere m aka inweta onwe m, ike ụwa agharakwa ịgwụ m.”

Ọ bụrụ na ị gaa ileta onye na-arịa ọrịa, ihe Linda kwuru ga-enyere gị aka. Ọ sịrị: “Nke bụ́ eziokwu bụ na onye na-arịa ọrịa na-achọ ibi ndụ ka ndị ọzọ, o nwekwara ike ọ gaghị amasị ya ịna-ekwu gbasara ọrịa ya mgbe niile. N’ihi ya, hapụ ikwu gbasara ọrịa ya ahụ, kwuwe gbasara ihe ndị ọzọ.”

Ọ bụrụgodị na ezigbo ọrịa na-akpa anyị aka ọjọọ, aka Chineke na-enyere anyị, ihe ndị na-akasi obi anyị na-agụta na Baịbụl, nakwa aka ndị ezinụlọ na ndị enyi anyị na-enyere anyị ga-eme ka obi sie anyị ike na anyị ka ga-enweli obi ụtọ ná ndụ.