Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE GA-ENYERE GỊ AKA IBELATA NCHEGBU

Ihe Ị Ga-eme ma I Chegbuwe Onwe Gị

Ihe Ị Ga-eme ma I Chegbuwe Onwe Gị

Ọ bụrụ na ị chọghị ịna-echegbukarị onwe gị, i kwesịrị iche echiche gbasara otú ahụ́ ga-esi esi gị ike, otú gị na ndị ọzọ si emekọrịta ihe, ihe ndị ị chọrọ iji ndụ gị eme, na ihe ndị kacha gị mkpa ná ndụ. Isiokwu a ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-eme ma i chegbuwe onwe gị, nakwa otú i nwere ike isi belata nchegbu.

Echegbula Onwe Gị Maka Echi

“Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na a ga-enwe ihe unu ga-eche banyere ya echi.”​—MATIU 6:34.

Ihe Ọ Pụtara: Ọ dịghị njọ mmadụ iche maka ụbọchị nke ọ bụla. Ma, i kwesịghị iwere nsogbu nke echi tinye na nke taa n’ihi na ọ ga-eme ka i chegbuwe onwe gị. Gbalịa ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị maka echi.

  • Ichegbu onwe gị maka echi nwere ike ime ka obi koro gị n’elu. N’ihi ya, megodị ihe a: Nke mbụ, buru n’obi na onye ọ bụla dị ndụ ga-enwerịrị ihe ga-eche ya uche. Ma, ichegbuwe onwe gị maka ihe ndị ị na-enweghị ike ime ihe ọ bụla gbasara ha nwere ike ime ka obi koro gị n’elu. Nke abụọ, cheta na ọ bụghị mgbe niile ka ihe anyị na-atụ ụjọ ya na-emecha mee.

Atụla Anya na Ị Ga-emetacha Ihe Niile

‘‘Amamihe nke si n’eluigwe na-eme ka mmadụ na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.’​—JEMS 3:17.

Ihe Ọ Pụtara: Atụkwala anya na gịnwa ma ọ bụ ndị ọzọ ga na-emetecha ihe niile. Atụkwala anya ime ihe ị na-agaghị emeli ma ọ bụ ka ndị ọzọ mee ihe ha na-agaghị emeli.

  • Mara ebe ike gị ruru, na-atụ anya ime ihe ndị ị ga-emeli, marakwa ihe gịnwa ma ọ bụ ndị ọzọ na-agaghị emeli. I mee ihe a, ọ ga-eme ka gị na ndị gị na ha na-emekọ ihe ghara ịna-echegbu onwe unu, meekwa ka unu na-emekwu nke ọma. Na-achịtụ ọchị, na-akpakwa ndị ọzọ ọchị. Ị chịa ọchị, ma mgbe ihe na-agachaghị nke ọma, ọ ga-eme ka iwe ghara ịna-ewekarị gị, obi ana-atọkwa gị ụtọ.

Mara Ihe Ndị Na-akpatara Gị Nchegbu

‘Onye na-aghọta ihe na-anọ jụụ.’​—ILU 17:27.

Ihe Ọ Pụtara: Obi ikoro gị n’elu nwere ike ime ka ị ghara iche echiche nke ọma. N’ihi ya, gbalịa na-anọ jụụ.

  • Mara ihe ndị na-akpatara gị nchegbu, matakwa ihe ị na-eme ma ha mee. Dị ka ihe atụ, i chegbuwe onwe gị, gbalịa chọpụta ụdị ihe na-echegbu gị, otú obi dị gị, na àgwà ị na-akpa n’ihi ihe ahụ. I nwedịrị ike ide ha ede. Ọ bụrụ na ị chọpụta ihe ndị a, o nwere ike inyere gị aka ịma ihe ị ga-eme iji belata nchegbu gị. Cheekwa ihe ndị i nwere ike ime iji wepụ ihe ndị na-akpatara gị nchegbu. Ọ bụrụ na ị gaghị ewepụli ha, gbalịa belata nsogbu ha na-akpatara gị. I nwere ike ịchọ ụzọ ka mma ị ga-esi eme ihe ndị ị na-eme ma ọ bụ ịchọ oge ka mma ị ga-eji eme ha.

  • Gbalịa isi n’ụzọ ọzọ lee ihe merenụ anya. Ihe na-echegbu gị nwere ike ọ gaghị echegbu onye ọzọ. Ihe mere o ji echegbu gị nwere ike ịbụ otú i si ele ihe anya. Chebara aro atọ a echiche:

    1. Adịla ngwa ikpebi na mmadụ bu ihe ọjọọ n’obi mee ihe o mere. Mmadụ nwere ike ịgafe gị n’ebe ị kwụ n’ahịrị, gaa nọrọ gị n’ihu. Ọ bụrụ na i were ya na ihe a o mere jọgburu onwe ya, o nwere ike ime ka iwe jide gị. Kama iwewe iwe, ọ ga-aka mma ma i were ya na e nwere ezigbo ihe mere o ji mee ya. N’eziokwu, e nwere ike inwe.

    2. Na-ahụ ihe ọma n’ihe ọ bụla merenụ. Ọ bụrụ na ị ga-anọ ogologo oge n’ebe ị na-eche dọkịta ma ọ bụ n’ọdụ ụgbọelu, oge ahụ i ji na-eche agaghị ewutecha gị ma i jiri ya na-agụ akwụkwọ ma ọ bụ iimel gị.

    3. Buru ihe ga-emecha mee n’obi. Jụọ onwe gị, sị, ‘Nsogbu a ọ̀ ga-aka njọ echi ma ọ bụ n’izu na-abịa abịa?’ Mara nsogbu ndị nke na-esighị ike na ndị nke siri oké ike.

Gbalịa Na-ahazi Ihe Ahazi

“Na-emenụ ihe niile otú kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro.”​—1 NDỊ KỌRỊNT 14:40.

Ihe Ọ Pụtara: Gbalịa na-ahazi ihe ndị ị na-eme ná ndụ gị ahazi.

  • Ịhazi ihe ahazị na-adị anyị mma. Otu ihe nwere ike iso akpata ahazighị ihe ahazi nakwa nchegbu bụ ịna-eyigharị ihe a chọrọ ime. O nwekwara ike ime ka anyị nwee ọtụtụ ọrụ anyị na-arụchaghị arụcha. Ọ ga-adị mma ma i mee ihe abụọ a:

    1. Nwee ebe i depụtara ihe ndị ị chọrọ ime, gbalịakwa na-eme ha.

    2. Chọpụta ihe ndị na-eme ka ị na-eyigharị ihe ị chọrọ ime, gbalịakwa mee ihe banyere ha.

Arụgbula Onwe Gị n’Ọrụ

“Mmadụ izurutụ ike dị mma karịa mmadụ ịrụgbu onwe ya n’ọrụ na ịchụ ifufe.”​—EKLIZIASTIS 4:6.

Ihe Ọ Pụtara: Ndị na-arụgbu onwe ha n’ọrụ nwere ike ịnapụ onwe ha uru ha kwesịrị irite n’ọrụ ha na-arụ. O nwere ike ha agaghịzi enwe oge na ume ha ga-eji nụ ụtọ ihe ndị ha rụtara.

  • Na-ele ọrụ na ego anya otú kwesịrị ekwesị. Mmadụ inwekwu ego apụtaghị na ọ ga-enwekwu obi ụtọ ma ọ bụkwanụ na nchegbu ya ga-ebelata. Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ inwetakwu ego nwere ike ịkpatakwuru ya obi ọjọọ na nchegbu. Ekliziastis 5:12 kwuru na “ọtụtụ ihe ọgaranya nwere anaghị ekwe ya rahụ ụra.” N’ihi ya, gbalịa na-ekowe akpa gị ebe aka gị ga-eru.

  • Wepụta oge na-ezu ike. Ime ihe ndị na-amasị gị ga-eme ka nchegbu gị belata. Mana, o nwere ike ihe ndị e ji atụrụ ndụ ndị na-eme ka mmadụ nọrọ otu ebe, dị ka ile tiivi, agaghị enyecha aka.

  • Na-ahapụtụ ekwentị na ihe ndị yiri ya. Anọla na-agụ ozi iimel, ozi ekwentị, na ozi ndị na-abịara gị n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet mgbe niile. Agụla ozi iimel ndị e ziteere gị gbasara ọrụ n’oge ị na-anọghị n’ọrụ, ọ gwụkwala ma ọ̀ dị ezigbo mkpa.

Na-elekọta Ahụ́ Gị

“Mmadụ ịzụ ahụ́ ya bara . . . uru.”​—1 TIMOTI 4:8.

Ihe Ọ Pụtara: Imega ahụ́ mgbe niile na-eme ka ahụ́ gbasie mmadụ ike.

  • Na-eme ihe ndị ga-eme ka ahụ́ gbasie gị ike. Mmega ahụ́ nwere ike ime ka obi na-adị gị mma ma mee ka nchegbu gị belata. Na-eri nri ndị na-edozi ahụ́, ahapụkwala iri nri mgbe i kwesịrị iri ya. Na-ezu ike nke ọma.

  • Ejikwala ihe ndị nwere ike imerụ gị ahụ́ achọ ịgbara nchegbu ọsọ, dị ka ịṅụ sịga, ịṅụ ọgwụ ike, na ịṅụ oké mmanya. Ha ga-emecha mee ka nchegbu gị ka njọ n’ihi na ha nwere ike ịkpatara gị ọrịa, richaakwa ego ị tara ahụhụ kpata.

  • Ọ bụrụ na nchegbu gị karịziri akarị, gaa hụ dọkịta. Ekwela ka ihere gbochie gị ịga ka dọkịta nyere gị aka.

Na-ebu Ụzọ Eme Ihe Ndị Ka Mkpa

“Na-achọpụta ihe ndị ka mkpa.”​—NDỊ FILIPAỊ 1:10.

Ihe Ọ Pụtara: Leruo ihe ndị i weere ka ihe kacha mkpa anya.

  • Depụta ihe ndị i nwere ime n’usoro. Ọ ga-eme ka ị mara ndị ị ga-ebu ụzọ eme, ndị ị ga-ahapụtụgodị, ndị nke ị ga-enyefe onye ọzọ, ma ọ bụdị ndị nke ị ga-ahapụ kpamkpam.

  • N’ime otu izu, depụta ihe ndị i ji oge gị mee. Gbalịzie chọpụta otú ị ga-esi jiri oge gị na-eme ihe bara uru. Ị gbalịa na-eme ya, ọ ga-eme ka nchegbu gị belata.

  • Wepụta oge ị ga-eji na-ezu ike. Iwepụta naanị ntakịrị oge zurutụ ike ga-eme ka i nwetaghachi ume, meekwa ka nchegbu gị belata.

Na-achọ Enyemaka

“Nchegbu na-eme ka ike gwụ mmadụ, ma okwu ọma na-eme ka obi dị ya ụtọ.”​—ILU 12:25.

Ihe Ọ Pụtara: Okwu ọma ndị ọzọ gwara gị nwere ike ime ka obi dị gị mma.

  • Gị na onye ga-aghọta gị nke ọma kwurịta ihe ụfọdụ. Onye ahụ nwere ike inyere gị aka ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị ma ọ bụdị gwa gị ihe ị na-amabughị nwere ike igboro gị mkpa gị. Naanị ịkọrọ onye ahụ ihe ndị a nwedịrị ike ime ka nchegbu gị belata.

  • Gwa ndị ọzọ ka ha nyere gị aka. I nwere ike inyefe ndị ọzọ ọrụ ụfọdụ ma ọ bụ gwa ha ka ha nyere gị aka.

  • Ọ bụrụ na onye gị na ya na-arụ ọrụ na-enye gị nsogbu, chọọ ụzọ ndị ị ga-esi mee ka ihe ka mma. Dị ka ihe atụ, i nwere ike iji akọ gwa ya na ihe ọ na-eme na-ewute gị. (Ilu 17:27) Ọ bụrụ na ime ihe a emeghị ka ihe ka mma, i nwere ike ibelata oge gị na ya ji anọ.

Na-eme Ihe Ndị Gbasara Ofufe Chineke

“Ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha na-enwe obi ụtọ.”​—MATIU 5:3.

Ihe Ọ Pụtara: Ọ bụghị naanị nri, uwe, na ebe obibi dị anyị mkpa. Ihe gbasara ofufe Chineke dịkwa anyị mkpa. Anyị chọọ ịna-enwe obi ụtọ, anyị kwesịrị ịma na ife Chineke dị mkpa, meekwa ihe maka ya.

  • Ekpere ga-enyere gị ezigbo aka. Chineke sị gị ‘na-akọrọ ya ihe niile na-echegbu gị, n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) Ikpe ekpere na ichebara ihe ndị dị mma echiche nwere ike ime ka obi ruo gị ala.​—Ndị Filipaị 4:6, 7.

  • Na-agụ akwụkwọ ndị ga-eme ka ị bịarukwuo Chineke nso. Ihe ndị e dere na magazin a si na Baịbụl, e dekwara Baịbụl iji nyere anyị aka ịbịaru Chineke nso. Ha na-eme ka mmadụ nwee “ezigbo amamihe . . . na-echebakwara ihe echiche nke ọma.” (Ilu 3:21) Jisie ike malite ịgụ Baịbụl. I nwere ike iji akwụkwọ Ilu malite.