Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU TETA A

Ihe Anyị Ga-eme Ka Anyị Ghara Ịna-ebutekarị Ọrịa

Ihe Anyị Ga-eme Ka Anyị Ghara Ịna-ebutekarị Ọrịa

Kwa ụbọchị, ahụ́ anyị na-alụso ọtụtụ ndị iro ọgụ. Ndị iro a anaghị eme mkpọtụ, a naghịkwanụ ahụ ha anya, ma ha nwere ike ịkpatara anyị ọrịa ma ọ bụ gbuo anyị. Ndị iro ndị a bụ nje ndị nwere ike ịbanye anyị n’ahụ́. * Gịnị mere ị naghị ama na ahụ́ gị na-alụso ọtụtụ ihe ọgụ? Ọ bụ n’ihi na ahụ́ gị nwere ihe ndị na-alụso ọrịa ọgụ. Ihe ndị a na-egbochi nje ịbata gị n’ahụ́, ma ọ bụkwanụ gbuo ha tupu ha ebido inye gị nsogbu. Ma mgbe ụfọdụ, nje ndị a na-emeri ahụ́ gị, gị ebidozie rịawa ọrịa. Ihe ị ga-emezi iji mee ka ahụ́ gị nwee ike ịlụso ọrịa ahụ ọgụ bụ ịṅụ ọgwụ ma ọ bụ ịga ụlọ ọgwụ.

Ọtụtụ puku afọ gara aga, ndị mmadụ amaghị ihe ọ bụla gbasara nsogbu ihe ndị dị ndụ a na-anaghị ahụ anya na ihe ndị dị ndụ dị ezigbo ntakịrị nwere ike ịkpatara ha. Ma, n’agbata afọ 1801 na 1900, ndị sayensị chọpụtara na ihe ndị a nwere ike ịkpata ọrịa. Nchọpụta a mere ka anyị mata otú anyị nwere ike isi zere ha. Ndị dọkịta na-eme nnyocha egbochiela ọtụtụ ọrịa, dị ka kịtịkpa na polio, ma ọ bụ belata nsogbu ha na-akpata. Ma n’oge na-adịbeghị anya, ụfọdụ n’ime ọrịa ndị lara ala bịaghachịkwara ọzọ, dị ka ịba anya odo, nakwa ọrịa dengue. Gịnị mere ha ji bịaghachi? Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ihe ndị kpatara ya:

  • Kwa afọ, ọtụtụ nde mmadụ na-eme njem sí n’otu mba banye n’ọzọ. Ka ha na-aga, ha na-ebu nje dị iche iche aga. Otu akwụkwọ aha ya bụ Clinical Infectious Diseases kwuru, sị: “Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ ọrịa niile na-efe efe” ka ndị njem na-esi n’otu mba aga mba ọzọ na-ebu aga.

  • O nwere nje ụfọdụ ọgwụ e jibu egbu ha na-anaghịzi egbu ha. Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike, sịrị: “Ụwa na-abanyezi n’oge ọgwụ na-anaghịzi eme nje ihe ọ bụla. Ọrịa ndị ọ na-enweghị ihe e jibu ha kpọrọ . . . nweziri ike igbu mmadụ.”

  • Ọgba aghara na ịda ogbenye na-emekarị ka mbọ gọọmentị na-agba iji gbochie ọrịa na-akụ afọ n’ala.

  • Ọtụtụ ndị amaghị ihe ndị ha ga-eme iji gbochie ọrịa.

N’agbanyeghị nsogbu ndị a, e nwere ọtụtụ ihe gị na ezinụlọ gị nwere ike ime iji gbochie ọrịa. Ihe ndị a kọwara n’isiokwu ndị na-esonu ga-eme ka ị mata na e nwere ụzọ ndị dị mfe ndị mmadụ, ma ndị bi ná mba ndị na-abaghị ọgaranya, nwere ike isi gbochie ibute ọrịa.

^ para. 3 E nwere ọtụtụ ụmụ irighiri ihe ndị dị ndụ na-anaghị akpata ọrịa. Ma, isiokwu a na isiokwu abụọ na-eso ya ga-eleba anya n’ụmụ irighiri ihe ndị dị ndụ nke na-akpata ọrịa.