Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 2

Ònye Bụ Chineke?

Ònye Bụ Chineke?

1. Gịnị mere anyị ji kwesị ife Chineke?

Ọ bụ Chineke kere ihe niile. O nweghị mmalite, o nweghịkwa ọgwụgwụ. (Abụ Ọma 90:2) Ọ bụ yanwa kwuru ozi ọma ahụ e dere na Baịbụl. (1 Timoti 1:11) Ebe ọ bụ Chineke nyere anyị ndụ, ọ bụ naanị ya ka anyị kwesịrị ife ofufe.​—Gụọ Mkpughe 4:11.

2. Olee ụdị onye Chineke bụ?

Chineke bụ Mmụọ. N’ihi ya, o nweghị onye hụtụrụla ya. Mmụọ karịrị mmadụ, karịakwa ihe ọ bụla ọzọ dị ndụ n’ụwa. (Jọn 1:18; 4:24) Ma, ọ bụrụ na anyị eleruo ihe ndị Chineke kere eke anya, anyị nwere ike ịmata àgwà ya ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, mkpụrụ osisi na okooko osisi dị iche iche o kere gosiri na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, nweekwa amamihe. Otú eluigwe na ala si buo ibu na-egosikwa na Chineke nwere ike na-enweghị atụ.​—Gụọ Ndị Rom 1:20.

Anyị nwekwara ike ịmatakwu àgwà Chineke ma anyị gụọ Baịbụl. Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara anyị ihe na-amasị Chineke na ihe na-anaghị amasị ya, gwakwa anyị otú o si emeso ndị mmadụ. Ọ gwakwara anyị otú obi na-adị ya ma ụmụ mmadụ mee ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ.​—Gụọ Abụ Ọma 103:7-10.

3. Chineke ò nwere aha?

Jizọs sịrị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” (Matiu 6:9) Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ aha a na-etu Chineke, o nwere naanị otu aha. Asụsụ ọ bụla nwekwara otú ha si akpọ ya. N’Igbo, a na-akpọ ya “Jehova.” Ma, e nwekwara ndị na-akpọ ya “Yahweh.”​—Gụọ Abụ Ọma 83:18.

N’ọtụtụ Baịbụl e nwere ugbu a, e wepụla aha ahụ bụ́ Jehova ma jiri Onyenwe anyị ma ọ bụ Chineke dochie ya. Ma, mgbe e dere Baịbụl, aha Chineke pụtara na ya ihe dị ka ugboro puku asaa. Mgbe Jizọs na-akụziri ndị mmadụ Okwu Chineke, o mere ka ha mara aha Chineke.​—Gụọ Jọn 17:26.

Lee vidio bụ́ Chineke Ò Nwere Aha?

4. Ihe banyere anyị ọ̀ na-emetụ Jehova n’obi?

Otú a ọrịa nwatakịrị a na-arịa si emetụ papa ya n’ahụ́ ka ahụhụ anyị na-ata si emetụ Chineke n’ahụ́

Ahụhụ juru ebe niile taa ọ̀ na-egosi na ihe banyere anyị anaghị emetụ Chineke n’obi? Ụfọdụ ndị na-asị na Chineke na-ata anyị ahụhụ iji lee ma okwukwe anyị ò siri ike. Ma ihe a ha na-ekwu abụghị eziokwu.​—Gụọ Jems 1:13.

Chineke nyere anyị ohere ka anyị jiri aka anyị kpebie ma ànyị ga-efe ya. Ohere a o nyere anyị gosiri na ọ na-akwanyere anyị ùgwù. N’eziokwu, anyị nwere obi ụtọ na Chineke kwanyeere anyị ụdị ùgwù a. (Jọshụa 24:15) Ma, ọtụtụ ndị na-ekpebi ime ibe ha ihe ọjọọ, ọ bụ ya mere ahụhụ ji ju ebe niile taa. Ihe a ha na-eme na-ewute Jehova.​—Gụọ Jenesis 6:5, 6.

Ihe gbasara anyị na-emetụ Jehova n’obi. Ọ chọrọ ka anyị nwee obi ụtọ ná ndụ. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-ewepụ ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata, wepụkwa ndị na-akpata ya. Ma, e nwere ezigbo ihe mere o ji gbagodị nkịtị ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ. Anyị ga-amata ihe ahụ n’Isi nke Asatọ.​—Gụọ 2 Pita 2:9; 3:7, 13.

5. Olee otú anyị ga-esi bịarukwuo Chineke nso?

Jehova gwara anyị ka anyị bịaruo ya nso. Otu ụzọ anyị ga-esi eme ya bụ ịna-ekpegara ya ekpere. Chineke nwere mmasị n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ. (Abụ Ọma 65:2; 145:18) Ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị. Ọ bụ eziokwu na anyị na-emehie ya mgbe ụfọdụ, ọ ma na anyị na-agba mbọ ime ihe dị ya mma. N’ihi ya, anyị na Chineke nwere ike ịdị n’ezigbo mma n’agbanyeghị na anyị ezughị okè.​—Gụọ Abụ Ọma 103:12-14; Jems 4:8.

Ebe ọ bụ Jehova nyere anyị ndụ, anyị kwesịrị ịhụ ya n’anya karịa onye ọ bụla ọzọ. (Mak 12:30) Ọ bụrụ na ị na-amụ Baịbụl ma na-eme ihe Chineke gwara gị mee, o gosiri na ị hụrụ ya n’anya. Ọ ga-emekwa ka gị na ya dịrịkwuo ná mma.​—Gụọ 1 Timoti 2:4; 1 Jọn 5:3.