Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 7

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

1. Gịnị bụ Alaeze Chineke?

Gịnị mere Jizọs ji bụrụ Eze na-enweghị atụ?​—MAK 1:40-42.

Alaeze Chineke bụ ọchịchị ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa. Ọ ga-anọchi ọchịchị niile e nwere n’ụwa. Ọ ga-eme ka uche Chineke mezuo ma n’eluigwe ma n’ụwa. Obi dị anyị ụtọ ịma na Chineke ga-eji Alaeze ya mee ihe a niile. N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ ihe niile ha chọrọ ka ezigbote ọchịchị meere ha. Ọ ga-eme ka mmadụ niile bi n’ụwa dịrị n’otu.​—Gụọ Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10; 24:14.

Alaeze ọ bụla nwere eze na-achị ya. Jehova họpụtara Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ka ọ bụrụ Eze nke Alaeze Ya.​—Gụọ Mkpughe 11:15.

Lee vidio bụ́ Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

2. Gịnị mere Jizọs ji bụrụ Eze na-enweghị atụ?

Ihe mere Ọkpara Chineke ji bụrụ Eze na-enweghị atụ bụ na ọ dị obiọma, ọ naghịkwa akwado ihe ọjọọ. (Matiu 11:28-30) Ihe ọzọ bụ na ọ dị ike. Ọ ga-eji ike ya nyere ụmụ mmadụ aka ma ọ chịwa ụwa. Mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, ọ laghachiri n’eluigwe ma nọdụ ala n’aka nri Jehova, na-eche ka e chie ya eze. (Ndị Hibru 10:12, 13) Chineke mechakwara chie ya Eze.​—Gụọ Daniel 7:13, 14.

3. Ole ndị ka ha na Jizọs ga-eso achị?

Jizọs na ndị Baịbụl kpọrọ “ndị nsọ” ga-anọ n’eluigwe na-achị. (Daniel 7:27) Ndị mbụ a họọrọ ka ha soro ná ndị nsọ a bụ ndịozi Jizọs, ndị rubeere Chineke isi. Kemgbe ahụ, Jehova ka na-ahọrọ ndị nwoke na ndị nwaanyị, ndị na-erubere ya isi, ka ha soro ná ndị a a kpọrọ ndị nsọ. Otú ahụ Jizọs ghọrọ mmụọ mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ ka ndị nsọ ahụ na-aghọkwa mmụọ ma a kpọlite ha n’ọnwụ.​—Gụọ Jọn 14:1-3; 1 Ndị Kọrịnt 15:42-44.

Mmadụ ole ga-aga eluigwe? Jizọs kpọrọ ndị ahụ ga-aga eluigwe “ìgwè atụrụ nta.” (Luk 12:32) Ha ga-emecha dịrị otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ. Ọ bụ ha na Jizọs ga-achị ụwa.​—Gụọ Mkpughe 14:1.

4. Gịnị mere mgbe Jizọs malitere ịchị n’eluigwe?

Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914. * Ihe mbụ Jizọs mere mgbe ọ ghọrọ eze bụ ịchụdata Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa. Ihe ahụ o mere were Setan ezigbo iwe, ya ebido ịkpata ọgba aghara n’ụwa. (Mkpughe 12:7-10, 12) Kemgbe ahụ, nsogbu ụmụ mmadụ na-enwe akakwuola njọ. Agha, ụkọ nri, ọrịa na-efe efe, na ala ọma jijiji socha n’ihe ndị na-egosi na Alaeze Chineke ga-amalite ịchị ụwa a n’oge na-adịghị anya.​—Gụọ Luk 21:7, 10, 11, 31.

5. Gịnị ka Alaeze Chineke na-eme ugbu a? Gịnịkwa ka ọ ga-eme n’ọdịnihu?

Alaeze Chineke na-eme ka oké ìgwè mmadụ ndị si ná mba dị iche iche dịrị n’otu. Ọ bụ ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa niile ka o ji na-eme ya. Ọtụtụ nde ndị dị nwayọọ n’obi na-erubere Jizọs isi taa. Alaeze Chineke ga-echebe ha mgbe ọ ga-ebibi ndị ajọ omume niile nọ n’ụwa a. N’ihi ya, ndị niile chọrọ ka Alaeze Chineke chịa ha kwesịrị ịna-erubere Jizọs isi ugbu a.​—Gụọ Mkpughe 7:9, 14, 16, 17.

Jizọs ga-achị ụwa otu puku afọ. N’ime otu puku afọ ahụ, ọ ga-eme ihe ahụ Chineke bu n’obi imere ụmụ mmadụ ná mmalite. Ụwa niile ga-aghọ paradaịs. Mgbe otu puku afọ ahụ gwụrụ, Jizọs ga-enyefe Alaeze ahụ n’aka Nna ya. (1 Ndị Kọrịnt 15:24-26) Ò nwere onye ị ma ị ga-akọrọ banyere Alaeze Chineke?​—Gụọ Abụ Ọma 37:10, 11, 29.

 

^ par. 6 Ị chọọ ịmatakwu amụma e buru na Baịbụl gbasara afọ 1914, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?, peeji nke 217.