Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Timoti 2:1-15

  • Ikpe ekpere maka ụdị mmadụ niile (1-7)

    • Otu Chineke na otu onye ogbugbo (5)

    • Ihe dabara adaba a ga-eji agbapụta mmadụ niile (6)

  • Ihe Pọl gwara ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị (8-15)

    • Na-eji ejiji gosiri na ị na-emeru ihe n’ókè (9, 10)

2  Ihe mbụ m na-agwa unu bụ ka unu na-ekpe ekpere maka ụdị mmadụ niile, na-ekele Chineke maka ha, na-arịọsikwa ya arịrịọ ike ka o nyere ha aka.  Na-ekpekwanụ ekpere a maka ndị eze na ndị niile nọ n’ọkwá ukwu,+ ka ahụ́ wee ruo anyị ala, anyị ebirikwa n’udo, jiri obi anyị niile na-efe Chineke.+  Ihe a dị mma n’anya Chineke, Onye Nzọpụta anyị.+ Ọ na-anabatakwa ya.  Ọ bụ uche ya ka a zọpụta ụdị mmadụ niile,+ ka ha marakwa eziokwu nke ọma.  E nwere otu Chineke,+ nweekwa otu onye ogbugbo+ n’etiti Chineke na mmadụ,+ ya bụ, Kraịst Jizọs.+  O ji ndụ ya chụọ àjà, si otú ahụ nye ihe dabara adaba a ga-eji agbapụta mmadụ niile.*+ Ndị mmadụ ga-ekwukwa gbasara ihe a mgbe oge ya ruru.  Chineke họpụtara m ka m na-ezisa ihe a,+ bụrụkwa onyeozi.+ Ọ họpụtakwara m ka m kụziere ndị mba ọzọ gbasara eziokwu a+ nakwa inwe okwukwe na Chineke. Ihe a m na-ekwu bụ eziokwu, ọ bụghị ụgha.  N’ihi ya, achọrọ m ka ọ bụrụ ụmụ nwoke ga na-ekpe ekpere n’ebe niile unu zukọrọ,* na-eweli aka ha dị nsọ elu,+ n’eweghị iwe,+ n’arụghịkwa ibe ha ụka.+  M chọkwara ka ụmụ nwaanyị na-eji ejiji dị mma, nke na-egosi na ha na-emeru ihe n’ókè ma na-ele ihe anya otú dị mma,* ọ bụghị ịkpawa ụdị isi dị iche iche na iji ọlaedo ma ọ bụ nkume pel na-achọ onwe ha mma ma ọ bụkwanụ iyi uwe dị ezigbo oké ọnụ.+ 10  Kama ha kwesịrị ịna-eme ihe dị mma otú ụmụ nwaanyị ndị na-efe Chineke kwesịrị ịna-eme, si otú ahụ na-achọ onwe ha mma.+ 11  Mgbe a na-akụzi ihe, ka ụmụ nwaanyị nọrọ jụụ,* na-erubere ụmụ nwoke isi.+ 12  Enyeghị m nwaanyị ikike izi ihe ma ọ bụ ịchị nwoke, kama ka ọ na-agbachi nkịtị.*+ 13  N’ihi na e bu ụzọ kee Adam tupu e kee Iv.+ 14  Ọ bụghịkwa Adam ka a ghọgburu, kama, ọ bụ Iv ka a ghọgburu kpamkpam,+ ya emebie iwu Chineke. 15  Ma, ịmụ nwa ga-abara nwaanyị uru maka na ọ ga-eme ka ọ ghara ime ihe ọjọọ,+ ma ọ bụrụhaala na o* nwere okwukwe, hụ ndị ọzọ n’anya, dị nsọ, na-elekwa ihe anya otú dị mma.*+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ụdị mmadụ niile.”
Na Grik, “n’ebe niile.”
Ma ọ bụ “na-eche echiche nke ọma.”
Ma ọ bụ “nọrọ nwayọọ.”
Ma ọ bụ “ka ọ na-anọ nwayọọ.”
Na Grik, “ha.”
Ma ọ bụ “na-echekwa echiche nke ọma.”