Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 4

Ònye Bụ Jizọs Kraịst?

Ònye Bụ Jizọs Kraịst?

1. Olee ebe Jizọs si bịa n’ụwa?

Olee ihe mere o ji dịrị ụmụ mmadụ mfe ịbịakwute Jizọs?​—MATIU 11:29; MAK 10:13-16.

Jizọs bụ mmụọ ozi n’eluigwe tupu a mụọ ya n’ụwa. Ọ dịghị ka ụmụ mmadụ. (Jọn 8:23) Ọ bụ onye mbụ Chineke kere tupu o kewe ihe ndị ọzọ. O nyekwaara Chineke aka kee ihe ndị ọzọ niile. Naanị yanwa ka Jehova ji aka ya kee, ọ bụ ya mere Baịbụl ji kpọọ ya Ọkpara Chineke “mụrụ naanị ya.” (Jọn 1:14) Baịbụl kpọkwara ya “Okwu ahụ” n’ihi na ọ bụ Ọnụ Na-ekwuru Chineke.​—Gụọ Ilu 8:22, 23, 30; Ndị Kọlọsi 1:15, 16.

2. Gịnị mere Jizọs ji bịa n’ụwa?

Chineke zitere Ọkpara ya n’ụwa. Otú o si mee ya bụ na o si n’eluigwe bufee ndụ ya n’akpa nwa Meri. Meri bụ nwa agbọghọ na-amaghịkwa nwoke. N’ihi ya, o nweghị mmadụ ga-asị na ya bụ nna Jizọs. (Luk 1:30-35) O nwere ihe atọ mere Jizọs ji bịa n’ụwa: (1) Ka ọ kụziere ụmụ mmadụ eziokwu banyere Chineke. (2) Ka o gosi anyị na mmadụ nwere ike ime uche Chineke n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla. (3) Ka o jiri ndụ ya zuru okè gbapụta ụmụ mmadụ ná mmehie.​—Gụọ Matiu 20:28.

3. Gịnị mere o ji dị mkpa ka a gbapụta anyị?

Ọ bụrụ na e jichiri mmadụ, onye ọzọ abịa kwụọ ụgwọ ka a hapụ ya, a na-akpọ ego ahụ ọ kwụrụ ihe mgbapụta. (Ọpụpụ 21:29, 30) Mgbe Chineke kere mmadụ, o bughị n’obi ka ha na-aka nkà ma ọ bụ na-anwụ anwụ. Olee otú anyị si mara? Chineke gwara Adam na ọ bụrụ na o mee ihe Baịbụl kpọrọ mmehie, ọ ga-anwụ. N’ihi ya, a sị na Adam emehieghị, ọ garaghị anwụ. (Jenesis 2:16, 17; 5:5) Baịbụl sị na ọnwụ si n’aka Adam bata n’ụwa. Ọ bụ otú ahụ ka Adam si bufeere anyị niile bụ́ ụmụ ya mmehie na ọnwụ. Ị manụ na ụgwọ ọrụ mmehie na-akwụ bụ ọnwụ. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka a gbapụta anyị n’ọnwụ Adam bufeere anyị.​—Gụọ Ndị Rom 5:12; 6:23.

Ònye ga-agbapụtali anyị n’aka ọnwụ? Onye ọ bụla n’ime anyị nwụọ, ya akwụọ naanị ụgwọ mmehie nke ya. O nweghị mmadụ ọ bụla na-ezughị okè nwere ike ịkwụ ụgwọ mmehie nke ndị ọzọ.​—Gụọ Abụ Ọma 49:7-9.

4. Gịnị mere Jizọs ji nwụọ?

Jizọs zuru okè, o nweghịkwa mmehie ọ bụla o mere. N’ihi ya, o kwesịghị ịnwụ. Ma, Chineke zitere ya n’ụwa ka ọ bịa nwụọ maka mmehie ụmụ mmadụ. Ọ bụ maka na Chineke hụrụ anyị n’anya mere o ji zite Ọkpara ya ka ọ nwụọ. Jizọs n’onwe ya hụkwara anyị n’anya, ọ bụ ya mere o ji rubere Nna ya isi bịa n’ụwa nwụọ maka anyị.​—Gụọ Jọn 3:16; Ndị Rom 5:18, 19.

Lee vidio bụ́ Gịnị Mere Jizọs Ji Nwụọ?

5. Gịnị ka Jizọs na-eme ugbu a?

Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, ọ gwọrọ ndị ọrịa, kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ ma napụta ndị mmadụ ná nsogbu ha. Ihe ndị ahụ o mere gosiri ihe ọ ga-emere ndị niile na-erubere Chineke isi. (Matiu 15:30, 31; Jọn 5:28) Mgbe Jizọs nwụrụ, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ, Chineke mere ka ọ bụrụghachi mmụọ ozi. (1 Pita 3:18) Ọ nọrọziiri n’aka nri Chineke chere ruo mgbe Jehova nyere ya ikike ka ọ bụrụ Eze ga-achị ụwa niile. (Ndị Hibru 10:12, 13) Jizọs bụ Eze na-achị achị n’eluigwe ugbu a, ndị na-eso ụzọ ya na-ekwusakwa n’ụwa niile na ọ chịwala.​—Gụọ Daniel 7:13, 14; Matiu 24:14.

N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-eji ikike Chineke nyere ya kwụsị ahụhụ niile ụmụ mmadụ na-ata, gbuokwa ndị niile na-akpata ha. Ndị niile nwere okwukwe na Jizọs na-ege ya ntị, ọ bụkwa ha ga-ebi n’ụwa a mgbe ọ ga-aghọ paradaịs.​—Gụọ Abụ Ọma 37:9-11.