Gaa n'Isiokwu

Olee Otú Ndịàmà Jehova na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl?

Olee Otú Ndịàmà Jehova na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl?

 Olee otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl?

 Mmadụ ga na-abịa ka gị na ya na-amụ Baịbụl. Onye ahụ ga-enyere gị aka ịghọta Baịbụl. Unu ga na-eme, unu muchaa otu isiokwu, unu agaa n’ọzọ. Unu ga-eji akwụkwọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi na-amụ ya. Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịmụta isi ihe Baịbụl na-ekwu nakwa otú ihe Baịbụl na-ekwu ga-esi nyere gị aka. Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ, lee vidio a.

 M̀ ga-akwụ ụgwọ tupu a mụwara m Baịbụl?

 Mba. Ndịàmà Jehova na-eme ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Matiu 10:8) Ị gaghịkwa akwụ ụgwọ maka ihe ndị i ji amụ Baịbụl. Ụfọdụ n’ime ha bụ Baịbụl na akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi.

 Ugboro ole ka unu ga na-amụ ihe, nkeji ole ka unu ga-ejikwa na-amụ ya?

 Akwụkwọ ahụ nwere isiokwu iri isii. Ma, ọ bụ gịnwa ga-ekpebi isi ole unu ga na-amụcha mgbe unu na-amụ ihe. Ma, ọtụtụ ndị a na-amụrụ Baịbụl na-ekpebi ịmụcha otu isi ma ọ bụ karịa kwa izu.

 Olee otú m ga-esi malite?

  1.  1. Dejupụta fọm a dị na jw.org iji kwuo ka a bịa mụwara gị Baịbụl. Ihe anyị ga-eji ihe ndị i denyere ebe ahụ gbasara onwe gị mee bụ naanị ihe i ji maka ya denye ha, nke bụ́ ka Onyeàmà Jehova jiri ya chọta gị ka gị na ya mụwa Baịbụl.

  2.  2. Onye gị na ya ga na-amụ Baịbụl ga-achọ gị abịa. Ọ ga-agwa gị ihe ndị ị ga-atụwa anya ịmụta ka unu na-amụ Baịbụl, ọ ga-azakwa ajụjụ ọ bụla i nwere.

  3.  3. Gị na onye gị na ya na-amụ ihe ga-ahazi otú unu ga-esi na-amụ ya. Unu nwere ike na-amụ ihe ihu na ihu ma ọ bụkwanụ unu esi n’ekwentị na-amụ ya. Unu nwekwara ike iji akwụkwọ ozi ma ọ bụ ozi iimel. O nwere ike iwe unu ihe dị ka otu awa iji mụọ ihe. Ma, ọ bụghị iwu. O nwekwara ike ghara iru otu awa ma ọ bụkwanụ ya akarịa ya. Ọ bụ otú oge gị hà ga-ekpebi mgbe unu ga-anọru.

 M̀ nwere ike ibu ụzọ lee otú ọ na-adị tupu mụ amalite?

 Ee. Ọ bụrụ ihe ị chọrọ ime, biko dejupụta fọm a dị na jw.org. Ọ bụrụ na mmadụ abịa ka gị na ya mụwa Baịbụl, gwa onye ahụ na ị ga-achọ ibu ụzọ lee otú ọ na-adị tupu gị amalite ịmụ Baịbụl ka ị mara ma ọ̀ ga-amasị gị. Gị na ya ga-eji broshọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi mụọ ihe ka ị mara ma ọ̀ ga-amasị gị. Broshọ ahụ nwere isiokwu atọ.

 Ọ bụrụ na m kweta ka a mụwara m Baịbụl, ọ̀ pụtara na m ga-abụrịrị Onyeàmà Jehova?

 Mba. Obi na-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ ha na ndị mmadụ ịna-amụ Baịbụl, ma, anyị anaghị amanye ndị anyị na ha na-amụ Baịbụl ka ha bụrụ Ndịàmà Jehova. Kama, anyị na ha na-amụ ihe Baịbụl kwuru, anyị ahapụzie ha ka ha jiri aka ha kpebie ihe ha ga-ekwere.​—1 Pita 3:15.

 M̀ nwere ike iji nsụgharị Baịbụl nke na-amasị m ma anyị na-amụ ihe?

 Ee. I nwere ike ịna-eji nsụgharị Baịbụl ọ bụla dị gị mma. Ọ bụ eziokwu na ọ na-amasị anyị iji Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ amụrụ ndị mmadụ ihe n’ihi na a sụgharịrị ya nke ọma, ọ dịkwa mfe nghọta, ma, anyị ma na ọtụtụ ndị na-achọ ịna-agụ nsụgharị Baịbụl ndị masịrị ha, ndị ha dị mbụ agụ.

 M̀ nwere ike ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa soro anyị ma anyị mụwa Baịbụl?

 Ee. I nwere ike ịkpọ ndị ezinụlọ unu niile ma ọ bụkwanụ ndị enyi gị.

 Ọ bụrụkwanụ na e nweela mgbe mụ na Ndịàmà Jehova mụrụ Baịbụl, m̀ nwere ike ịmalite ya ọzọ?

 Ee. N’eziokwu, otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl ugbu a ga-atọ gị ezigbo ụtọ karịa ka ọ tọburu gị maka na a hazigharịala otú anyị si amụ Baịbụl ka ọ daba n’otú ihe si dịrị n’ụwa ugbu a. E nwekwuola ọtụtụ vidio ndị anyị ga na-ele ma anyị na-amụ ihe, nweekwa ihe ndị ọzọ anyị ga na-akọwa.

 M̀ nwere ike ịna-amụ Baịbụl n’onwe m n’enweghị onye ga-abịa ka mụ na ya na-amụ ya?

 Ee. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị na-achọ ka ha na mmadụ na-amụ Baịbụl, ma, ọ na-aka amasị ụfọdụ ka ha buru ụzọ na-amụtụ ya n’onwe ha. Anyị nwere ihe dị iche iche ga-enyere gị aka ịmụ Baịbụl n’onwe gị. O nweghị nke n’ime ha ị ga-akwụ ụgwọ nweta. Lee ihe ndị ahụ ga-enyere gị aka: