Ozi Ọma Jọn Dere 17:1-26

  • Ekpere ikpeazụ Jizọs kpere mgbe ya na ndịozi ya nọ (1-26)

    • Ịmata Chineke ga-eme ka e nweta ndụ ebighị ebi (3)

    • Ndị Kraịst abụghị nke ụwa (14-16)

    • “Okwu gị bụ eziokwu” (17)

    • ‘Emeela m ka a mara aha gị’ (26)

17  Mgbe Jizọs kwuchara ihe ndị a, o leliri anya n’eluigwe, sị: “Nna, oge eruola. Mee ka ọkpara gị dị ebube, ka ọkpara gị wee mee ka ị dị ebube.+  I nyela ya ikike n’ebe mmadụ* niile nọ,+ ka o wee nye ndị niile i nyere ya+ ndụ ebighị ebi.+  Iji nweta ndụ ebighị ebi,+ ha ga-amata gị,* onye naanị ya bụ ezi Chineke,+ matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.+  Emeela m ka ị dị ebube n’ụwa,+ ebe ọ bụ na arụchaala m ọrụ i nyere m ka m rụọ.+  Ugbu a, Nna, mee ka m nwee ebube n’akụkụ gị, bụ́ ebube m nweburu n’akụkụ gị mgbe ụwa na-adịbeghị.+  “Emeela m ka ndị i si n’ụwa nye m mara aha gị.+ Ha bụ nke gị. Ọ bụ gị nyere m ha, ha na-emekwa ihe i kwuru.*  Ha amarala ugbu a na ihe niile i nyere m si n’aka gị  n’ihi na agwala m ha ihe ndị ị gwara m.+ Ha anabatala ha, ha amarakwala na m bịara ka onye nnọchiteanya gị.+ Ha ekwetala na ọ bụ gị zitere m.+  M na-arịọ arịrịọ maka ha. M na-arịọ, ọ bụghị maka ụwa, kama maka ndị i nyere m n’ihi na ha bụ nke gị. 10  Ihe m niile bụ nke gị, ihe gị bụkwa nke m.+ E meekwala ka m dị ebube n’etiti ha. 11  “Anọghịzi m n’ụwa, ma ha nọ n’ụwa,+ m na-abịakwutekwa gị. Nna dị nsọ, chebe ha+ n’ihi aha gị nke i nyere m, ka ha wee bụrụ otu* otú anyị bụ otu.*+ 12  Mgbe mụ na ha nọ, m na-echebe ha+ n’ihi aha gị nke i nyere m. Echebere m ha. E nweghịkwa otu n’ime ha e bibiri+ ma e wepụ nwa mbibi ahụ,+ ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ wee mezuo.+ 13  Ma ugbu a, m na-abịakwute gị. M na-ekwukwa ihe ndị a n’ụwa ka ha wee nwee ọṅụ m na-enwe ma nwezuo ya enwezuo.+ 14  Agwala m ha okwu gị. Ma ụwa kpọrọ ha asị n’ihi na ha abụghị nke ụwa,+ otú m na-abụghị nke ụwa. 15  “Anaghị m arịọ ka ị kpọpụ ha n’ụwa, kama ka i chebe ha n’ihi ajọ onye ahụ.+ 16  Ha abụghị nke ụwa,+ otú m na-abụghị nke ụwa.+ 17  Jiri eziokwu doo ha nsọ.*+ Okwu gị bụ eziokwu.+ 18  Otú ahụ i zitere m n’ụwa ka m zipụkwara ha n’ụwa.+ 19  M na-edo onwe m nsọ n’ihi ha, ka e wee jirikwa eziokwu doo ha nsọ. 20  “M na-arịọ arịrịọ, ọ bụghị naanị maka ndị a, kamakwa maka ndị ga-enwe okwukwe na m n’ihi okwu ha, 21  ka ha niile wee bụrụ otu+ otú ahụ gịnwa, Nna, na mụnwa dị n’otu, mụ na gị adịrịkwa n’otu,+ ka anyị na ha wee dị n’otu, ka ụwa wee kwere na ọ bụ gị zitere m. 22  Enyela m ha otuto i nyere m, ka ha wee bụrụ otu otú anyị bụ otu.+ 23  Mụ na ha dị n’otu, gịnwa na mụnwa dịkwa n’otu, ka ha wee dịrị n’otu n’eziokwu, ka ụwa wee mara na ọ bụ gị zitere m, marakwa na ị hụrụ ha n’anya otú ị hụrụ m n’anya. 24  Nna, achọrọ m ka ndị i nyere m soro m nọrọ n’ebe m nọ,+ ka ha wee hụ ebube i nyere m n’ihi na ị hụrụ m n’anya tupu a tọọ ntọala ụwa.+ 25  Nna m Onye ezi omume, n’eziokwu, ụwa amatabeghị gị.+ Ma ama m gị,+ ndị a amarakwala na ọ bụ gị zitere m. 26  Emeela m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya,+ ka ha wee hụ ndị ọzọ n’anya otú ị hụrụ m n’anya, ka mụ na ha wee dị n’otu.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “anụ ahụ́.”
Ma ọ bụ “ha ga na-amụta banyere gị.” Okwu Grik a sụgharịrị “ga na-amụta” gosiri na ọ bụ ihe a ga-emere na-aga.
Ma ọ bụ “na-erubekwa isi n’okwu gị.”
Ma ọ bụ “dị n’otu.”
Ma ọ bụ “dị n’otu.”
Ma ọ bụ “mee ka ha dị iche; mee ka ha dị nsọ.”