Gaa n'Isiokwu

È Kere Ya Eke?

Ahụ́ Mmadụ

Otú Ahụ́ Mmadụ Si Ala Ọnyá

Olee otú ndị ọkachamara ga-esi rụpụta plastik ndị ga na-anyachi onwe ha ma ha kụpuo otú ahụ ahụ́ mmadụ si ala ọnyá?

Anụ Ndị Bi n’Elu Ala

Aji Dị Anụ Sea Otter n’Ahụ́

Ụfọdụ anụmanụ bi ná mmiri na-enwekarị abụba dị n’okpuru akpụkpọ ahụ́ ha na-eme ka ahụ́ ha na-ekpere ọkụ. Ma otu anụmanụ aha ya bụ sea otter nwere ihe ọzọ na-enyere ya aka ime ka ahụ́ ya na-ekpere ọkụ.

Uru Afụ Ọnụ Nwamba Baara Ya

Gịnị mere ndị ọkà mmụta sayensị ji na-achọ ịrụ robọt ga na-arụ ọrụ ka afụ ọnụ nwamba?

Otú Nkịta Si Anụ Ísì Ihe

Olee ihe ndị sayensị chọpụtara n’otú nkịta si anụ ísì ihe mere ha ji lere ya anya mepụta ihe ndị ga-enwe ike ịna-anụ ísì ihe ka nkịta?

Ihe Ndị Bi n'Ime Mmiri

Nku Azụ̀ Weel

Otú e si rụọ nku azụ̀ a buru ezigbo ibu ga-abara gị uru ma ị mụọ gbasara ya. Chọpụta otú ọ ga-esi abara gị uru.

Otú Ahụ́ Azụ̀ Pilot Whale Si Eme Onwe Ya Ka Ọ Dị Ọcha

Olee ihe mere ụlọ ọrụ ndị nwere ụgbọ mmiri ji nwee mmasi n’otú azụ̀ a si eme onwe ya ka ọ dị ọcha?

Ụda Dọlfin Na-emepụta O Ji Na-achọta Ihe

Ndị sayensị na-agbalị imepụta ngwá ọrụ ga na-eji ụda ọ na-emepụta achọta ihe, na-amatakwa ihe ndị dị gburugburu ya, ka azụ̀ dọlfin.

Ihe Eju Mmiri A Na-akpọ Barnacle Ji Arapara n’Ihe

Ndị sayensị kwuru na o nweghị ihe e mepụtarala e ji anyagide ihe a ga-eji tụnyere nke na-esi n’eju mmiri a na-akpọ barnacle apụta. Ma olee otú o si arapara n’ihe dị mmiri mmiri?

Eriri Ndị Na-esi n’Ahụ́ Akịrịkọ Apụta

Akịrịkọ na-eji eriri ndị na-esi ya n’ahụ́ apụta anyapagide onwe ya n’ihe. Ịmata otú eriri ahụ si anyapagide n’ihe ga-enyere ndị mmadụ aka ịmata otú a ga-esi nyapagide ihe n’ụlọ, ma ọ bụ rụpụta ihe e ji anyapagide akwara n’ọkpụkpụ.

Mkpokoro Eju Mmiri na Ihe Ndị Ọzọ Yiri Eju Bi ná Mmiri

Otú mkpokoro eju ndị a dị na-enye aka egbochi ahụ́ ha nke ọma ka ihe ọ bụla ghara imetụta ihe dị n’ime ya.

Aka Octopus Dị Ịtụnanya

Ndị njinia lekwasịrị anya n’aka octopus meputa aka rọbot na-arụ ọrụ ndị dị ịtụnanya.

Nnụnụ

Ábụ́bà Nnụnụ Na-anaghị Aṅacha Aṅacha

Olee otú ụcha ábụ́bà nnụnụ na-anaghị aṅacha aṅacha si mee ka a na-atụ anya imepụta ágbá na ákwà ndị na-agaghị aṅacha aṅacha?

Nku Ikwiikwii

Otú dị ịtụnanya e si kee nku ikwiikwii ga-enye aka mee ka a rụpụta ihe ndị dị ka fan na-eji okpomọkụ si n’ikuku emepụta ọkụ eletrik ndị na-adịghị emecha ụzụ.

Otú Ọbọgwụ Mmiri Si Efe

Chọpụta otú nnụnụ a si efete aka n’efeghị nku ya efe.

Anụ Ndị Na-arị arị na Anụ Ndị Bi Ma ná Mmiri Ma n’Ala

Ngwere Ahụ́ Ogwu Ogwu nke Ahụ́ Ya Na-amị Mmiri

Gịnị na-eme ka ngwere a nwee ike isi n’akpụkpọ ahụ́ ya mịrị mmiri, ya agagide ruo n’ọnụ ya?

Ọdụ Ngwere

Gịnị na-enyere ngwere aka ịwụtu n’enweghị ihe ga-eme ya?

Ọnụ Agụ Iyi

Agụ iyi na-atado ihe karịa ọdụm na agụ. Ihe metụ ya n’ọnụ, ọ na-ama karịa otú mkpịsị aka anyị si eme ka anyị mara ma ihe metụ ya. Gịnị kpatara ya?

Ahụ́ Agwọ

Gịnị mere ahụ́ agwọ ji esi ike ka o nwee ike iji ya arị elu osisi bụ ogwu ogwu, jirikwa ya gwuo ọnụ n’ala?

Mbàrá Na-elo Àkwá Ya

Gịnị mere otu onye kweere n’ozizi evolushọn ji sị na e nweghị otú ihe niile na-eme n’ahụ́ mbàrá ga-esi nọkata jiri nwayọọ nwayọọ malite?

Ụmụ Ahụhụ

Otú Aṅụ A Na-akpọ Bumblebee Si Efe Ka Ikuku Ghara Ibufu Ya​—È Kere Ya Eke?

Olee otú obere aṅụ a si eme nke ọma karịadị ndị bụ́ aka ochie n’ịnya ụgbọelu?

Otú Aṅụ Si Efedata

Gịnị mere o ji dị mma ilere anya na otú aṅụ si efedata rụọ robọt ndị ga na-efegharị n’enweghị nsogbu ọ bụla?

Olee Otú Ụmụ Ahụhụ Si Achara Ibe Ha n’Ụzọ?

Ụmụ ahụhụ anaghị ekwe ka ụzọ ha kpọchie. Olee otú ha si eme ya?

Olu Ndanda

Olee ihe na-enyere ndanda a aka ibu ihe na-anyị ezigbo arọ karịa ya?

Otú Ahụhụ A Na-akpọ Carpenter Ant Si Eme Ka Mpi Ya Dị Ọcha

Ọ dị obere ahụhụ a mkpa ịna-edebe onwe ya ọcha ka ihe ghara ime ya. Olee otú o si eme ihe a dị mkpa?

Ihe Nwa Ahụhụ A Na-akpọ Silver Ant Na-eji Egbochi Okpomọkụ

Nwa ahụhụ a so n’ihe ndị e kere eke kacha anagide okpomọkụ. Olee ihe na-enyere ya aka ịnagide oké okpomọkụ?

Igurube nke Nwere Oge Ha Ji Apụta

O nwere igurube otú ndụ ha si aga dị́ ịtụnanya. Ha pụta, ha na-adị ndụ naanị izu ole na ole. Ha nwụọ, ụmụ ha apụta ma o ruo afọ 13 ma ọ bụ afọ 17.

Otú Igurube Si Amata Na Ihe Nọ Ya Nso

Gịnị mere na igurube anaghị akụ ibe ha ma ha gawa n’ìgwè?

Otú Ụkpara Si Anụ Ihe

N’agbanyeghị na ntị ụkpara pere mpe, ọ na-anụ ihe ka mmadụ. Olee uru otú ụkpara si anụ ihe ga-abara ndị ọkachamara?

Otú Urukurubụba A Na-akpọ Cabbage White Si Edowe Nku Ya Ka V Ma Ọ Nyawa Anwụ

Olee ihe pụrụ iche ndị njinia chọpụtara gbasara urukurubụba a na-akpọ cabbage white nyeere ha aka imepụta ihe ndị na-esi n’anyanwụ enweta ikike eletrik ndị ka mma?

Azụ Ébé A Na-akpọ Diabolical ironclad​—È kere ya eke?

Gịnị mere ihe ọ bụla anaghị eme ụdị ébé a ma e nwee ihe mere ya?

Otú Ijiji A Na-akpọ Fruit Fly Si Efe Ngwa Ngwa

Ijiji a na-enwe ike ịtụgharị ngwa ngwa ma ọ na-efe, otú ahụ ụgbọelu e ji alụ agha si atụgharị. Ma, ọ na-eji ihe na-erughị otu tịnkọm atụgharị.

Ududo

Ọnyà Ududo

Ọnyà ududo nwere ebe na-esi ike na ebe na-anaghị esi ike. Gụọ banyere ya.

Ihe Ọkụkụ

Ihe Mere Mkpụrụ Osisi Pollia Berry Ji Acha Anụnụ Anụnụ

Ihe mere mkpụrụ osisi a ji na-acha anụnụ anụnụ esighị n’ime ya, ma, anụnụ anụnụ nke ya pụrụ iche. Gịnịzi mere o ji maa mma dị egwu otú ahụ?