Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È KERE YA EKE?

Otú Ọbọgwụ Mmiri Si Efe

Otú Ọbọgwụ Mmiri Si Efe

E NWERE ụfọdụ nnụnụ ndị na-efemi n’ígwé. Ha na-anọ ebe ahụ gbasaa nku ha n’efeghị ya efe. Ọbọgwụ mmiri so na nnụnụ ndị na-efemi n’ígwé. Nku ya abụọ na-akarị mita atọ ma ya gbasaa ha. Nnụnụ a na-erukwa kilogram asatọ na ọkara n’arọ. Ọ na-eme ya femie n’ígwé ya agbasaa nku ya abụọ, na-agazi. Ọ na-eferu ebe dị ezigbo anya n’efeghị nku ya efe. Ihe mere o ji efe otú ahụ bụ otú ahụ́ ya dị na otú o si eme nku ya ma o femie n’elu.

Ihe ị ga-echebara echiche: Ọ bụrụ na nnụnụ a anọrọ n’ígwé, o nwere ụdị akwara dị ya n’ahụ́ nke na-eme ka nku ya ghara ịna-efe efe ma ọ gbasaa ha. Ihe ọzọ mere o ji anọte aka n’elu bụ na ọ na-ama ebe ikuku si n’oké osimiri chere ihu, yanwa echeekwa ihu ebe ahụ, ya eburu ya na-aga.

Ya buru ya na-aga, ya ana-erugharị ka ikuku ahụ ghara ibufu ya ebufu. Otú ahụ ikuku si na-ebu ya na-eme ka ọ ghara ịna-efe nku ya efe. Ọ dịbeghị anya ndị ọkachamara chọpụtara ihe na-enyere nnụnụ a aka ife otú a. Ha ji kọmputa chọpụta na ọ na-adịrị nnụnụ a mfe isoro ikuku na-aga ma o femie n’ígwé. Ihe ọzọ ha chọpụtara bụ na ọ chọọ ifedata, ọ na-agbanye azụ n’ebe ikuku ahụ na-aga. Ha kwukwara na otú a o si efe mgbe niile anaghị ara ya ahụ́. Ikuku nnụnụ a na-eso aga na-eme ka o fee ọtụtụ awa n’efeghị nku ya efe.

Ihe a ndị ọkachamara chọpụtara nwere ike inyere ndị na-arụ ụgbọelu aka ịrụ ụgbọelu ndị nke na-agaghị na-eri mmanụ ma ọ bụkwanụ ndị nke na-enweghị injin.

Gịnị ka i chere? Otú a ọbọgwụ mmiri si eme ya femie n’ígwé, ya agbasaa nku ya na-aga n’efeghị ha efe ọ̀ nọkatara dịrị, ka è kere ya eke?