Gaa n'Isiokwu

Heather Broccard-Bell/iStock via Getty Images

È KERE YA EKE?

Azụ Ébé A Na-akpọ Diabolical ironclad

Azụ Ébé A Na-akpọ Diabolical ironclad

 Ọ bụ na Kọntinent Nọt Amerịka ka a na-ahụ ébé a na-akpọ Diabolical ironclad. Ndị na-eme nchọpụta kwuru na e nweghị ihe ga-eme ébé a ma e bukwasị ya ibu ji okpukpu puku iri atọ na puku itoolu (39,000) ka ya arọ, e nweghịkwa ihe ga-eme ya ma ụgbọala rịa ya elu. Gịnị mere na e nweghị ihe na-eme ébé a ma ụdị ihe ndị ahụ mee ya?

 Ebe elu azụ ya na ebe afọ ya jikọrọ ibe ha n’akụkụ dị iche iche. Ebe ụfọdụ ha jikọrọ ọnụ na-esi ike, na-eme ka ihe ọ bụla ghara ime ihe ndị dị mkpa n’ime ahụ́ ya ma e nwee ihe merenụ. Ebe ọzọ ha jikọrọ esichaghị ike, nke mere na ébé nwere ike imerụ ahụ́ n’ebe ụfọdụ ma ihe mee ya. Ebe nke atọ ha jikọtara na-eme ka azụ ébé nwee ike ịna-emegharị emegharị. Otú ebe nke atọ a si emegharị emegharị na-eme ka ébé nwee ike ịfanye onwe ya n’oghere ndị dị n’azụ osisi ma ọ bụ n’obere oghere ndị dị na nkume.

 Ihe ọzọ bụ na e nwere ihe dị n’etiti azụ ya. Ihe a nwegasịrị ihe yiri ezé, yiekwa zip. Ọrụ ya bụ ime ka ibu ọ bụla ébé a bu ghara ịnyịgide ya otu ebe, kama ọ na-eme ka akụkụ ndị ọzọ nye aka buru ya. Ihe ndị ahụ yiri ezé nwere abụba nyakọtara ha ọnụ a na-akpọ protin. Ọ bụrụ na ébé eburu ibu, protin ndị ahụ na-agbawatụ obere ka ihe ndị ahụ yiri ezé nyakọtara ọnụ nwee ike ịdị otú ha ga-eburu ibu ahụ na-anyakapụghị n’ibe ha, e mechaakwa protin ndị ahụ gbawara agbawa eruchie.

Ihe ndị ahụ yiri ezé ndị dị n’azụ ébé na-arapara n’ibe ha otú ahụ ezé ndị dị na zip si arapara n’ibe ha

Akụ́ ndị na-acha uhie uhie na-egosi ebe elu azụ ébé na ebe afọ ya jikọrọ ọnụ. Akụ́ na-acha ntụ ntụ na-egosi ihe nwegasịrị ezé ma yie zip dị n’etiti azụ ébé

 Ndị na-eme nchọpụta na-ekwu na ndị na-arụpụta ihe nwere ike ilere azụ ébé rụọ ihe ndị ga-abụ ọkaibe n’ibu ibu, ihe ndị dị ka ụgbọala, àkwà mmiri na ụlọ.

 Gịnị ka i chere? Azụ ébé a na-akpọ diabolical ironclad ọ̀ nọkatara dịrị ka è kere ya eke?