Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È KERE YA EKE?

Ihe Nwa Ahụhụ A Na-akpọ Silver Ant Na-eji Egbochi Okpomọkụ

Ihe Nwa Ahụhụ A Na-akpọ Silver Ant Na-eji Egbochi Okpomọkụ

OTU nwa ahụhụ a na-akpọ Silver Ant so n’ihe ndị e kere eke kacha anagide okpomọkụ. Nwa ahụhụ a bi n’Ọzara Sahara. Oké anwụ chawa, ụmụ anụ ndị na-eri nwa ahụhụ a na-aga chọwa ebe ha ga-ezere anwụ. Nwa ahụhụ a na-ejizi ohere ahụ pụta gbagharịa ngwa ngwa buru ihe ndị ọ ga-eri. Ọ na-eburu ụmụ ahụhụ ndị ọzọ anwụ chagburu.

[50] μm

Ihe Ị Ga-echebara Echiche: Ajị kpuchiri azụ nwa ahụhụ a niile. Mana, okpuru ya na-akwọ mụrụmụrụ. Ajị ndị a (1, 2) mere ka ahụ́ ya na-egbuke egbuke ka ọla ọcha. Ọ bụrụ na e gbubie ajị ndị a, ha na-eghe oghe n’ime ha, nweekwa akụkụ atọ (3). Akụkụ abụọ ndị nke chere ihu n’elu adịghị mụrụmụrụ. Mana akụkụ ya nke chere ihu n’ala dị mụrụmụrụ. Otú a ajị ndị a dị nwere uru abụọ ọ na-abara nwa ahụhụ a. Nke mbụ bụ na ọ na-enyere ya aka igbochi okpomọkụ anwụ. Nke abụọ abụrụ na ọ na-enyere ya aka iwepụ okpomọkụ dị ya n’ahụ́. Ma, okpuru nwa ahụhụ ahụ, ebe ahụ ajị na-adịghị, na-enyere ya aka igbochi okpomọkụ si n’ala ịbanye ya n’ahụ́. *

[10] μm

Ajị ndị ahụ kpuchiri azụ nwa ahụhụ a na-enyere ya aka ka ahụ́ ya ghara ikpere ọkụ karịa 53.6°C. N’ihi na ọ karịa otú ahụ, o nwere ike ịnwụ. Ndị Sayensị chọrọ ilere anya ná nwa ahụhụ a rụọ ihe ndị e nwere ike iji kpuchie ihe, ya enyere ihe ahụ aka ịjụ oyi n’onwe ya.

Gịnị Ka I Chere? Otú a ajị dị n’ahụ́ nwa ahụhụ a si eme ka okpomọkụ ghara igbu ya ọ̀ nọkatara dịrị ka è nwere onye kere ya otú ahụ?

^ para. 4 Ihe ndị ọzọ na-enyere nwa ahụhụ a aka bụ protin ụfọdụ dị ya n’ahụ́. Protin ndị a anaghị agbaze ngwa ngwa ma anwụ chasie ha ike. Ụkwụ ogologo nwa ahụhụ a nwere na-ebuli ya elu ka ọ ghara ịkpụ afọ n’ala na-ekpo ọkụ, na-enyekwara ya aka ịgbasi ọsọ ike. Nwa ahụhụ a na-enwekwa ike ịmata ụzọ. Nke a na-eme ka o nwee ike ịmata ụzọ kacha mkpụmkpụ ọ ga-esi agbaba n’ọnụ ya.