Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È KERE YA EKE?

Eriri Ndị Na-esi n’Ahụ́ Akịrịkọ Apụta

Eriri Ndị Na-esi n’Ahụ́ Akịrịkọ Apụta

OTÚ ahụ ejula barnacles si anyapagide onwe ya n’ihe, ka akịrịkọ sikwa anyapagide onwe ya na nkume, osisi, ma ọ bụ n’ahụ́ ụgbọ mmiri. Ejula Barnacle na-eji ahụ́ ya anyagide n’ihe. Ma, akịrịkọ na-eji eriri ndị na-esi ya n’ahụ́ apụta anyapagide n’ihe. Ọ bụ eziokwu na otú ahụ o si eji eriri ndị ahụ anyapagide n’ihe na-eme ka o nwee ohere ịkpa afọ ya na imegharị ahụ́, ma ọ na-adị ka hà ga-adọbi ma ọ bụrụ na ebili mmiri ebugharịa ha. Olee otú eriri ndị a si eme ka akịrịkọ nyagipade n’ihe, mmiri aghara ibufu ya?

Ihe Ị Ga-echebara Echiche: Eriri ndị ahụ na-esi ike n’otu isi ya, ma isi ya nke ọzọ anaghị esi ike, kama ọ na-adọ adọ. Ndị na-eme nchọpụta kwuru na otú ahụ eriri ndị ahụ dị mere ka o na-esi ezigbo ike ma ghara ịna-adọbi adọbi. N’ihi ya, o nwere ike ịnyapagide n’ihe ihe ọ masịrị mmiri bugharịa ya.

Otu ọkà mmụta aha bụ Guy Genin sịrị na ihe a a chọpụtara gbasara eriri ndị a dị ịtụnanya. Ọ sịrị: “Ihe kacha dị́ ịtụnanya n’ihe gbasara eriri ndị a bụ otú ha si sie ike n’otu isi ya ma ghara isi ike n’isi ya nke ọzọ.” Ndị sayensi chọrọ ilere anya n’eriri ndị ahụ rụọ ihe ndị e nwere ike iji nyapagide ihe n’ụlọ, n’ụgbọ na-agba n’okpuru mmiri, ihe a ga-eji nyapagide akwara n’ọkpụkpụ, nakwa ihe ndị e ji adụchi onyá. J. Herbert Waite bụ́ prọfesọ na Mahadum Kalịfọnịa dị́ na Santa Babara, n’Amerịka, sịrị: “Ụwa anyị a nwere ọtụtụ ihe dị ịtụnanya anyị nwere ike isi na ha mụta ihe ma a bịa n’ihe gbasara ịnyapagide ihe n’ihe.”

Gịnị ka i chere? Eriri ndị ahụ siri ezigbo ike na-apụta akịrịkọ n’ahụ́, hà nọkatara dịrị ka è kere ha eke?