Gaa n'Isiokwu

È KERE YA EKE?

Otú Nkịta Si Anụ Ísì Ihe

Otú Nkịta Si Anụ Ísì Ihe

 Ndị na-eme nchọpụta kwuru na nkịta na-eji imi ha amata ihe ụfọdụ gbasara nkịta ndị ọzọ. Dị ka afọ ndụ ha, otú obi dị ha nakwa ma hà bụ oké ma ọ bụ nne. E nwedịrị ike ịzụ nkịta ịna-achọpụta ebe bọmbụ ma ọ bụ ọgwụ ike dị. Ndị mmadụ na-ejikarị anya ha achọpụta ihe ndị na-eme gburugburu ha, ma nkịta na-eji imi ha. E nwere ike ikwu na ha na-eji imi ha ahụ ụzọ.

 Ihe ị ga-echebara echiche: Otú nkịta si anụ ísì karịrị nke mmadụ okpukpu okpukpu. Otu ụlọ ọrụ dị n’Amerịka kwuru na nkịta nwere ike ịchọpụta na e tinyere ihe dị ka nnu ma ọ bụ shuga dị ezigbo obere na nnukwu mmiri. Dị ka ihe atụ, e tinye shuga na ngaji e ji e nye nwatakịrị mmiri, kee ya ụzọ anọ ma wụnye otu ụzọ n’ebe a na-egwu mmiri, nkịta ga-achọpụta na shuga dị ná mmiri ahụ.

 Gịnị mere otú nkịta si anụ ísì ji kara nke mmadụ mma?

  •   Imi nkịta na-adị mmiri mmiri, nke a na-eme ka o nwee ike ịna-anụ ísì ụmụ irighiri ihe.

  •   E nwere oghere abụọ dị n’imi nkịta. Otu bụ maka iku ume, nke ọzọ abụrụ maka ịnụ ísì. Nkịta maa ihe imi, ikuku na-abanye n’akụkụ imi ya nwere ihe ndị na-eme ka ọ na-anụ ísì.

  •   Ebe nkịta ji anụ ísì n’imi ya karịrị nke mmadụ

  •   Ihe ndị yiri akwara dị n’imi nkịta o ji anụ ísì ji okpukpu iri ise karịa nke mmadụ.

 Ihe ndị a niile na-enyere nkịta aka ịchọpụta ihe dị iche iche dị n’otu ísì ọ nụrụ. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịnụ ísì ofe, ma ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na nkịta nụ ya, o nwere ike ịmata ihe niile e ji sie ofe ahụ.

 Ndị na-eme nchọpụta n’otu ụlọ ọrụ na-eme nchọpụta gbasara ọrịa kansa kwuru na imi nkịta na ụbụrụ ya na-arụkọ ọrụ ọnụ. Nke a mere ka ha bụrụ “otu n’ime ihe kacha mma e nwere n’ụwa e ji anụ ísì ihe.” N’ihi ya, ndị sayensị na-emepụta ngwá ọrụ elektrọnik ga na-anụ ísì ha ga-eji na-achọpụta bọmbụ, ahịa iwu, nakwa ọrịa, dị ka kansa.

 Gịnị ka i chere? Otú nkịta si anụ ísì ihe, ọ̀ nọkatara dịrị? Ka è kere ya eke?