Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È KERE YA EKE?

Otú Ahụ́ Mmadụ Si Ala Ọnyá

Otú Ahụ́ Mmadụ Si Ala Ọnyá

OTÚ ahụ́ mmadụ si eme ka ọnyá laa  bụ otu n’ime ihe na-eme ka anyị nọrọ ndụ. Ahụ́ anyị na-amalite iruchi ozugbo anyị merụrụ ahụ́.

Ihe Ị Ga-echebara Echiche: E nwere ihe ndị dị n’ahụ́ anyị na-enyere ya aka ịla ọnyá. Ka anyị tụlee otú ha si arụ ọrụ:

  • Mmadụ merụọ ahụ́, ụfọdụ ihe ndị dị n’ọbara na-enyere anụ ahụ́ dị n’akụkụ ọnyá ahụ aka ka ọ kwụsị ịgba ọbara.

  • Ebe onye ahụ merụrụ ahụ́ na-abịazi zaa aza, si otú ahụ gbochie nje ịbanye n’ọnyá ahụ, wepụkwa nje ndị nke nọ na ya.

  • N’ime ụbọchị ole na ole, anụ ahụ́ ọhụrụ na-eji nwayọọ nwayọọ na-eruchi ọnyá ahụ.

  • N’ikpeazụ, ọnyá ahụ na-akpọ, àpà ya afọdụzie.

Ndị ọkachamara na-agba mbọ ka ha lere anya n’otú a ahụ́ mmadụ si eruchi ọnyá rụpụta plastik ndị ga na-anyachi onwe ha ma ha gbawaa. Ha ga-arụnye plastik nke ọ bụla ihe abụọ a gbanyere ihe dị mmiri mmiri. Ọ bụrụ na ihe akụpuo plastik ahụ, ihe ndị ahụ a gbanyere ihe dị mmiri mmiri ga-agbapụta ihe ahụ dị na ha. Ha metụ ibe ha, ha akpụkọọ ma nyachizie ahụ́ plastik ahụ. Otu ọkachamara kwuru na ha na-agbalị ka ha rụpụta plastik ndị nwere ike ịnyachi onwe ha otú ahụ ahụ́ mmadụ si eme ka ọnyá laa.

Gịnị ka i chere? Otú a ahụ́ mmadụ si ala ọnyá ọ̀ nọkatara dịrị ka è nwere onye kere ya otú ahụ?