Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È KERE YA EKE?

Ọnụ Agụ Iyi

Ọnụ Agụ Iyi

Á BỊA n’ụmụ anụmanụ ndị dị n’ụwa taa, ọ bụ agụ iyi kacha eji ọnụ akpa ike. Dị ka ihe atụ, otú agụ iyi ndị dị n’ebe na-adịghị anya n’Ọstrelia si atado ihe karịrị otú ọdụm ma ọ bụ agụ si atado ihe. N’agbanyeghị ụdị ike agụ iyi ji ọnụ ya akpa, obere ihe metụ ya n’ọnụ, ọ na-ama ozugbo. Ọ kadị otú mkpịsị aka si enyere mmadụ aka ịma na ihe metụrụ ya. Ajụjụ bụzi, olee otú nke a ga-esi ekwe omume ebe ọ bụ na ọnụ agụ iyi siri ezigbo ike?

E nwere ọtụtụ irighiri akwara ndị dị́ n’ọnụ ya. Otu ọkachamara aha ya bụ Duncan Leitch kwuru na akwara ndị ahụ si n’isi ya. Otú ha dị na-eme ka a ghara inwe ihe ọ bụla ga-eme akwara ndị ahụ dị́ n’ọnụ ya. Ọ na-emekwa ka agụ iyi nwee ike ịma mgbe ihe metụrụ ya n’ọnụ, ya sọkwa ihe ahụ ya pee ezigbo mpe. Otú akwara ndị a si arụ ọrụ na-enyere agụ iyi aka ịmata ma ihe metụrụ ya n’ọnụ ọ̀ bụ ihe ọ ga-eri eri ka ọ̀ bụ ihe ọ na-agaghị eri. Ọ bụkwa ya mere agụ iyi nwere ike iji kpụrụ nwa ya n’ọnụ ma ọ gaghị eri ya. Otú ọnụ agụ iyi si arụ ọrụ dị egwu.

Gịnị ka i chere? Otú a ọnụ agụ iyi si arụ ọrụ ọ̀ nọkatara dịrị ka è nwere onye kere ya otú ahụ?