Ozi Ọma Jọn Dere 14:1-31

  • Ọ bụ naanị na Jizọs ka e si agakwuru Nna ya (1-14)

    • “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ” (6)

  • Jizọs kwere nkwa izite mmụọ nsọ (15-31)

    • “Nna m ka m ukwuu” (28)

14  “Obi alọla unu mmiri.+ Nweenụ okwukwe na Chineke,+ nweekwanụ okwukwe na m.  N’ụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. Ma ọ́ bụghị ya, m gaara agwa unu n’ihi na m na-aga ịkwadebere unu ebe.+  Ọ bụrụkwa na mụ agaa kwadebere unu ebe, m ga-abịa ọzọ, m ga-anabatakwa unu n’ebe m nọ, ka unu wee nọrọ n’ebe m nọ.+  Unu ma ụzọ ebe m na-aga.”  Tọmọs+ sịrị ya: “Onyenwe anyị, anyị amaghị ebe ị na-aga. Olee otú anyị ga-esi mara ụzọ ya?”  Jizọs sịrị ya: “Ọ bụ m bụ ụzọ+ na eziokwu+ na ndụ.+ E nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụrụ na o sighị na m.+  A sị na unu ma m, unu gaara amakwa Nna m. Si ugbu a gawa, unu amarala ya, unu ahụkwala ya.”+  Filip wee sị ya: “Onyenwe anyị, gosi anyị Nna ahụ, ọ ga-ezuru anyị.”  Jizọs sịrị ya: “Filip, ọ̀ bụ na ị mabeghị m n’agbanyeghị na mụ na unu anọọla ogologo oge otú a? Onye ọ bụla hụrụ m ahụla Nna m.+ Gịnị mere i ji asị, ‘Gosi anyị Nna ahụ’? 10  Ọ̀ bụ na i kweghị na mụ na Nna m dị n’otu nakwa na Nna m na mụnwa dị n’otu?+ Ihe ndị m na-agwa unu abụghị uche m,+ kama Nna m nke mụ na ya dị n’otu si n’aka m na-arụ ọrụ ya. 11  Kwerenụ ihe m na-ekwu mgbe m sịrị na mụ na Nna m dị n’otu nakwa na Nna m na mụnwa dị n’otu. Ma ọ bụrụ na unu ekweghị ihe m na-ekwu, jirinụ maka ọrụ ndị m na-arụ kwere.+ 12  N’eziokwu, ana m asị unu na onye ọ bụla nwere okwukwe na m, ọ ga-arụ ọrụ m na-arụ. Ọ ga-arụkwa ọrụ karịrị ọrụ ndị a+ n’ihi na m na-alakwuru Nna m.+ 13  Ihe ọ bụla unu rịọkwara n’aha m, m ga-eme ya, ka e wee si n’aka Ọkpara ahụ nye Nna m otuto.+ 14  Ọ bụrụ na unu arịọ ihe ọ bụla n’aha m, m ga-eme ya. 15  “Ọ bụrụ na unu hụrụ m n’anya, unu ga na-eme ihe m nyere n’iwu.+ 16  M ga-arịọkwa Nna m, ọ ga-enye unu ihe inyeaka* ọzọ ka ọ dịnyere unu ruo mgbe ebighị ebi,+ 17  ya bụ, mmụọ nke eziokwu,+ nke ụwa na-enweghị ike inweta n’ihi na ụwa anaghị ahụ ya, ọ maghịkwa ya.+ Unu ma ya n’ihi na ọ dị n’ime unu, ọ na-adịgidekwa n’ime unu. 18  Agaghị m ahapụ unu ka unu nọrọ ka ndị mmadụ nwụnahụrụ.* M ga-abịakwute unu.+ 19  N’oge na-adịghị anya, ụwa agaghị ahụ m ọzọ, ma unu ga-ahụ m.+ Ebe ọ bụ na m dị ndụ, unu ga-adịkwa ndụ. 20  N’ụbọchị ahụ, unu ga-ama na mụ na Nna m dị n’otu, unu na m adịrị n’otu, mụ na unu adịrịkwa n’otu.+ 21  Onye ọ bụla nabatara ihe m nyere n’iwu ma na-eme ha bụ onye hụrụ m n’anya. Onye ọ bụla hụrụ m n’anya, Nna m ga-ahụ ya n’anya. M ga-ahụkwa onye ahụ n’anya ma gosi ya onwe m nke ọma.” 22  Judas+ (ọ bụghị Judas Iskarịọt) wee sị ya: “Onyenwe anyị, gịnị mere i ji chọọ igosi anyị onwe gị nke ọma kama igosi ya ụwa?” 23  Jizọs zara ya, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ m n’anya, ọ ga na-eme ihe m kwuru,+ Nna m ga-ahụkwa ya n’anya, anyị ga-abịakwute ya, anyị na ya ebiri.+ 24  Onye ọ bụla na-ahụghị m n’anya anaghị eme ihe m kwuru. Okwu unu na-anụ abụghị nke m, kama ọ bụ nke Nna m, onye zitere m.+ 25  “Agwala m unu ihe ndị a mgbe mụ na unu ka nọ. 26  Ma ihe inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, nke Nna m ga-ezite n’aha m, ga-akụziri unu ihe niile ma chetara unu ihe niile m gwara unu.+ 27  M na-ahapụrụ unu udo. M na-enye unu udo m.+ Anaghị m enye ya unu otú ụwa si enye ya. Obi alọla unu mmiri, unu atụkwala egwu. 28  Unu nụrụ na m sịrị unu, ‘M na-ala, m ga-alọghachikwutekwa unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m n’anya, unu ga-aṅụrị ọṅụ na m na-alakwuru Nna m n’ihi na Nna m ka m ukwuu.+ 29  Agwala m ya unu ugbu a tupu ya emee, ka unu wee kwere ma o mee.+ 30  Mụ na unu agakwaghị ekwu ọtụtụ okwu n’ihi na onye na-achị ụwa+ na-abịa. O nweghịkwa ike n’ebe m nọ.+ 31  Ma, ka ụwa wee mara na m hụrụ Nna m n’anya, m na-eme ihe niile otú Nna m nyere m iwu ka m mee.+ Bilienụ, ka anyị pụọ n’ebe a.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ihe nkasi obi.”
Ma ọ bụ “ka ụmụ na-enweghị nne na nna.”